Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Dọpụ Uche Gị n’Ozi Jehova
    Ụlọ Nche—2015 | Ọktoba 15
    • 2 Ihe mere Jizọs ji hụ Mata n’anya abụghị naanị na ọ ma otú e si ele mmadụ ọbịa, na-arụsikwa ọrụ ike, kama ọ bụ n’ihi na o nwere okwukwe siri ike. O kweere n’ihe niile Jizọs kụziri. Obi sikwara ya ike na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. (Jọn 11:21-27) Ma, Mata bụ mmadụ na-ezughị okè. E nwere ihe ndị o mejọrọ otú ahụ anyị niile na-emejọ. Dị ka ihe atụ, otu mgbe Jizọs gara n’ụlọ ha, Mata wesara Meri nwanne ya nwaanyị iwe ma gwa Jizọs ka ọ baara ya mba. Mata sịrị: “Onyenwe anyị, ọ́ bụghịrị gị ihe ọ bụla na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ihe niile ka m mewe? Ya mere, gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” (Gụọ Luk 10:38-42.) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’akụkọ a?

  • Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Dọpụ Uche Gị n’Ozi Jehova
    Ụlọ Nche—2015 | Ọktoba 15
    • 4 Ma, ihe Mata na-eme dọpụrụ uche ya. Ọ nọ na-agba mbọ ka o siere Jizọs nri pụrụ iche, na-emekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ iji mee ka obi dị́ Jizọs ezigbo ụtọ. Mgbe Mata hụrụ na Meri abịaghị nyewere ya aka, iwe were ya, ya ekpesawara Jizọs. Ma Jizọs ma na ihe Mata na-agbalị ime karịrị akarị. Ọ bụ ya mere o ji wetuo obi sị ya: “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe.” Ọ gwaziri Mata na ihe ole na ole ma ọ bụkwanụ naanị otu nri ga-ezu. Ọ jara Meri mma maka ige ntị nke ọma. Ọ sịrị: “Ma Meri họọrọ òkè dị mma, a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.” Meri nwere ike ichefu ihe o riri n’ụbọchị ahụ, ma o doro anya na o chefughị ihe ọ mụtara n’ọnụ Jizọs na otú o si jaa ya mma. Mgbe ihe karịrị iri afọ isii gara, Jọn onyeozi dere, sị: ‘Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwaanyị n’anya.’ (Jọn 11:5) Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na Mata nabatara ndụmọdụ Jizọs nyere ya ma gbalịsie ike iji obi ya niile jeere Jehova ozi ruo ọnwụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya