Ndụ na Ije Ozi Jisọs
Ihe Mgbu n’Elu Osisi Ahụ
ANA-EDURU Jisọs, tinyere mmadụ abụọ ndị na-apụnara mmadụ ihe, pụọ ije gbuo ha. N’ebe na-adịghị anya site n’obodo ahụ, ìgwè mmadụ kwụsịrị n’ebe ahụ a na-akpọ Gọlgọta ma ọ bụ Ebe Okpokoro Isi.
E yipụsịrị ndị ahụ e ji eji uwe ha. Mgbe ahụ e wetara mmanya vine a gwara myrrh. Ihe àmà gosiri na ọ bụ ndị inyom Jerusalem kwadebere ya, ndị Rom adịghị ajụkwa inye ndị a na-akpọgbu akpọgbu ngwakọta nke a na-eme ka ihe ụfụ belata. Otú ọ dị, mgbe Jisọs detụrụ ya ire, ọ jụrụ ịṅụ ya. N’ihi gịnị? O doro anya na ọ chọrọ ịmazu onwe ya nke ọma n’oge ule nke a kasị elu nke okwukwe ya.
Ugbu a, a gbatịpụrụ Jisọs n’elu osisi ahụ, na-achịli aka ya n’elu isi ya. Ndị agha ahụ wee kụbanye ntú ogologo n’ime aka ya na n’ime ụkwụ ya. Ọ mara jijiji n’ihi ihe ụfụ mgbe ntú ndị ahụ na-amapu anụ ahụ na akwara. Mgbe e buliri osisi ahụ ka o guzoro ọtọ, ihe ụfụ ahụ hiri nne nke ukwuu, n’ihi na ịdị arọ nke ahụ nile na-adọ n’ọnyá ebe ndị ahụ e ji ntú kụpuo anụ ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, kama ịba mba, Jisọs kpere ekpere n’ihi ndị agha ahụ bụ́ ndị Rom, sị: “Nna, gbaghara ha; n’ihi na ha amataghị ihe ha na-eme.”
Paịlat mere ka a kụkwasị otu ihe e dere ede n’elu osisi ahụ nke na-agụ, sị: “Jisọs Onye Nazaret Eze Ndị Juu.” Ma eleghị anya o dere nke a, ọ bụghị nanị n’ihi na ọ na-akwanyere Jisọs ùgwù, kama n’ihi na ọ kpọrọ ndị nchụàjà ndị Juu asị n’ihi iji iyi egwu manye ya ịma Jisọs ikpe ọnwụ. Ka mmadụ nile wee nwee ike ịgụ ihe odide ahụ, Paịlat mere ka e dee ya n’asụsụ atọ—n’asụsụ Hibru, n’asụsụ Latin nke ndị ọchịchị ji eme ihe, nakwa n’asụsụ Grik ọha mmadụ na-asụ.
Nke a wutere ndị isi nchụàjà, gụnyere Kaịafas na Anas. Okwu ịja mma ahụ na-emebiri ha oge hour ha nke inwe mmeri. N’ihi ya, ha mere mkpesa, sị: “Edela, Eze ndị Juu; kama, na onye ahụ sịrị, Abụ m Eze ndị Juu.” N’ịbụ onye iwe na-ewe n’ihi na ndị nchụàjà ahụ ejiriwo ya mee ihe ha chọrọ, Paịlat zaghachiri n’olu dị ike, sị: “Ihe m deworo, edewo m ya.”
Ndị nchụàjà ahụ, ha na oké ìgwè mmadụ, zukọtara ugbu a n’ebe a ga-anọ gbuo ndị ahụ, ndị nchụàjà ahụ nwara ikwu ihe megidere ihe àmà nke ihe odide ahụ. Ha kwughachiri okwu ebubo ụgha ahụ e kwuburu n’oge a na-ekpe ya ikpe ná nnọkọ ikpe Sanhedrin. Ya mere, n’ụzọ na-abụghị ihe ijuanya, ndị na-agafe n’ụzọ malitere ịgwa ya okwu mweda n’ala, na-efufe isi ha n’ịkwa emo, na-asị: ‘Gị onye gaje ịkwatu ụlọ nsọ anyị, onye ga-ewukwa ya n’ụbọchị atọ, zọpụta onwe gị: ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si n’elu osisi ịta ahụhụ rịdata!’
Ndị isi nchụàjà na ndị òtù okpukpe ha tinyere ọnụ wee kwuo, sị, ‘Ọ zọpụtara ndị ọzọ; ọ pụghị ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ Eze Israel; ka o si n’elu osisi ịta ahụhụ rịdata ugbu a, anyị ga-ekwekwa na ya. Ọ na-atụkwasị obi ya na Chineke; ka Ọ dọpụta ya ugbu a, ọ bụrụ na Ọ na-achọ ya: n’ihi na ọ sịrị, Abụ m Ọkpara Chineke.’
N’ịbụ ndị mmụọ ahụ rikpuru, ndị agha ahụ sonyere n’ịkwa Jisọs emo. Ha ji ụzọ ịkwa emo nye ya mmanya gbara ụka, ma eleghị anya na-ejide ya n’ebe dị nso n’egbugbere ọnụ ya nke kpọsiworo nkụ ma n’ekweghị ka ọnụ ya detu ya. Ha mara ya aka, sị, “Ọ bụrụ na gị onwe gị bụ eze ndị Juu, zọpụta onwe gị.” Ọbụna ndị ahụ na-apụnara mmadụ ihe—bụ́ ndị a kpọgidere otu n’aka nri Jisọs, nke ọzọkwa n’aka ekpe ya—kwara ya emo. Cheedi nnọọ echiche ihe nke ahụ pụtara! Onye kasị ukwuu nke dịworo ndụ mgbe ọ bụla, ee, onye ahụ nke so Jehova Chineke kere òkè n’ike ihe nile, guzogidesiri ike ma nagide mkparị nile nke a!
Ndị agha ahụ chịịrị uwe elu Jisọs ma kewaa ya ụzọ anọ. Ha fere nza iji kpebie ndị ga-achịrị uwe ndị a. Otú ọ dị, uwe ime ya enweghị ebe a dụkọtara ya adụkọta, ebe ọ bụ ụdị uwe dị nnọọ mma. Ya mere ndị agha ahụ sịrịtara onwe ha: “Ka anyị ghara ịdọwa ya, kama ka anyị feere ya nza, onye ọ ga-abụ nke ya.” Otú a, n’amaghị ama, ha mezuru ihe ahụ e dere n’akwụkwọ nsọ nke na-asị: “Ha kere uwe m nye onwe ha, n’elu ihe m na-eyi n’ahụ ka ha fekwara nza.”
Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, otu n’ime ndị ahụ na-apụnara mmadụ ihe ghọtara na ọ ghaghị ịbụ eziokwu na Jisọs bụ eze. Ya mere, n’ịbara onye nke ọzọ mba, ọ sịrị: “Gị onwe gị [ị́ dịghị] atụ egwu ọbụna Chineke, ebe ị nọ n’ọmụma ikpe ahụ? N’eziokwu a makwara anyị ikpe ziri ezi; n’ihi na anyị na-anata ihe kwesịịrị ihe anyi mere: ma ọ dịghị ihe ọ bụla onye a mehiere.” Mgbe ahụ ọ gwara Jisọs okwu, na-arịọ, sị: “Cheta m mgbe ọ bụla ị ga-abịa n’alaeze gị.”
Jisọs zaghachiri, sị, ‘N’ezie, asị m gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.’ A ga-emezu nkwa nke a mgbe Jisọs ga na-achị achị dị ka Eze n’eluigwe, o wee kpọlite onye ajọ omume nke a nwere nchegharị bịa ná ndụ n’elu ala n’ime Paradaịs ahụ nke ndị gabigara Amagedọn na ndị ha na ha so ga-enwe ihe ùgwù nke idozi. Matiu 27:33-44; Mak 15:22-32; Luk 23:27, 32-43; Jọn 19:17-24.
◆ N’ihi gịnị ka Jisọs ji jụ ịṅụ mmanya ahụ a gwara myrrh?
◆ Gịnị ka ihe àmà gosiri na ọ bụ ya mere e ji dekwasị ihe ahụ n’elu osisi e ji kpọgbuo Jisọs, oleekwa nkwurịta okwu ọzọ ọ kpaliri n’etiti Paịlat na ndị isi nchụàjà ahụ?
◆ Mkparị ọzọ dị aṅaa ka Jisọs nwetara mgbe ọ nọ n’elu osisi ahụ, gịnịkwa ka ihe àmà gosiri na ọ bụ ya kpaliri nke a?
◆ Olee ụzọ e si mezuo amụma n’ihe e ji uwe Jisọs mee?
◆ Mgbanwe dị aṅaa ka otu n’ime ndị ahụ na-apụnara mmadụ ihe mere, oleekwa otú Jisọs ga-esi mezuo nkwa ya?