-
Otú Jizọs Si Gosi Na Chineke Bụ Onye Ezi OmumeỤlọ Nche—2010 | Ọgọst 15
-
-
7. Olee ihe ndị dị oké ọnụ ahịa Jizọs nwere?
7 Jizọs gosiri na ya ji ife Chineke kpọrọ ihe site n’ịgachi ebe a na-anọ efe Chineke anya. Ebe ọ bụ na o zuru okè, ọ ga-abụrịrị na ọ ghọtara ihe ọ bụla ọ nụrụ nakwa ihe ọ bụla ọ gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. (Luk 4:16) Jizọs nwekwara ihe ọzọ dị oké ọnụ ahịa, ya bụ, ahụ́ zuru okè nke a ga-eji chụọ àjà maka ụmụ mmadụ. Mgbe e mere Jizọs baptizim, o nwere ike ịbụ na ọ nọ na-eche banyere amụma ahụ dị n’Abụ Ọma 40:6-8 mgbe ọ na-ekpe ekpere.—Luk 3:21; gụọ Ndị Hibru 10:5-10.a
-
-
Otú Jizọs Si Gosi Na Chineke Bụ Onye Ezi OmumeỤlọ Nche—2010 | Ọgọst 15
-
-
a N’ebe a, Pọl onyeozi kwughachiri ihe e dere n’Abụ Ọma 40:6-8 dị ka e si sụgharịa ya na Septuagint Grik, nke ihe dị na ya gụnyere okwu bụ́ “ị kwadebeere m ahụ́.” Okwu a adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke e nwere n’oge a.
-