Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ugboro Ole Ka E Kwesịrị Ịdị Na-eme Ya?
    Ụlọ Nche—1994 | Mach 15
    • Otu Ememe Ahụ

      Jisọs malitere ememe nke a n’ụbọchị ọ nwụrụ. O sorowo ndị ozi ya mee ncheta nke oriri ndị Juu bụ́ Ememe Ngabiga. Mgbe ahụ o bugharịịrị ha ụfọdụ n’achịcha ekoghị eko ahụ nke Ememe Ngabiga, na-asị: “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye n’ihi unu.” Ọzọkwa, Jisọs bugharịịrị ha otu iko mmanya, na-asị: “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’ime ọbara m, bụ́ nke a na-awụsị n’ihi unu.” O kwukwara, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19, 20; 1 Ndị Kọrint 11:​24-⁠26) A na-akpọ ememe nke a Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, ma ọ bụ Ememe Ncheta. Ọ bụ nanị ememe nke Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-eme.

      Ọtụtụ chọọchị na-azọrọ na ha na-emekọta ememe nke a na oriri ha nile ndị ọzọ, ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-eme ya n’ụzọ dị iche site n’ụzọ Jisọs nyere n’iwu. Ma eleghị anya ọdịiche kasị dị ịrịba ama bụ ọtụtụ ugboro a na-eme ememe ahụ. Chọọchị ụfọdụ na-eme ya kwa ọnwa, kwa izu, ọbụna kwa ụbọchị. Nke a ọ̀ bụ ihe Jisọs bu n’uche mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m”? The New English Bible na-asị: “Meenụ nke a dị ka ihe ncheta nke m.” (1 Ndị Kọrint 11:​24, 25) Ugboro ole ka a na-eme ememe ncheta ma ọ bụ ememe mgbaafọ? Ọ na-abụkarị nanị otu ugbo kwa afọ.

      Chetakwa na Jisọs malitere ememe nke a wee nwụọ n’ụbọchị Nisan 14 nke kalenda ndị Juu.a Nke ahụ bụ ụbọchị Ememe Ngabiga, ememe nke na-echetara ndị Juu oké mgbapụta a gbapụtara ha n’Ijipt na narị afọ nke 16 T.O.A. Mgbe ahụ ịchụ nwa atụrụ n’àjà rụpụtara nzọpụta nke ụmụ mbụ ndị Juu, ebe mmụọ ozi Jehova tigburu ụmụ mbụ nile nke Ijipt.​—⁠Ọpụpụ 12:​21, 24-⁠27.

      Olee otú nke a si enyere nghọta anyị aka? Pọl onyeozi bụ́ onye Kraịst dere, sị: “A chụkwara àjà ngabiga anyị, bụ́ Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 5:7) Ọnwụ Jisọs bụ àjà Ememe Ngabiga nke ka ukwuu, na-enye ihe a kpọrọ mmadụ ohere maka nzọpụta dị nnọọ ebube karị. Ya mere, nye ndị Kraịst, Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst anọchiwo Ememe Ngabiga ndị Juu.​—⁠Jọn 3:16.

      Ememe Ngabiga bụ ememe a na-eme otu ugbo n’afọ. Mgbe ahụ, ezi uche dị ya na Ememe Ncheta bụ otu ihe ahụ. Ememe Ngabiga​—⁠ụbọchị Jisọs nwụrụ⁠—​na-adaba mgbe nile n’ụbọchị nke 14 nke ọnwa Nisan ndị Juu. Ya mere, e kwesịrị ime ncheta ọnwụ Kraịst otu ugbo n’afọ n’ụbọchị kalenda nke kwekọrọ na Nisan 14. Na 1994 ụbọchị ahụ bụ Saturday, March 26, mgbe anyanwụ dasịrị. Ma, n’ihi gịnị ka o ji bụrụ na chọọchị nile nke Krisendọm emebeghị nke a ka ọ bụrụ ụbọchị maka ememe pụrụ iche? Ilenyetụ anya n’akụkọ ihe mere eme ga-aza ajụjụ ahụ.

  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ugboro Ole Ka E Kwesịrị Ịdị Na-eme Ya?
    Ụlọ Nche—1994 | Mach 15
    • a Nisan, ọnwa mbụ nke afọ ndị Juu, na-eji mpụta mbụ nke ọnwa ọhụrụ amalite. Nisan 14 si otú a na-erute mgbe nile n’oge ọnwa gbazuru.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya