Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 7/1 p. 32
  • Ịma Mma nke Na-adịghị Aṅacha Aṅacha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Mma nke Na-adịghị Aṅacha Aṅacha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 7/1 p. 32

Ịma Mma nke Na-adịghị Aṅacha Aṅacha

“ỊMA mma na-apụ n’anya; ịma mma na-agafe agafe,” ka onye na-ede abụ uri, bụ́ Walter De la Mare kwuru. Nke a bụ nnọọ eziokwu n’ọnọdụ nke okooko osisi cactus mara oké mma nke e sepụtara n’ebe a. Ebube ha na-aṅacha ngwa ngwa.

Onye Kraịst bụ́ Jemes onye na-eso ụzọ dere, sị: “Dị ka ụzarị ahịhịa ọ [ọgaranya] ga-agabiga. N’ihi na anyanwụ na-awalite, ifufe dị ọkụ eso ya, o wee kpọnwụọ ahịhịa; ụzarị ya wee dapụ, mma nke ihu ya wee laa n’iyi: otú a ka ọgaranya ga-atalatakwa n’ije ya nile.”​—⁠Jemes 1:​10, 11.

N’ụwa nke a a na-ejighị n’aka, akụ na ụba pụrụ n’ezie ịpụ n’anya n’otu abalị. Ọzọkwa, ọgaranya—dịkwa ka onye ọ bụla ọzọ⁠—​bụ onye ‘a na-ebipụ dị ka okooko osisi.’ (Job 14:​1, 2) Jisọs tụrụ ilu banyere nwoke nke ji ọrụ n’aka na-akpakọba akụ na ụba ka o wee nwee ike ịnọdụ ala ma zurutụ ike ná ndụ. Ma mgbe o chere na ya enwetawo ihe nile dị mkpa maka ndụ ntụsara ahụ, ọ nwụrụ. Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Otú a ka ọ dị, bụ́ onye na-akpadoro onwe ya akụ, ma ọ bụghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—Luk 12:​16-⁠21.

“Ọgaranya n’ebe Chineke nọ.” Gịnị ka Jisọs bu n’uche kwuo nke ahụ? Onye bụ ọgaranya n’ụzọ dị otú a nwere “akụ n’eluigwe”​—⁠bụ́ ezi aha n’ebe Chineke nọ. Ụdị akụ dị otú ahụ adịghị aṅacha mgbe ọ bụla. (Matiu 6:20; Ndị Hibru 6:10) Kama ịdị ka okooko osisi nke na-achanwụ achanwụ, na Bible, e ji nwoke dị otú ahụ tụnyere osisi, bụ́ nke akwụkwọ ya na-adịghị akpọnwụ. A na-emesikwa anyị obi ike na, “ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”—Abụ Ọma 1:​1-3, 6, NW.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya