Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 10/15 p. 5-7
  • Masada—Ọ̀ Bụ Ihe Na-egosi na Mesaịa Abịawo?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Masada—Ọ̀ Bụ Ihe Na-egosi na Mesaịa Abịawo?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọbịbịa nke Mesaịa
  • Echiche Ndị Juu Banyere Ọchịchị Ndị Jentaịl
  • Ndị Mesaịa Ụgha
  • Nnọpụiche nke Ndị Kraịst bụ ndị Judia
  • Masada—N’ihi Gịnị Ka O ji Mee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • “Anyị Ahụwo Mezaịa Ahụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Anyị Ahụwo Mesaịa Anyị”!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Olee Ihe Mere Ha Ji Jụ Mesaya Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 10/15 p. 5-7

Masada​—Ọ̀ Bụ Ihe Na-egosi na Mesaịa Abịawo?

ỊWỤFU ọbara n’aha okpukpe abụwo ihe otiti na-abịa mgbe mgbe n’akụkọ ihe mere eme. Nke a agụpụghịkwa Masada, n’ihi na ndị na-echebe ya kwesiri ike n’okpukpe. Ọ bụrụ na i jee ileta ebe ndị ahụ e gwuru ala na Masada, ị pụrụ ịhụ mkpọmkpọ ebe nke otu ụlọ nzukọ ebe ndị ogbu mmadụ ahụ na-ezukọta maka ife ofufe na ihe omume ịsa ahụ nke ha na-eji edo onwe ha ọcha n’ụzọ okpukpe.

A chọtawokwa iberibe ụfọdụ nke akwụkwọ Bible na Masada. Ị pụrụ ịjụ, sị, Olee otú ozi Bible nke ndị ogbu mmadụ ahụ dị ma e jiri ya tụnyere ihe anyị na-agụta na Bible taa? Dr. Yi-gael Yadin, n’akwụkwọ ya bụ Masada, dere banyere nchọpụta mbụ dị otú ahụ e mere, sị:

“Nnyocha e mere ngwa ngwa gosiri anyị n’atụfughị oge ọ bụla na ihe anyị ji bụ ibe akwụkwọ sitere n’akwụkwọ Book of Psalms, anyị pụrụ ọbụna ịmata ebe isi akwụkwọ ya dị iche iche dị: Akụkụ ahụ bụ site n’Abụ Ọma 81 ruo Abụ Ọma 85. . . . O kwere omume ịmata oge e dere ya n’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla ma ọlị. A pụghị ideworị ya mgbe afọ 73 AD gasịrị, bụ́ afọ ahụ Masada dara. . . . Akụkụ nke a sitere n’akwụkwọ Book of Psalms, dịkwa ka akwụkwọ mpịakọta Bible ndị ọzọ anyị mesịrị chọta fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na e nweghị ọdịiche ọ bụla dị . . . n’etiti ya na ihe odide akwụkwọ Bible ndị anyị na-eji eme ihe taa.”

Ihe àmà gosiri na ndị ogbu mmadụ ahụ kwe-ere na Chineke nke bụ Onye Akwụkwọ Nsọ Hibru sitere n’obi ya ga-agọzi mbilite ha bilitere megide Rom; Dị ka akwụkwọ The Universal Jewish Encyclopedia na-akọwa: “Oké ịnụ ọkụ n’obi ndị Juu n’Oké Agha ahụ ha lụsoro Rom (66-73 O.A.) bụ nke e wusiri ike site ná nkwere ha kweere na ọgbọ Mesaịa ahụ dị nnọọ nso. Mfunarị Ụlọ Nsọ ahụ funarịrị ha mere ihe nanị ịmụba olileanya ha n’ihe banyere ọbịbịa nke Mesaịa ahụ.”

Ọbịbịa nke Mesaịa

Akwụkwọ The Encyclopedia of Religion kwuru, sị, “Ndị Juu nwere ịnụ ọkụ n’obi banyere Mesaịa ahụ na-adaberekarị ngụkọ oge ha n’akwụkwọ Book of Daniel.” N’eziokwu, onye amụma Hibru ahụ bụ Daniel buru amụma ba-nyere ọbịbịa nke “onye e tere mmanụ, bụ́ onyendú.” (Daniel 9:25) N’ihe ndekọ abụọ ọzọ, Daniel kwuru na Mesaịa ahụ ga-aghọ Onye Ọchịchị nke ụwa, na Alaeze Ya ga-ebibikwa ọchịchị ụmụ mmadụ nile ndị na-emegide ya.—Daniel 2:44; 7:13, 14.

Ndị Juu ahụ na-achọ mgbanwe ọchịchị n’ime narị afọ mbụ chere na oge eruwo maka mmezu nke ọhụụ amụma ndị ahụ. Josephus sịrị, “Ihe kpaliri ha karịsịa ihe ọ bụla ọzọ ije agha bụ [nkwenkwe nke bụ] na n’oge ahụ, otu onye sitere ná mba nke ha ga-aghọ onye na-achị ụwa dum.” Ma Daniel buru amụma na a ga-ebugodị ụzọ ‘bipụ’ Mesaịa Onyendú ahụ, na mgbe ọnwụ ya gasịkwara, a ga-ebibi Jerusalem na ụlọ nsọ ya site n’aka “ndị nke otu onyendú nke gaje ịbịa.”—Daniel 9:25, 26.

Echiche Ndị Juu Banyere Ọchịchị Ndị Jentaịl

E kewara Judia oge ochie gaa n’etiti mmadụ ole na ole ndị bara ọgaranya na ọtụtụ ndị ogbenye. Ụfọdụ ndị Juu bara ọgaranya, karịsịa n’etiti ndị Sadusii na ndị Farisii nwere mmasị dị ukwuu n’ike ahụ nke Rom kwere ka ha nwee n’ala ahụ, ha kpọkwara ndị nkịtị asị. Otú a, ha guzogidere echiche ọ bụla nke ịchọ ịgbanwe ọchịchị, kama nke ahụ, ha na-arụ ọrụ iji nwee mmekọrịta udo n’etiti ha na Rom.—Luk 16:14; 19:45, 46; Jọn 2:14; 7:47-49; 11:47, 48.

N’aka nke ọzọ, ndị nkịtị bụ ndị Judia tara ahụhụ n’okpuru ibu arọ nke ụtụ isi a na-akwụ ndị Rom nakwa n’okpuru ụmụ amaala ibe ha ndị na-akpagbu ha. Ha enwetaghị nkasi obi ọ bụla site n’ịbụ ndị nọ n’okpuru ihe ahụ a kpọrọ Pax Romana (Udo nke Rom) kama ha chọrọ mgbanwe. Ọdịiche nke a e nwere n’ihe na-amasị ndị mmadụ rụpụtara oké ọgba aghara nke ndị obodo. Josephus dere, sị, “Otu òtù siri ọnwụ ịnọgide n’ọchịchị, òtù nke ọzọ achọọ ịnọgide na-eme ihe ike, na-ezukwa ndị ọgaranya ohi.”

Dị ka ihe atụ, ndị ogbu mmadụ ahụ na-apụnara ndị Juu ibe ha ihe, na-egbukwa ha, na-ewerekwa omume iyi ọha egwu ndị a dị ka ntaramahụhụ dịịrị ndị Juu ndị a sị na ha na-adụnyere Rom úkwù. Otu onye rabaị nke narị afọ nke abụọ, bụ́ Johanan ben Torta, kwuru ihe nke a dị ka ihe kpatara ọdachi ahụ nke bịakwasịrị ndị Juu nke narị afọ mbụ: “Ha nwere ọchịchọ dị ukwuu inweta ego, ha kpọkwara ibe ha asị.”

Ka a sịkwa ihe mere na ndị Juu ahụ ndị na-atụ egwu Chineke n’ezie nwere ọchịchọ maka mpụta nke Mesaịa ahụ, bụ́ onye ha nwere olileanya na ọ ga-akwatu ọchịchị ndị Rom ma guzobe Alaeze Chineke nke ga-adị n’ikpe ziri ezi. Ma mmadụ ndị nwere ọchịchọ ọjọọ jiri olileanya ndị a mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.

Ndị Mesaịa Ụgha

N’ihe dị ka afọ 33 O.A., otu onyendú ndị Juu aha ya bụ Gameliel chetaara ndị ọchịchị ibe ya nke Jerusalem, sị: “Mgbe ụbọchị ndị a akaerughị . . . Judas onye Galili biliri n’ụbọchị odide aha, meekwa ka ụfọdụ n’etiti ndị Juu Soo ya n’azụ: onye ahụ lakwara n’iyi; e wee chụsaa ndị nile, ka ha hà, bụ́ ndị kwenyeere ya.”—Ọrụ 5:36, 37.

“Odide aha” nke dujere ná mbili Judas bụ nke a haziri n’afọ 6 O.A. maka nzube nke ịnakọtara Rom ụtụ isi. Josephus na-akọ na Judas kpọsara na ndị Juu “bụ ndị na-atụ ụjọ na-enweghị isi ma ọ bụrụ na ha ekwere ịkwụ ndị Rom ụtụ isi.” Aha ahụ bụ Judas sitere n’aha ahụ bụ Juda, na-atụ aro na o sitere n’agbụrụ ahụ nke e si na ya na-atụ anya Mesaịa ahụ. (Jenesis 49:10) Akwụkwọ Cyclopædia nke McClintock na Strong na-asị, “Oké ọkà ikwu okwu ya na nnabata zuru ebe nile a nabatara ozizi ya dị iche iche dọtara ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ukwuu isonyere ya, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha lere ya anya dị ka Mesaịa ahụ.”

Rịba ama na Ọrụ Ndị Ozi 5:37 kọrọ na ndị gbasoro Judas nke a esoghị ya laa n’iyi. Òtù ya, dị ka onyeọkà mmụta ndị JUU ahụ bụ Gaalya Cornfeld si kwuo, “gbanyesiri mkpọrọgwụ ike, nweekwa olileanya mesaịa ndị siri ike.” N’eziokwu, ndị ndú abụọ nke ndị ogbu mmadụ ahụ, bụ́ Menahem na Eleazar, sitere n’usoro ọmụmụ nke Judas onye Galili ahụ. Ná mmalite nke nnupụisi ndị Juu ahụ n’afọ 66 O.A., Menahem nyere ndị na-eso ụzọ ya ngwá agha ndị a kwakọbara na Masada. Mgbe ahụ, “ọ laghachiri Jerusalem dị ka onyeeze” wee “ghọọ onyendú nke òtù ahụ na-achọ mgbanwe ọchịchị.” Akwụkwọ Encyclopaedia Judaica kwukwara, sị, “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe e ji n’aka na Menahem [nwa] Juda bụ onye e lere anya dị ka Mesaịa.”

Otú ọ dị, n’afọ ahụ kpọmkwem, ndị so n’òtù ndị Juu ọzọ nke na-achọkwa mgbanwe ọchịchị gburu Menahem. Ndị na-eso ụzọ ya gbaghachiri azụ gaa na Masada, bụ́ ebe Eleazar weghaara ọkwá ọchịagha nke ndị ogbu mmadụ ahụ ruo afọ 73 O.A. Okwu ahụ na-akpali igbu onwe onye nke Eleazar kwuru na-egosipụta ozizi hiere ụzọ nke nna nna ya bụ Judas: “Ndị enyi m bụ ndị dike, eri ogologo oge anyị ekpebisiwo ike na anyị agaghị ejere ndị Rom ma ọ bụ ndị ọ bụla ọzọ ozi ma e wezụga nanị Chineke.”

Nnọpụiche nke Ndị Kraịst bụ ndị Judia

Tupu e nwee ọgba aghara ndị Juu ahụ na 66 O.A., e guzobeworị ọgbakọ ndị Kraịst n’ime Judia, gụnyekwara ọgbakọ ahụ dị na Jerusa­lem. (Ọrụ 9:31) Ihe mejupụtara ọgbakọ ndị a bụ ndị Juu ndị kweere na Jisọs onye Nazaret bụ Mesaịa ahụ onye e buru amụma banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya. (Ọrụ 2:22-36) Ndị Kraịst ahụ bụ ndị Juu ji ịnụ ọkụ n’obi gbasaa ihe ndị ha kweere na ha, nọrọkwa n’udo ma na-echere ọbịbịa nke abụọ nke Mesaịa ahụ, dị ka onye ga-achị uwa dum. Jisọs ekwuworị ihe gosiri na ya ga-abịaghachi “mgbe ogologo oge gasịrị.”—Matiu 25:19, 31; 28:19, 20; Ọrụ 1:8-11.

Ma ozugbo ọgba aghara ndị Juu ahụ tiwapụ-rụ na 66 O.A., gịnị chebere ndị Kraịst ahụ nọ na Judia pụọ n’ịbụ ndị ihe ịga nke ọma mbụ o nwere bukọọrọ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha chetara ịdọ aka ná ntị nke Onyenwe ha, sị: “Mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) Jisọs emewokwa ka ha nwee ụzọ ziri ezi e si ele ịchịisi nke ndị ọchịchị Jentaịl anya. Ọ sịrị, “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Mak 12:17) Karịsịa, Jisọs ebuworị amụma na ndị ga-eme dị ka à ga-asị na ha bụ Mesaịa ahụ gaje ịbịa, na-asị, “Mụ onwe m bụ ya; na, Oge ahụ dị nso,” ma ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu esola ha n’azụ.”—Luk 21:8.

Ọbụna na Jisọs ebuwo amụma banyere ihe ga-esite n’ọgba aghara ndị Juu ahụ pụta, na-asị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso. Mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu; ndị nọkwa n’etiti ya, ka ha si n’ime ya wezụga onwe ha; ndị nọkwa n’ala ọzọ, ka ha ghara ịba n’ime ya. . . . N’ihi na oké mkpa ga-adị n’ala nke a, iwe ga-adịkwara ndị Juu. Ha ga-adakwa site n’ọnụ mma agha, a ga-adọtakwa ha n’agha gaa ná mba nile.”—Luk 21: 20-24.

Oké mbibi nke sochiri ọgba aghara ndị Juu ahụ bụ mmezu pụtara ìhè nke amụma Jisọs! Ma, ndị Kraịst bi na Judia lanarịrị ya site n’iji nrubeisi “gbalaga n’ugwu.” Akwụkwọ Encyclopaedia Judaica na-ekwu, sị, “Tupu nnọchibido Titus nọchibidoro Jerusalem [na 70 O.A.], òtù ndị Kraịst bi na ya kwapụrụ gaa na Pella.” Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na Pella dị n’ebe ugwu, n’ebe dị n’etiti ugwu nta ndị dị n’otu usoro oké ugwu ndị gabigara Osimiri Jọdan ahụ, nke mere na Ndagwurugwu Jọdan kewapụrụ ha kpam kpam site na Judia. G. A. Wil­liamson kwuru n’okwu mmeghe ya n’akwụkwọ ahụ bụ Josephus—The Jewish War, sị, “Ọ bụ ihe siri ike ịkọwa ihe kpatara mgbapụ nke a ma ọ bụrụ na e dekọrọ amụma [Jisọs] mgbe ihe ahụ mesịworo.”

N’eziokwu, ihe ịga nke ọma ndị Kraịst ahụ bi na Judia nwere n’ịgbapụ bụ ihe àmà siri ike nke na ha na-eso ụzọ ezi Mesaịa ahụ. Nke a na-akpalite ajụjụ ndị dị mkpa. Gịnị bụ nzube nke ọbịbịa mbụ nke Mesaịa ahụ? Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka ọgba aghara ndị Juu ahụ nke dujere n’ọdachi na-enye anyị taa, karịsịa, akụkụ ahụ nke ihe a kpọrọ mmadụ a kpọkwasịrị aha ahụ bụ “Kristian”? A ga-atụlekwu ajụjụ ndị a n’ime magazin nke a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya