-
“Nnapụta Unu Na-eru Nso”Ụlọ Nche—2015 | Julaị 15
-
-
2. Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị ime mgbe ha hụrụ ka ndị agha Rom gbara Jeruselem gburugburu n’afọ 66? Gịnị mere o ji kwe ha omume?
2 O doro anya na ị ga-echeta ihe Jizọs kwuru nke Luk dere. O kwuru, sị: “Mgbe unu hụkwara Jeruselem ka ụsụụ ndị agha ndị mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso.” (Luk 21:20) Ma, i nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee otú m ga-esi mee ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ dọchara ha aka ná ntị ahụ?’ Ọ sịrị ha: “Ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya si na ya pụọ, ka ndị nọkwa n’obodo nta dị iche iche ghara ịbanye n’ime ya.” (Luk 21:21) Oleekwanụ otú ị ga-esi gbapụ na Jeruselem ebe ọ bụ na ndị agha gbara ya gburugburu? Ihe dị ịtụnanya mere na mberede. I jizi anya gị hụ ka ndị agha Rom lawara, mezie ka ọgụ ha bịara ịlụso Jeruselem “dị mkpirikpi” otú ahụ e buru n’amụma. (Mat. 24:22) Ọ bụzi mgbe ahụ ka ị ga-eme ihe ahụ Jizọs kwuru. Ị ga-agbaga ozugbo n’ugwu ndị dị n’ofe Osimiri Jọdan, gị na Ndị Kraịst ndị ọzọ niile kwesịrị ntụkwasị obi nọ na Jeruselem nakwa n’obodo ndị gbara ya gburugburu.a N’afọ 70, ndị agha Rom bịara bibie Jeruselem. Ma, ọkọ akọghị gị n’ihi na i mere ihe Jizọs kwuru.
-
-
“Nnapụta Unu Na-eru Nso”Ụlọ Nche—2015 | Julaị 15
-
-
OGE ULE NA IKPE
7, 8. Gịnị ga-eme ma e bibichaa okpukpe ụgha? Olee otú ndị ohu Chineke ga-esi dị iche n’oge ahụ?
7 Gịnị ga-eme ma e bibichaa okpukpe ụgha niile? Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ga-egosi ihe dị anyị n’obi. Baịbụl kwuru na ọtụtụ ndị ga-aga zoo “n’oké nkume ndị dị n’ugwu,” ya bụ na ha ga-agbalị ka òtù ụmụ mmadụ chebe ha ma nyere ha aka. (Mkpu. 6:15-17) Ma, ndị ohu Jehova ga-atụkwasị Jehova obi ka o chebe ha. Mgbe e mere ka mkpagbu ahụ dị mkpirikpi n’oge ndịozi Jizọs, ọ bụghị ka ndị Juu niile ghọọ Ndị Kraịst. Ọ bụ mgbe Ndị Kraịst ga-esi na Jeruselem gbapụ otú ahụ Jizọs kwuru. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ anya na mgbe oké mkpagbu ahụ ga-akwụsịtụ, ọtụtụ ndị ga-aghọ Ndị Kraịst. Kama, ezigbo Ndị Kraịst niile ga-eji oge ahụ gosi na ha hụrụ Jehova n’anya ma na-akwado ụmụnna Kraịst.—Mat. 25:34-40.
8 N’agbanyeghị na anyị amaghị ihe niile ga-eme n’oge ule ahụ, anyị ma na ihe agaghị adịcha mfe, anyị ga-ahapụkwa ihe ụfọdụ. N’oge ndịozi, Ndị Kraịst hapụrụ ụlọ ha, diekwa ihe isi ike ka ha nwee ike ịdị ndụ. (Mak 13:15-18) Iji mee uche Chineke, ànyị ga-enwe ike ịhapụ akụnụba anyị? Ànyị ga-eme ihe ọ bụla anyị kwesịrị ime iji gosi na anyị na-erubere Jehova isi? Chegodị echiche. N’oge ahụ, ọ ga-abụ naanị anyị na-eme ihe Daniel onye amụma mere, ya bụ, ịna-efe Chineke n’agbanyeghị ihe ọ bụla na-emenụ.—Dan. 6:10, 11.
-