-
‘Na-eme Ihe n’Ikpe Ziri Ezi’ n’Iso Chineke Na-eje IjeBịaruo Jehova Nso
-
-
13 Ọ bụrụ na anyị aghọta obi ebere nke dị n’ikpe ziri ezi Chineke, anyị agaghị adị ngwa n’ikpe ndị ọzọ ikpe n’okwu ndị na-agbasachaghị anyị ma ọ bụ ndị na-adịchaghị mkpa. N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Kwụsịnụ ikpe ikpe ka e wee ghara ikpe unu ikpe.” (Matiu 7:1) Dị ka ihe ndekọ Luk si kwuo, Jizọs kwukwara, sị: “Kwụsịkwanụ ịma ikpe, a gaghịkwa ama unu ikpe ma ọlị.”a (Luk 6:37) Jizọs gosiri na ọ maara na ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ekpekarị ndị ọzọ ikpe. Onye ọ bụla na-ege ya ntị nke nwere àgwà ikpe ndị ọzọ ikpe n’obi ọjọọ ga-akwụsị ya.
14. N’ihi ihe ndị dịgasị aṅaa ka anyị na-aghaghị ‘ịkwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe’?
14 N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji ‘kwụsị ikpe ndị ọzọ ikpe’? Otu ihe bụ na a kpaara ikike anyị nwere ókè. Jems onye na-eso ụzọ na-echetara anyị, sị: “E nwere otu onye nke bụ onye na-enye iwu na onyeikpe”—Jehova. Ya mere Jems jụrụ kpọmkwem, sị: “Ònye ka ị bụ na ị ga na-ekpe onye agbata obi gị ikpe?” (Jems 4:12; Ndị Rom 14:1-4) Tụkwasị na nke a, ọdịdị anyị nke ime mmehie pụrụ ime n’ụzọ dị mfe ka anyị na-ekpe ikpe na-ezighị ezi. Ọtụtụ àgwà na ebumnobi—gụnyere ajọ mbunobi, iwe iwe n’ihi ịbụ onye e mejọrọ, ekworo, na ịbụ onye ezi omume n’anya onwe onye—pụrụ ime ka ụzọ anyị si ele ụmụ mmadụ ibe anyị anya gbagọọ agbagọọ. Anyị nwekwara adịghị ike ndị ọzọ, ịtụgharị uche na ha kwesịkwara igbochi anyị ịdị ngwa n’ịhụta mmejọ nke ndị ọzọ. Anyị apụghị ịchọpụta ihe dị mmadụ n’obi; anyị apụghịkwa ịmata ọnọdụ nile banyere ndị ọzọ. Mgbe ahụ, ònye ka anyị bụ ikwu na ndị kwere ekwe ibe anyị bu ihe na-adịghị mma n’obi ma ọ bụ ịkatọ mgbalị ha na-eme n’ozi Chineke? Lee ka o si ka mma iṅomi Jehova site n’ile anya n’akụkụ ụmụnna anyị na-eme nke ọma kama ilekwasị anya ná mmejọ ha!
15. Okwu na mmeso dị aṅaa ka a na-adịghị anabata n’etiti ndị na-efe Chineke, n’ihi gịnịkwa?
15 Olee banyere ndị òtù ezinụlọ anyị? N’ụzọ dị mwute, n’ime ụwa taa, a na-ekpe ụfọdụ n’ime ikpe kasị jọgbuo onwe ha n’ebe kwesịrị ịbụ ebe udo jupụtara—ebe obibi. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịnụ banyere ndị di, ndị nwunye, ma ọ bụ ndị nne na nna na-agwakasị ndị ezinụlọ ha ahụ́ ma ọ bụ na-eti ha ihe mgbe nile. Ma a dịghị anabata okwu ọjọọ, okwu na-afụ ụfụ n’ahụ́, na iti ihe n’etiti ndị na-efe Chineke. (Ndị Efesọs 4:29, 31; 5:33; 6:4) Ndụmọdụ Jizọs nke bụ́ “kwụsịnụ ikpe ikpe” na “kwụsịkwanụ ịma ikpe” adịghị akwụsị ịdị irè mgbe anyị nọ n’ebe obibi anyị. Cheta na ikpe ikpe ziri ezi na-agụnye imeso ndị ọzọ otú Jehova si emeso anyị. Ọ dịghịkwa mgbe Chineke anyị na-eji aka ike ma ọ bụ obi ọjọọ na-emeso anyị ihe. Kama nke ahụ, o “nwere mmetụta dị nnọọ nro” n’ebe ndị hụrụ ya n’anya nọ. (Jems 5:11) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya anyị kwesịrị iṅomi nke ahụ bụ!
-
-
‘Na-eme Ihe n’Ikpe Ziri Ezi’ n’Iso Chineke Na-eje IjeBịaruo Jehova Nso
-
-
a Nsụgharị ụfọdụ na-asị “unu ekpela ikpe” na “unu amakwala ikpe.” Nsụgharị ndị dị otú ahụ na-enye echiche bụ́ “unu amalitela ikpe ikpe amalite” na “unu amalitela ịma ikpe amalite.” Otú ọ dị, ndị dere akụkụ Bible a ji okwu na-enye iwu ka a ghara ime ihe mee ihe n’ebe a, bụ́ okwu ndị na-egosi ihe nọ na-eme na-aga n’ihu. N’ihi ya, ihe ndị ahụ a kọwara nọ na-eme na-aga n’ihu ma ha aghaghị ịkwụsị.
-