Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Jehova Na-enye “Ndị Na-arịọ Ya Mmụọ Nsọ”
    Ụlọ Nche—2006 | Disemba 15
    • 11. Olee otú Jizọs si jiri ihe atụ ahụ o nyere banyere nna na nwa ya mee ihe n’ihe banyere ekpere?

      11 Ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere nwoke ahụ nwere onye ọbịa na-egosi otú mmadụ—onye kwere ekwe—kwesịrị isi na-ekpe ekpere. Ihe atụ nke ọzọ ana-egosikwanụ àgwà nke onye na-anụ ekpere—bụ́ Jehova Chineke. Jizọs jụrụ, sị: “N’ezie, olee nna ọ bụ n’etiti unu, onye, ọ bụrụ na nwa ya nwoke arịọ ya azụ, nke ga-enye ya agwọ n’ọnọdụ azụ, ma eleghị anya? Ma ọ bụ nke ga-enye ya akpị ma ọ bụrụ na ọ rịọ ya àkwá?” Jizọs gara n’ihu ịkọwa ihe ihe atụ ahụ pụtara site n’ikwu, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, maara ụzọ isi nye ụmụ unu ezi onyinye, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”—Luk 11:11-13.

      12. Olee otú ihe atụ banyere nna nke nyere nwa ya ihe ọ rịọrọ ya si egosi njikere Jehova dị ịnụ ekpere anyị?

      12 Jizọs ji ihe atụ a nke nna nyere nwa ya ihe ọ rịọrọ ya gosi otú obi na-adị Jehova n’ebe ndị na-ekpegara ya ekpere nọ. (Luk 10:22) Nke mbụ, rịba ọdịiche dị n’etiti ihe atụ abụọ ahụ ama. N’adịghị ka nwoke ahụ a kọrọ banyere ya n’ihe atụ nke mbụ ahụ, bụ́ onye na-achọghị ige ntị n’arịrịọ a rịọrọ ya maka enyemaka, Jehova yiri nna bụ́ mmadụ nke na-ahụ n’anya, bụ́ onye dị njikere inye nwa ya ihe ọ rịọrọ ya. (Abụ Ọma 50:15) Jizọs mekwuru ka anyị mata àgwà Jehova site n’ibu ụzọ kwuo banyere nna nke bụ́ mmadụ tupu ya ana-ekwu banyere nna nke eluigwe. O kwuru na ọ bụrụ na nna bụ́ mmadụ, ọ bụ ezie na ‘ọ bụ onye ajọ omume’ n’ihi mmehie e ketara eketa, na-enye nwa ya ezi onyinye, anyị ga-atụ nnọọ anya na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye nwere obiọma, ga-enye ndị ezinụlọ ya na-efe ya mmụọ nsọ karị!—Jems 1:17.

  • Jehova Na-enye “Ndị Na-arịọ Ya Mmụọ Nsọ”
    Ụlọ Nche—2006 | Disemba 15
    • 14. (a) Olee echiche na-ezighị ezi na-enye ụfọdụ ndị a na-anwa ọnwụnwa nsogbu n’obi? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jiri obi ike kpegara Jehova ekpere mgbe a na-anwa anyị ọnwụnwa?

      14 Ihe ọzọ ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere nna nke na-ahụ n’anya na-akụzikwara anyị bụ na obiọma Jehova karịrị nnọọ obiọma nke nna ọ bụla bụ́ mmadụ. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị ekwesịtụghị iche na ihe isi ike ndị anyị na-enwe aghaghị ịbụ n’ihi na Chineke na-eweso anyị iwe. Ọ bụ onye iro ukwu anyị, bụ́ Setan, bụ onye chọrọ ka anyị na-eche otú ahụ. (Job 4:1, 7, 8; Jọn 8:44) Ọ dịghị ebe echiche dị otú ahụ dị n’Akwụkwọ Nsọ. Jehova apụghị “iji ihe ọjọọ” nwaa anyị. (Jems 1:13) Ọ naghị eji ihe yiri agwọ nwaa anyị ọnwụnwa, ma ọ bụ jiri ihe yiri akpị lee anyị ule. Nna anyị nke eluigwe na-enye “ndị na-arịọ ya arịrịọ ihe ọma.” (Matiu 7:11; Luk 11:13) N’ezie, ka anyị na-aghọtakwu obiọma Jehova na njikere ọ dị inyere anyị aka, otú ahụ ka a ga-akpalikwu anyị iji obi ike na-ekpegara ya ekpere. Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-enwekwa ike ikwu dị ka onye ọbụ abụ kwuru, bụ́ onye dere, sị: “N’ezie Chineke anụwo olu m; Ọ ṅawo ntị olu ekpere m.”—Abụ Ọma 10:17; 66:19.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya