Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ‘Nọgidenụ n’Okwu m’
    Ụlọ Nche—2003 | Febụwarị 1
    • 16. (a) Olee ndị yiri ala ahụ ogwu juru na ya? (b) Dị ka e dekọrọ n’Oziọma atọ ndị ahụ, gịnị ka ogwu ahụ nọchiri anya ya?—Lee ihe odide ala ala peeji.

      16 Olee ụdị ndị yiri ala ahụ ogwu jupụtara na ya? Jizọs na-akọwa, sị: “Ndị a bụ ndị nụworonụ, ma, site n’ịbụ ndị nchegbu na akụ̀ na ụba na ihe ụtọ dị iche iche nke ndụ na-ebupụ, a na-akpagbu ha kpam kpam, ha adịghịkwa emepụta ihe ọ bụla zuru okè.” (Luk 8:14) Dị nnọọ ka mkpụrụ nke ọgha mkpụrụ ahụ na ogwu ahụ tolitekọrọ n’ala ahụ, n’otu aka ahụ, ụfọdụ ndị na-agbalị ịnabata okwu Chineke na “ihe ụtọ dị iche iche nke ndụ” n’otu mgbe. A na-akụbanye eziokwu nke okwu Chineke n’obi ha, ma ha adịghị ama ma ọ bụ ya ka ha ga-elebara anya ka ọ bụ nchụso ndị ọzọ. Obi ihe atụ ha kewara ekewa. (Luk 9:57-62) Nke a na-egbochi ha iwepụta oge zuru ezu iji jiri ekpere na-atụgharị uche n’okwu Chineke n’ụzọ nwere nzube. Ha adịghị etinye obi ha dum n’okwu Chineke, n’ihi ya kwa, ha adịghị enwe ekele sitere n’obi bụ́ nke a chọrọ iji na-atachi obi. Nke nta nke nta, nchụso ha ndị na-abụghị nke ime mmụọ na-ekpuchi ihe ime mmụọ ha ruo n’ókè nke na a “na-akpagbu ha kpam kpam.”c Lee ọgwụgwụ dị mwute nke a bụụrụ ndị na-adịghị eji obi ha dum ahụ Jehova n’anya!—Matiu 6:24; 22:37.

      17. Olee nhọrọ ndị ọ dị mkpa ka anyị mee ná ndụ iji zere ịbụ ndị ogwu ihe atụ e kwuru banyere ya n’ihe atụ Jizọs ga-akpagbu?

      17 Site n’ibute ihe ime mmụọ ụzọ karịa ihe onwunwe, anyị na-ezere ịbụ ndị ihe mgbu na ihe ụtọ dị iche iche nke ụwa a ga-akpagbu. (Matiu 6:31-33; Luk 21:34-36) Anyị ekwesịtụghị ileghara ọgụgụ Bible na ịtụgharị uche n’ihe anyị gụrụ anya. Anyị ga-enwekwu oge iji ekpere na-atụgharị uche n’enweghị ihe ndọpụ uche ma ọ bụrụ na anyị emee ka ndụ anyị dị mfe ruo ókè o kwere mee. (1 Timoti 6:6-8) Ndị ohu Chineke bụ́ ndị meworo otú ahụ—ndị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, fopụworo ogwu n’ala iji mee ka ihe ọkụkụ nke na-amị mkpụrụ na-enwetakwu nri, ìhè, na ohere—na-enweta ngọzi Jehova. Sandra, bụ́ onye dị afọ 26 na-ekwu, sị: “Mgbe m tụgharịrị uche ná ngọzi ndị m nwetaworo n’eziokwu ahụ, ana m aghọta na ụwa apụghị inye m ihe ọ bụla a ga-eji tụnyere ya!”—Abụ Ọma 84:11.

  • ‘Nọgidenụ n’Okwu m’
    Ụlọ Nche—2003 | Febụwarị 1
    • c Dị ka ihe ndekọ banyere ilu Jizọs n’Oziọma atọ ndị ahụ si kwuo, ihe kpagburu mkpụrụ ahụ bụ ihe mgbu na ihe ụtọ dị iche iche nke ụwa a: “Nchegbu nke usoro ihe a,” “ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba,” “ọchịchọ maka ihe ndị ọzọ gasị,” na “ihe ụtọ dị iche iche nke ndụ.”—Mak 4:19; Matiu 13:22; Luk 8:14; Jeremaịa 4:3, 4.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya