Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 9/1 p. 7-9
  • A Matala Onye Nọ na Nzuzo Na-achị Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • A Matala Onye Nọ na Nzuzo Na-achị Ụwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Onye Na-achị Ụwa A” Egosila Onye Ọ Bụ
  • Onye Na-achị Ụwa Nyere Ndị Òtù Ya Ike
  • Onye Na-achị Ụwa Egosila na Obi Fere Ya Azụ
  • Ekwensu Na-agbazi Egwú Ụla
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • “Na-eguzogidenụ Ekwensu” Dị Ka Jizọs Mere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ekwensu—Ọ Bụghị Nkwenkwe Ụgha Nkịtị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Guzogide Setan, Ọ Ga-agbapụkwa!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 9/1 p. 7-9

A Matala Onye Nọ na Nzuzo Na-achị Ụwa

OTU mgbe, Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “A ga-achụpụ onye na-achị ụwa a.” O mechakwara kwuo na ‘onye na-achị ụwa enweghị ike n’ebe ọ nọ’ nakwa na “e kpewo onye na-achị ụwa a ikpe.” (Jọn 12:31; 14:30; 16:11) Ọ̀ bụ onye ka Jizọs na-ekwu okwu ya?

Ihe ndị a Jizọs kwuru banyere “onye na-achị ụwa a” na-egosi na ọ bụghị Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, ka ọ na-ekwu. Ònyezi bụ “onye na-achị ụwa a”? Olee otú a ga-esi ‘achụpụ’ ya, oleekwa otú e si ‘kpee ya ikpe’?

“Onye Na-achị Ụwa A” Egosila Onye Ọ Bụ

Ndị isi ndị omekome na-etukarị ọnụ ma ha kọwa otú ha si akpa ike. Otú ahụkwa ka Ekwensu si tuo ọnụ mgbe ọ na-anwa Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke. Mgbe Setan gosichara Jizọs “alaeze niile” nke ụwa, ọ gwara ya, sị: “M ga-enye gị ikike a niile na ebube ha, n’ihi na e nyefewo ha n’aka m, ọ bụkwa onye ọ bụla m chọrọ ka m na-enye ya. Ya mere, ọ bụrụ na i fee m ofufe, ha niile ga-abụ nke gị.”—Luk 4:5-7.

A sị na Ekwensu bụ naanị ihe ọjọọ dị n’obi mmadụ, dị ka ụfọdụ ndị na-ekwu, gịnịzi nwara Jizọs ọnwụnwa? À ga-asị na ihe nwara Jizọs bụ echiche ọjọọ dị ya n’obi nke ya na ya nọ na-alụ mgbe e mechara ya baptizim? Ya bụrụ otú ahụ, olee otú Baịbụl ga-esi ekwu na ‘ọ dịghị mmehie dị n’ime Jizọs’? (1 Jọn 3:5) Jizọs gosiri na Ekwensu na-achị ụmụ mmadụ. Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ya “onye na-achị ụwa,” kpọọkwa ya “ogbu mmadụ” na “onye ụgha.”—Jọn 14:30; 8:44.

Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri asaa Ekwensu nwachara Kraịst ọnwụnwa, Jọn onyeozi chetaara Ndị Kraịst na Ekwensu na-akpa ike dị egwu, kwuokwa na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” Jọn kwukwara na ajọ onye ahụ “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (1 Jọn 5:19; Mkpughe 12:9) N’eziokwu, onye Baịbụl kwuru na ọ bụ “onye na-achị ụwa” bụ mmụọ a na-anaghị ahụ anya. Ma, olee otú o si na-achị ụmụ mmadụ?

Onye Na-achị Ụwa Nyere Ndị Òtù Ya Ike

Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu okwu banyere mgba Ndị Kraịst na-agba maka okwukwe ha, o mere ka anyị mata ndị iro kacha njọ anyị nwere. Ọ sịrị: “Anyị nwere mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide ọchịchị, megide ikike, megide ndị na-achị ụwa nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ n’ebe ndị dị n’eluigwe.” (Ndị Efesọs 6:12) Nke a na-egosi na mgba a abụghị mgba mmadụ na ibe ya na-agba n’ihi na “ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́,” kama ọ bụ “megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ.”

Ọtụtụ Baịbụl ndị a sụgharịrị n’oge na-adịchabeghị anya na-egosi na “ìgwè ndị mmụọ ọjọọ” a na-ekwu okwu ha ebe a abụghị ihe ọjọọ nkịtị dị n’obi mmadụ, kama ha bụ ndị mmụọ ọjọọ dị ike. Ụfọdụ Baịbụl ndị ahụ kpọrọ ha ‘ụsụụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a’ (Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society), ‘ajọ mmụọ dị iche iche, ndị na-achị ihu eluigwe’ (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik), na “ndị agha Mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe” (Baibul Nsọ [Ndezighari Ọhuru]). N’ihi ya, Ekwensu si n’aka ndị mmụọ ozi ndị ọzọ nupụụrụ Chineke isi na-akpa ike. Ndị mmụọ ozi ahụ “hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị” n’eluigwe.—Jud 6.

Akwụkwọ Daniel, bụ́ nke Daniel onye amụma dere, kọrọ otú ‘ndị ahụ na-achị ụwa’ si na-achị ụwa kemgbe oge ochie. Daniel kpegaara Chineke ekpere maka ndị Juu ibe ya bụ́ ndị si Babịlọn laghachi Jeruselem n’afọ 537 Tupu Oge Anyị. O kpere ekpere ahụ izu atọ n’ihi otú ọnọdụ ha si na-ewute ya. Chineke zigara otu mmụọ ozi ka ọ gaa kasie Daniel obi. Mmụọ ozi ahụ gburu oge tupu ya erute. Mgbe o rutere, ọ gwara onye amụma ahụ ihe mere ya ji gbuo oge. Ọ sịrị: “Onyeisi alaeze Peshia nọchiiri m ụzọ ruo ụbọchị iri abụọ na otu.”—Daniel 10:2, 13.

Ònye bụ “onyeisi alaeze Peshia” a? O doro anya na onye mmụọ ozi ahụ na-ekwu abụghị eze Peshia bụ́ Saịrọs, bụ́ onye nọ na-enyere Daniel na ndị Juu ibe ya aka. A sị ka e kwuwe, ò nwere otú mmadụ nkịtị ga-esi nọchiere mmụọ ozi ụzọ ruo izu atọ ebe naanị otu mmụọ ozi gburu otu narị puku ndị agha na iri puku asatọ na puku ise, bụ́ ndị dike, n’otu abalị? (Aịzaya 37:36) “Onyeisi alaeze Peshia” a ga-abụrịrị otu n’ime ndị na-ejere Ekwensu ozi, ya bụ, mmụọ ọjọọ nke o nyere ọrụ ịchị Alaeze Peshia. Akwụkwọ Daniel mechara kwuo na mmụọ ozi Chineke ahụ sịrị na ya ga-agaghachi lụsoo “onyeisi Peshia” na mmụọ ọjọọ ọzọ bụ́ “onyeisi Gris” ọgụ.—Daniel 10:20.

Gịnị ka nke a na-eme ka anyị ghọta? Ọ na-eme ka anyị ghọta na e nwere ndị a na-anaghị ahụ anya “na-achị ụwa,” ya bụ, ndị mmụọ ọjọọ ndị ha na onyeisi ha, bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, so na-achị ụwa. Ma, gịnị bụ ebumnobi ha kemgbe ha chịwara?

Onye Na-achị Ụwa Egosila na Obi Fere Ya Azụ

Ná Mkpughe, bụ́ akwụkwọ ikpeazụ na Baịbụl, Jọn onyeozi kọrọ otú Jizọs, bụ́ Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi, si merie Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya, kọọkwa nsogbu nchụpụ a chụpụrụ ha n’eluigwe na-akpatara ụmụ mmadụ. Akwụkwọ Mkpughe sịrị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa . . . n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”—Mkpughe 12:9, 12.

Olee otú Ekwensu si egosi na ọ na-ewe oké iwe? Ihe ọtụtụ ndị omekome na-ekwukarị bụ na ọ bụrụ na e meghị ihe ha kwuru, ha alaa ihe niile n’iyi. Otú ahụkwa ka Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya si kpebisie ike na ha ga-ala ụwa na ndị bi n’ime ya n’iyi. Ebe ọ bụ na Ekwensu maara na oge fọdụụrụ ya dị mkpirikpi, o ji otu n’ime ihe ndị dị ụmụ mmadụ mkpa na-emegharị ha anya. Ihe ahụ bụ azụmahịa. O ji ya na-eme ka ndị mmadụ chewe na ha kwesịrị inwe ihe ọ bụla anya ha hụrụ. Nke a emeela ka ụmụ mmadụ na-ewekọrọsị akụ̀ ndị dị n’ime ala ma na-emebisịrị ndị mmadụ ụwa.—Mkpughe 11:18; 18:11-17.

Kemgbe e kere mmadụ, ihe na-eme na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa nakwa n’okpukpe egosila na Ekwensu chọrọ ka ọ bụrụ ya na-atụ ihe na-eme. Akwụkwọ Mkpughe kpọrọ ndị ọchịchị anụ ọhịa, kwuokwa na Ekwensu nyere ha “ikike dị ukwuu.” Akwụkwọ Mkpughe kpọkwara okpukpe ụgha nwaanyị akwụna n’ihi na ndị okpukpe na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma n’otu oge ahụ na-ekwu na ha na-efe Chineke. (Mkpughe 13:2; 17:1, 2) Chegodị ahụhụ ndị mmadụ tarala nakwa ọtụtụ nde mmadụ nwụrụlanụ n’ihi mmegbu, ịgba ohu, agha, na esemokwu ndị a na-enwe n’ụwa kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ò nwere onye ga-asị na ihe ọjọọ niile na-awụ akpata oyi n’ahụ́, bụ́ ndị merela kemgbe e kere mmadụ, bụ naanị ụmụ mmadụ ka o si n’aka? Ka aka ndị mmụọ ọjọọ a na-anaghị ahụ anya ọ̀ dị na ha?

N’eziokwu, Baịbụl agbaala onye ahụ n’anwụ bụ́ onye na-atụrụ ndị isi na ndị ọchịchị ụwa ihe ha na-eme. Ma ndị mmadụ hà ma ma ọ̀ bụ na ha amaghị, ha na-akpa àgwà ka onye ahụ na-achị ụwa a, ihe niile ha na-eme bụ tigbuo zọgbuo. Ma, olee mgbe ahụhụ a ndị mmadụ na-ata n’ihi ọchịchị Ekwensu ga-akwụsị?

Ekwensu Na-agbazi Egwú Ụla

Mgbe Kraịst nọ n’ụwa, o gosiri na a ga-egbu Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’oge na-adịghị anya. Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs kọọrọ ya otú ha si chụpụ ndị mmụọ ọjọọ a na-anaghị ahụ anya, Jizọs sịrị ha: “Amalitewo m ịhụ Setan ka ọ dara dị ka àmụ̀mà nke si n’eluigwe.” (Luk 10:18) Ihe a Jizọs kwuru gosiri obi ụtọ ọ nọ na-enwe maka mmeri ọ ga-emeri onye na-achị ụwa a ma ya laghachi n’eluigwe bụrụkwa Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi. (Mkpughe 12:7-9) Amụma ndị dị na Baịbụl gosiri na Jizọs meriri Ekwensu n’eluigwe n’afọ 1914 ma ọ bụ mgbe afọ 1914 gafetụrụ.a

Kemgbe ahụ, Ekwensu maara na oge o nwere tupu e bibie ya fọrọ obere. Ọ bụ eziokwu na “ụwa dum dị n’aka” ya, e nwere ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa taa bụ́ ndị na-ekweghị ka o duhie ha n’agbanyeghị mbọ niile ọ na-agba. Baịbụl emeela ka ha mata ụdị onye Ekwensu bụ na aghụghọ ya. (2 Ndị Kọrịnt 2:11) Ihe Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya emeela ka obi sie ndị ahụ na-ekweghị ka Ekwensu duhie ha ike. Pọl sịrị: “Chineke nke na-enye udo ga-azọpịa Setan n’okpuru ụkwụ unu n’oge na-adịghị anya.”b—Ndị Rom 16:20.

N’oge na-adịghị anya, ike a Ekwensu na-akpa ga-akwụsị. Mgbe Kraịst ga-achịwa ụwa, ndị ezi omume ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs. Ime ihe ike, ịkpọasị, na anyaukwu agaghịzi adị. Baịbụl kwuru, sị: “A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịzaya 65:17) Ahụ́ ga-eru nnọọ mmadụ niile ala mgbe onye ahụ zooro ezoro na-achị ụwa ga-akwụsị ịchị ụwa!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere afọ 1914, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 215 ruo nke 218. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

b N’amaokwu a, Pọl kwughachiri ihe e dere na Jenesis 3:15, bụ́ amụma mbụ e dere na Baịbụl nke gosiri na a ga-emecha bibie Ekwensu. Okwu Pọl ji kọwaa mbibi ahụ a ga-ebibi Ekwensu bụ okwu Grik nke pụtara “itipịa ihe, ịkụri ihe, igweri ihe.”—Akwụkwọ bụ́ Vine’s Complete Expository Dictionary of Old and New Testament Words.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Mgbe Kraịst ga-achịwa ụwa, ndị ezi omume ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya