“Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-abụ?”
“Ihe ọhụrụ dị iche iche ka Mụ onwe m na-egosi: tutu ha epuo ana m eme ka unu nụrụ ha.”—AỊSAỊA 42:9.
1, 2. (a) Gịnị ka ndị ozi Jisọs jụrụ banyere ọdịnihu? (b) Olee otú nzaghachi Jisọs banyere ihe ịrịba ama ọtụtụ ihe mejupụtara si nwee mmezu?
IZI ihe Chineke na-esite n’aka Jehova Chineke, ‘Onye na-egosi ikpeazụ site na mbụ.’ (Aịsaịa 46:10) Dị ka isiokwu bu ụzọ gosiri, ndị ozi ahụ chọrọ izi ihe dị otú ahụ site n’ọnụ Jisọs, na-ajụ ya, sị: “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-abụ? gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama mgbe ọ bụla a gaje imezu ihe ndị a nile?”—Mak 13:4.
2 Ná nzaghachi, Jisọs kọwara otu “ihe ịrịba ama” ọtụtụ ihe mejupụtara nke ga-enye ihe àmà na-egosi na usoro ihe ndị Juu na-eru nso ọgwụgwụ ya. E mezuru nke a ná mbibi Jerusalem na 70 O.A. Ma amụma Jisọs gaje inwe mmezu ka ukwuu n’ogologo oge dị anya n’ihu. Ozugbo “oge nke mba ọzọ” gwụsịrị na 1914, a ga-enwe ihe ịrịba ama sara mbara, na-egosipụta na n’isi nso usoro ihe ọjọọ dị ugbu a ga-agwụsị ná “mkpagbu ukwu” ahụ.a (Luk 21:24) Ọtụtụ nde ndị dị ndụ taa pụrụ ịgba akaebe na e mezuwo ihe ịrịba ama nke a n’agha ụwa ndị ahụ na oké ihe omume ndị ọzọ nke narị afọ nke 20 nke a. Ndị a na-akakwa mmezu bụ isi nke amụma Jisọs akara, mmezu oge ugbu a nke e mere ihe atụ ya site n’ihe mere malite n’afọ 33 ruo 70 O.A.
3. N’ikwu banyere ihe ịrịba ama ọzọ, ihe ndị ọzọ dị aṅaa ga-eme ka Jisọs buru amụma ha?
3 Mgbe Luk kwusịrị banyere oge nke ndị mba ọzọ, ihe ndekọ ndị yiri ibe ha na Matiu, Mak, na Luk kọwara usoro ihe ndị ọzọ ga-eme ndị gụnyere otu ihe ịrịba ama a gbakwụnyere ‘n’ihe ịrịba ama nke ọgwụgwụ oge a’ bụ́ nke ọtụtụ ihe mejupụtara. (Matiu 24:3) (Na peji nke 15, e ji akara abụọ gosi isi ihe a n’ihe ndekọ ahụ.) Matiu na-asị: “Ma ngwa ngwa, mgbe mkpagbu mgbe ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya, kpakpando nile ga-adakwa site n’eluigwe, a ga-emekwa ka ike nile nke eluigwe mee mkpatụ: mgbe ahụ ka ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube. Ọ ga-ewerekwa opi ukwu zipụ ndị mmụọ ozi ya, ha ga-emekwa ka ndị nke ya a họpụtara si n’ifufe anọ zukọọ, site n’otu nsọtụ eluigwe ruo nsọtụ ya ọzọ.”—Matiu 24:29-31.
Mkpagbu na Ihe Omume nke Eluigwe
4. Ajụjụ ndị dị aṅaa na-ebilite banyere ihe omume nke eluigwe nke Jisọs kwuru?
4 Olee mgbe a ga-emezu nke ahụ? Oziọma atọ nile ahụ kwuru ihe anyị pụrụ ịkpọ ihe omume nke eluigwe—anyanwụ na ọnwa ịgba ọchịchịrị na kpakpando ịda. Jisọs kwuru na nke a ga-esochi ‘mkpagbu’ ahụ. Jisọs ò bu n’uche mkpagbu nke ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu na 70 O.A., ka ọ̀ na-ekwu banyere mkpagbu ukwu nke ka dị n’ihu n’oge anyị ndị a?—Matiu 24:29; Mak 13:24.
5. Echiche dị aṅaa ka e nweburu banyere mkpagbu ahụ n’oge ndị a?
5 Eri oge nke mba ọzọ ndị ahụ gwụsịrị na 1914, ndị Chineke enwewo oké mmasị “n’oké mkpagbu ahụ.” (Mkpughe 7:14) Ruo ọtụtụ afọ, ha chere na oké mkpagbu nke oge a nwere akụkụ mmalite nke kwekọrọ n’oge Agha Ụwa nke Mbụ, e mesịa nkwusịtụ nwa oge, na n’ikpeazụ akụkụ mmechi, bụ́ “agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye pụrụ ime ihe nile.” Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, gịnị bụ ihe omume ga-eme n’ime iri afọ ndị dị n’etiti nke “ọgwụgwụ oge a”?—Mkpughe 16:14; Matiu 13:39; 24:3; 28:20.
6. Gịnị ka e chere na o mezuru amụma Jisọs banyere ihe omume nke eluigwe?
6 Ọ dị mma, e chere na n’oge nkwụsịtụ a, na a ga-ahụ ihe ama ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara, ya na ọrụ nkwusa nke ndị Chineke chịkọtara na-arụ. O yikwara ka a pụrụ ịtụ anya ihe omume nke eluigwe ahụ e buru amụma ya n’ime oge nkwụsịtụ ahụ mgbe akụkụ mmalite gasịrị na 1914-1918. (Matiu 24:29; Mak 13:24, 25; Luk 21:25) E lekwasịrị anya n’ihe nkịtị ndị dị n’eluigwe—nnyocha mbara igwe, ụgbọ elu rọket, ụzarị mbara igwe ma ọ bụ nke gamma, na ebe dị iche iche ụgbọ elu na-ada n’ọnwa.
7. Nghọta ka mma dị aṅaa banyere mkpagbu ukwu ahụ ka e nyeworo?
7 Otú ọ dị, Ụlọ Nche nke February 1, 1971, nyochaghachiri amụma Jisọs, karịsịa mkpagbu ukwu ahụ na-abịanụ. O gosiri na n’ihi ihe mere na narị afọ nke mbụ, mkpagbu nke oge a apụghị inwe akụkụ mmalite na 1914-1918, oge nkwụsịtụ ga-ewe ọtụtụ iri afọ, wee mesịa maliteghachi. Magazin ahụ kwubiri, sị: “‘Mkpagbu ukwu’ nke na-agaghị emekwa ọzọ mgbe ọ bụla, ka dị n’ihu, n’ihi na ọ bụ ịla n’iyi nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha (tinyere Krisendọm), ‘agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye pụrụ ime ihe nile’ n’Amagedọn ewee sochie.”
8. Site ná nghọta a ka mma nke mkpagbu nke oge a, olee otú e si kọwaa Matiu 24:29?
8 Ma Matiu 24:29 na-asị na ihe omume eluigwe ahụ ga-eme ga-abịa “ngwa ngwa mgbe mkpagbu mgbe ahụ gasịrị.” Ọ̀ ga-esi aṅaa dị otú ahụ? Ụlọ Nche nke November 1, 1975, tụrụ aro na n’ebe a “mkpagbu ahụ” pụtara nke ahụ ruru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu na 70 O.A. Ma n’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na ihe omume nke eluigwe n’oge anyị na-ewere ọnọdụ “ngwa ngwa” mgbe otu ihe mesịrị na 70 O.A.? E chere na n’anya Chineke narị afọ ndị ga-agafe ga-adị mkpụmkpụ. (Ndị Rom 16:20; 2 Pita 3:8) Otú ọ dị, nnyocha miri emi karị nke amụma a, karịsịa nke Matiu 24:29-31, na-atụ aka ná nkọwa dị nnọọ iche. Nke a na-enye ihe atụ otú ìhè si “na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.” (Ilu 4:18)b Ka anyị tụlee ihe mere nkọwa ọhụrụ, ma ọ bụ nke dị iche, ji kwesị ekwesị.
9. Olee otú Akwụkwọ Nsọ Hibru si enye ihe a ga-eji ghọta okwu Jisọs banyere ihe ndị ga-eme n’eluigwe?
9 Nye anọ n’ime ndị ozi ya, Jisọs buru amụma nke ‘anyanwụ ịgba ọchịchịrị, ọnwa ịhapụ inye ìhè, na kpakpando ịda.’ Dị ka ndị Juu, ha ga-aghọta okwu dị otú ahụ site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ebe dị ka ihe atụ, na Zefanaịa 1:15, a kpọrọ oge ikpe Chineke “ụbọchị nke ime mkpọmkpọ ebe na ịtọgbọrọ n’efu, ụbọchị ọchịchịrị na oké mgbachi, ụbọchị igwe ojii na oké ọchịchịrị.” Ndị amụma dị iche iche bụ́ ndị Hibru kọwakwara n’otu aka ahụ anyanwụ ịgba ọchịchịrị, ọnwa etighị, na kpakpando ịhapụ inye ìhè. Ị ga-achọta okwu ndị dị otú ahụ n’ozi ndị Chineke ziri megide Babilọn, Edọm, Ijipt, na alaeze ebe ugwu nke Israel.—Aịsaịa 13:9, 10; 34:4, 5; Jeremaịa 4:28; Ezikiel 32:2, 6-8; Emọs 5:20; 8:2, 9.
10, 11. (a) Gịnị ka Joel buru amụma ya banyere ihe ndị dị n’eluigwe? (b) Akụkụ ndị dị aṅaa nke amụma Joel ka e mezuru na 33 O.A., oleekwa ndị a na-emezughị?
10 Mgbe ha nụrụ ihe Jisọs kwuru, ọ ghaghị ịbụ na Pita na atọ ndị ọzọ chetara amụma Joel a na-achọta na Joel 2:28-31 na 3:15: “M ga-awụsa mmụọ m n’ahụ anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ; ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma . . . M ga-enyekwa ihe ebube dị iche iche n’eluigwe na n’ụwa: ọbara, na ọkụ, na ogidi nke anwụrụ ọkụ. Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-agbanwekwa ghọọ ọbara, tutu ụbọchị Jehova abịa, bụ́ ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu.” “Anyanwụ na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achịkọpụwokwa onwunwu ha.”
11 Dị ka a kọrọ n’Ọrụ Ndị Ozi 2:1-4 na 14-21, na Pentikọst 33 O.A., Chineke wụsara mmụọ nsọ n’isi 120 ndị na-eso ụzọ, ma ndị ikom ma ndị inyom. Pita onyeozi mere ka a mara na nke a bụ ihe Joel buworo n’amụma. Ma, gịnị banyere okwu Joel metụta ‘anyanwụ ịghọ ọchịchịrị na ọnwa ịgbanwe ghọọ ọbara na kpakpando ịchịkọpụ onwunwu ha’? Ọ dịghị ihe na-egosi na e mezuru nke a na 33 O.A. ma ọ bụ n’oge ahụ were ihe karịrị 30 afọ nke ọgwụgwụ usoro ihe ndị Juu.
12, 13. Olee otú e si mezuo ihe omume nke eluigwe nke Joel buru amụma ya?
12 Ihe àmà na-egosi na e jikọrọ akụkụ ikpeazụ ahụ nke amụma Joel na ‘ọbịbịa nke ụbọchị Jehova nke dị ukwuu dịkwa egwu’—mbibi nke Jerusalem—n’ụzọ chiri anya karị. Ụlọ Nche nke December 1, 1967, kwuru banyere mkpagbu dakwasịrị Jerusalem na 70 O.A., sị: “Nke ahụ bụ n’ezie ‘ụbọchị Jehova’ n’ihe banyere Jerusalem na ụmụ ya. N’ihe banyekwara ụbọchị ahụ e nwere ọtụtụ ‘ọbara, na ọkụ, na aluluu anwụrụ ọkụ,’ anyanwụ adịghị enye oké ọchịchịrị nke obodo ahụ ìhè n’ehihie, ọnwa kwa nke na-egosi ọbara a wụsịrị awụsị, ọ bụghị ìhè ọnwa dị n’udo, nke na-acha dị ka ọlaọcha, n’abalị.”c
13 Ee, dị ka amụma ndị ọzọ anyị rụtụworo aka, a gaje imezu ihe omume nke eluigwe ndị ga-eme bụ́ ndị Joel buru amụma ha mgbe Jehova mezuru ihe e kpere n’ikpe. Kama ịnọgide ruo oge nile nke ọgwụgwụ usoro ihe ndị Juu, anyanwụ, ọnwa, na kpakpando ịgba ọchịchịrị weere ọnọdụ mgbe ndị agha na-emezu ihe e kpere n’ikpe wakwasịrị Jerusalem. N’ụzọ ezi uche dị na ya, anyị pụrụ ịtụ anya mmezu ka ukwuu nke akụkụ ahụ nke amụma Joel mgbe a malitere imezu ihe Chineke kpere n’ikpe n’isi usoro ihe dị ugbu a.
Olee Mkpagbu Ga-abịa Tupu Ihe Omume nke Eluigwe?
14, 15. Olee mmetụta amụma Joel nwere ná nghọta anyị nke Matiu 24:29?
14 Mmezu nke amụma Joel (n’ikwekọ n’amụma ndị ọzọ ji okwu ndị yiri nke ya mee ihe) na-enyere anyị aka ịghọta okwu ndị ahụ dị na Matiu 24:29. N’ụzọ doro anya, ihe Jisọs kwuru banyere ‘anyanwụ ịgba ọchịchịrị, ọnwa ịhapụ inye ìhè, na kpakpando ịda’ adịghị ezo aka n’ihe dị iche iche na-eme n’ime ọtụtụ iri afọ nke ọgwụgwụ usoro ihe dị ugbu a, dị ka iji ụgbọ elu rọket eme ihe, ịga n’ọnwa, na ihe ndị yiri ha. Ee e, o zoro aka n’ihe ndị e kekọtara ha na ‘ụbọchị Jehova nke dị ukwuu dịkwa egwu,’ mbibi nke ka ga-abịa.
15 Nke a na-emetụta anyị ịghọta nke ọma karị otú ihe omume nke eluigwe ndị ahụ ga-esi bịa “ngwa ngwa mgbe mkpagbu mgbe ahụ gasịrị.” Jisọs adịghị ezo aka ná mkpagbu ahụ nke gwụsịrị na 70 O.A. Kama nke ahụ, ọ na-atụ aka ná mbido nke oké mkpagbu ahụ ga-adakwasị usoro ụwa n’ọdịnihu, na-eweru “ọnụnọ” ya e kwere ná nkwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu. (Matiu 24:3, NW) Mkpagbu ahụ ka dị anyị n’ihu.
16. Olee mkpagbu nke Mak 13:24 na-atụ aka, n’ihi gịnị ka o jikwa dị otú ahụ?
16 Gịnị banyere okwu ndị dị na Mak 13:24: “Mgbe ahụ, mgbe mkpagbu ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya”? N’ebe a, okwu bụ́ “ahụ” bụ ụdị nke okwu Grik bụ́ e·keiʹnos, ọnọchiaha nkọwa nke na-egosi ihe omume nke oge dị anya. A pụrụ iji e·keiʹnos mee ihe igosipụta ihe mere n’oge dị anya gara aga (ma ọ bụ nke a kpọtụrụ uche na mbụ), ma ọ bụ ihe ga-eme n’ọdịnihu dị anya. (Matiu 3:1; 7:22; 10:19; 24:38; Mak 13:11, 17, 32; 14:25; Luk 10:12; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:10) Otú a, Mak 13:24 na-atụ aka ná “mkpagbu ahụ,” ọ bụghị na mkpagbu nke ndị Rom kpalitere, kama n’oké ọrụ nke Jehova n’ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a.
17, 18. Ìhè dị aṅaa ka Mkpughe na-amụkwasị n’ụzọ oké mkpagbu ahụ ga-esi pụta?
17 Isi nke 17 ruo 19 nke Mkpughe kwekọrọ ekwekọ ma na-egosi izi ezi nke nghọta ọhụrụ a nke Matiu 24:29-31, Mak 13:24-27, na Luk 21:25-28. N’ụzọ dị aṅaa? Oziọma ndị ahụ na-egosi na oké mkpagbu ahụ agaghị amalite ma gwụsịa n’otu mgbe. Mgbe ọ malitesịrị, ụfọdụ n’ime ihe a kpọrọ mmadụ ka ga-anọ ndụ ịhụ “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ” wee meghachi omume—iti aka n’obi na, dị ka e kwuru na Luk 21:26, ‘ịtụgbọ site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi.’ Oké egwu ahụ ga-abụ n’ihi ha ịhụ “ihe ịrịba ama” ahụ na-enye ihe àmà nke mbibi ha na-eru nso.
18 Ihe ndekọ Mkpughe ahụ na-egosi na mkpagbu ukwu ahụ nke ọdịnihu ga-amalite mgbe “mpì” ndị ahụ na-ebu agha nke “anụ ọhịa” mba dị iche iche chigharịrị megide “oké nwanyị ahụ na-akwa iko,” bụ́ Babilọn Ukwu ahụ.d (Mkpughe 17:1, 10-16) Ma ọtụtụ ndị ka ga-anọ, n’ihi na ndị eze, ndị ahịa, ndị isi ụgbọ mmiri, na ndị ọzọ ga-akwara ọgwụgwụ nke okpukpe ụgha ákwá. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ ga-aghọta na ihe ga-esochi bụ ikpe nke ha.—Mkpughe 18:9-19.
Gịnị Ga-abịa?
19. Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya mgbe mkpagbu ukwu ahụ malitere?
19 Akụkụ ihe odide ndị dị n’Oziọma Matiu, Mak, na Luk so Mkpughe isi nke 17-19 jikọọ aka na-amụkwasị ìhè buru ibu n’ihe ga-eme n’isi nso. N’oge Chineke kara aka, mkpagbu ukwu ahụ ga-amalite site ná mwakpo megide alaeze ụwa nke okpukpe ụgha (Babilọn Ukwu ahụ). Nke a ga-ekpo ọkụ karịsịa n’isi Krisendọm, nke kwekọrọ na Jerusalem na-ekwesịghị ntụkwasị obi. ‘Ngwa ngwa ọ gasịrị,’ bụ́ akụkụ nke a nke mkpagbu ahụ ka “ihe ịrịba ama dị iche iche ga-adịkwa n’anyanwụ na ọnwa na kpakpando; n’elu ụwa ka mkpagbu [a na-enwebeghị ihe dị ka ya] nke mba dị iche iche ga-adịkwa.”—Matiu 24:29; Luk 21:25.
20. Ihe omume dị aṅaa nke eluigwe ka anyị pụrụ ịtụ anya ya?
20 N’echiche dị aṅaa ka a ga-eme ka “anyanwụ gbaa ọchịchịrị, ọnwa hapụ inye ìhè, na kpakpando daa site n’eluigwe, e meekwa ka ike nile nke eluigwe mee mkpatụ’? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na n’akụkụ mmalite nke oké mkpagbu ahụ, “mpì iri” ahụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe 17:16 ga-ekpughewo ma wepụsịa ọtụtụ ihe ndị na-enye ìhè—ndị ụkọchukwu a ma ama nke ụwa okpukpe. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-emekwa ka ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile mee mkpatụ. À pụrụ inwekwa ihe omume ndị na-akpata ụjọ n’eluigwe nkịtị? O yiri nnọọ otú ahụ, ọ ga-akpatakwa ụjọ nke ukwuu karịa ndị nke ahụ Josephus kọwara dị ka ndị weere ọnọdụ na nso ọgwụgwụ usoro ihe ndị Juu. Anyị maara na n’oge ochie gara aga, Chineke gosipụtara ike ya ime ka e nwee mmetụta na-eweta ọdachi dị otú ahụ, ọ pụkwara ime otú ahụ ọzọ.—Ọpụpụ 10:21-23; Joshua 10:12-14; Ndị Ikpe 5:20; Luk 23:44, 45.
21. Olee otú “ihe ịrịba ama” ọdịnihu ga-esi pụta?
21 N’isi ihe nke a mmadụ atọ ahụ dum dere Oziọma ndị ahụ jiri toʹte (mgbe ahụ) webata ihe omume ga-esochi. “Mgbe ahụ ka ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe.” (Matiu 24:30; Mak 13:26; Luk 21:27) Kemgbe Agha Ụwa Mbụ ahụ, ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs aghọtawo ihe ịrịba ama ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara nke ọnụnọ ya a naadịghị ahụ anya, ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-ahụtabeghị ya. Ma Matiu 24:30 na-atụ aka n’ihu ‘n’ihe ịrịba ama’ ọzọ ga-apụta n’ọdịnihu, nke “Nwa nke mmadụ,” a ga-amanyekwa mba nile ịrịba ya ama. Mgbe Jisọs bịara n’igwe ojii nke ahụghị anya, ụmụ mmadụ na-emegide emegide gburugburu ụwa gaje ịmata ‘ọbịbịa’ ahụ (Grik, er·khoʹme·non) n’ihi otu ngosipụta karịrị mmadụ ike nke ọbụbụeze ya.—Mkpughe 1:7.
22. Gịnị ga-abụ mmetụta nke ịhụ “ihe ịrịba ama” ahụ nke Matiu 24:30?
22 Matiu 24:30 jiri toʹte mee ihe ọzọ iji webata ihe ọzọ na-esonụ. Mgbe ahụ mba nile, n’inwe mmetụta nke ihe ọnọdụ ha gaje ịrụpụta, ga-eti aka n’obi ma kwaa arịrị, ma eleghị anya na-aghọta na mbibi ha dị nso. Lee ka ihe ga-esi dị iche n’ebe ndị na-ejere Chineke ozi nọ, n’ihi na anyị ga-enwe ike iweli isi anyị elu, na-amara na mgbapụta dị nso! (Luk 21:28) Mkpughe 19:1-6 na-egosikwa ka ndị na-efe ezi ofufe nọ n’eluigwe na n’ụwa na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ọgwụgwụ nke oké nwanyị ahụ na-akwa iko.
23. (a) Jisọs ga-eme ihe dị aṅaa n’ebe ndị a họpụtara nọ? (b) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere iwere ihe fọdụrụ ahụ gaa n’eluigwe?
23 Amụma Jisọs gara n’ihu ikwu, na Mak 13:27, sị: “Mgbe ahụ [toʹte] ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi Ya, mee ka ndị nke Ya a họpụtara si n’ifufe anọ zukọọ, site ná nsọtụ ụwa ruo nsọtụ eluigwe.” N’ebe a Jisọs na-elekwasị anya n’ihe fọdụrụnụ n’ime 144,000 ndị ahụ “a họpụtara,” bụ́ ndị ka nọ ndụ n’elu ụwa. Ná mmalite nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nile, e webatara ndị a e tere mmanụ na-eso ụzọ Jisọs n’ịdị n’otu ọchịchị Chineke. Otú ọ dị, dị ka usoro ihe omume e ji eme ihe na-egosi, Mak 13:27 na Matiu 24:31 na-akọwa ihe ọzọ. “Ọ ga-ewerekwa opi ukwu” chịkọta “ndị nke Ya a họpụtara” bụ́ ndị ka fọdụrụnụ site ná nsọtụ nile nke ụwa. Olee otú a ga-esi chịkọta ha? N’ụzọ ajụjụ ọ bụla na-adịghị ya, a ga-aka ha “akara,” Jehova egosikwa ha n’ụzọ doro anya dị ka akụkụ nke “ndị a kpọworo, ndị a họpụtawokwara, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi.” Mgbe oge Chineke họpụtara rukwara, a ga-achịkọrọ ha gaa n’eluigwe ịbụ ndị eze na ndị nchụàjà.e Nke a ga-ewetara ha na ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-esonyere ha, bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ, ọṅụ, bụ́ ndị a ga-aka ha onwe ha akara n’ihi isi “n’oké mkpagbu ahụ pụta” ịnụ ụtọ ọtụtụ ngọzi n’elu ụwa paradaịs.—Matiu 24:22; Mkpughe 7:3, 4, 9-17; 17:14; 20:6; Ezikiel 9:4, 6.
24. Matiu 24:29-31 na-ekpughe usoro dị aṅaa banyere ihe omume ndị na-abịa?
24 Mgbe ndị ozi ahụ sịrị, “Gwa anyị . . . ,” nzaghachi Jisọs metụtara ihe karịrị ihe ha ga-aghọta. Ma n’ime oge ndụ ha, ha ṅụrịrị ọṅụ ịhụ mmezu ihe atụ nke amụma ya. Ọmụmụ ihe anyị nke nzaghachi Jisọs elekwasịwo anya n’akụkụ ahụ nke amụma ya nke a ga-emezu n’ọdịnihu dị nso. (Matiu 24:29-31; Mak 13:24-27; Luk 21:25-28) Ka ọ dị ugbu a, anyị pụrụ ịhụ na mgbapụta anyị na-eruwanye nso. Anyị pụrụ ilepụ anya gaa ná mmalite nke mkpagbu ukwu ahụ, mgbe ahụ ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ, mgbe ahụkwa Chineke ịchịkọta ndị ya a họpụtara. N’ikpeazụ, dị ka Onye Na-emezu Ihe E Kpere n’Ikpe nke Jehova n’Amagedọn, Eze anyị bụ́ Ọchịagha, Jisọs e meworo ka ọ nọkwasị n’ocheeze, ‘ga-emezu mmeri ya.’ (Mkpughe 6:2) Ụbọchị ahụ nke Jehova, mgbe ọ ga-abọ ọ́bọ̀, ga-abịa dị ka ngwụsị dị ebube nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a nke kaworo ụbọchị Onyenwe anyị Jisọs akara malite na 1914 gaa n’ihu.
25. Olee otú anyị pụrụ isi kere òkè ná mmezu ka dị n’ihu nke Luk 21:28?
25 Nọgide na-eritere onwe gị uru site n’izi ihe Chineke, iji zaghachi ná mmezu ka dịkwa n’ihu nke okwu Jisọs ndị bụ́: “Mgbe ihe ndị a malitere ime, leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.” (Luk 21:28) Lee aha ọdịnihu dịịrị ndị a họpụtara ahọpụta na oké ìgwè mmadụ ahụ ka Jehova na-aga n’ihu ime ka aha ya dị nsọ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ inye ihe nnwapụta banyere nke a, na-egosi ụzọ ihe ndị a na-ahụ anya mere eme n’ụbọchị anyị si emezu amụma Bible.
b Ihe ọmụma ndị ọzọ pụtara na peji nke 296-323 nke akwụkwọ God’s Kingdom of a Thousand Years Has Approached, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1973 na Ụlọ Nche nke March 15, 1983, peji nke 17-22.
c Josephus dere banyere ihe ndị mere n’agbata mwakpo mbụ ìgwè ndị agha Rom wakporo Jerusalem (66 O.A.) na mbibi ya, sị: “N’abalị oké ifufe na-ebibi ihe tiwapụrụ; ajọ ifufe fere, oké mmiri nọgidere na-ezo, àmụ̀mà nọgidere na-egbu, ụda égbè eluigwe ha na-akpata ụjọ, ala mara jijiji n’oké mkpọtụ na-azụchi ntị. Mbibi nke agbụrụ mmadụ bụ ihe e mere ihe atụ ya n’ụzọ doro anya site n’ọdịda nke a nke usoro ihe nile ahụ, ọ dịghịkwa onye pụrụ ịrụ ụka na ihe ọjọọ ndị ahụ ga-eweta ọdachi nke na-enweghị atụ.”
d Ihe Jisọs kpọrọ “oké mkpagbu” na “mkpagbu” ná mmezu mbụ ya bụ mbibi nke usoro ihe ndị Juu. Ma n’amaokwu ndị metụtara nanị oge anyị, o ji nkọwa okwu bụ “ahụ” mee ihe, na-asị “mkpagbu ahụ.” (Matiu 24:21, 29; Mak 13:19, 24) Mkpughe 7:14 kpọrọ ihe a ga-eme n’ọdịnihu “oké mkpagbu ahụ,” n’ụzọ nkịtị “mkpagbu ahụ nke dị ukwuu.”
e Lee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche nke August 15, 1990.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú e si mezuo akụkụ ụfọdụ nke Joel 2:28-31 na 3:15 na narị afọ mbụ?
◻ Olee mkpagbu nke Matiu 24:29 na-ezo aka na ya, n’ihị gịnịkwa ka anyị ji kwubie otú ahụ?
◻ Ihe omume nke eluigwe dị aṅaa ka Matiu 24:29 na-atụ aka, oleekwa otú nke a ga-esi bụrụ ngwa ngwa mgbe mkpagbu ahụ gasịrị?
◻ Olee otú a ga-esi mezuo Luk 21:26, 28 n’ọdịnihu?
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Akụkụ ụlọ nsọ ahụ
[Ebe e si nweta foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.