-
Jizọs Enye Ndụmọdụ Gbasara Ịba ỌgaranyaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Ole ndị ga na-achọ Alaeze Chineke? Jizọs kwuru na ọ bụ ụmụ mmadụ ole na ole kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ kpọrọ ha “ìgwè atụrụ nta.” Ka oge na-aga, e mere ka a mata na ha dị naanị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ. Olee ihe Chineke ga-emere ha? Jizọs gwara ha, sị: “Ọ dị Nna unu mma inye unu alaeze.” Mkpa ha agaghị abụ ịkpakọbara onwe ha akụ̀ n’ụwa, bụ́ ihe ndị ohi nwere ike izu. Kama, obi ha niile ga-adị ‘n’akụ̀ nke na-adịghị agwụ agwụ n’eluigwe,’ bụ́ ebe ha na Kraịst ga-anọ na-achị ụwa.—Luk 12:32-34.
-
-
Onye Ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Kwesịrị Ịdị NjikereJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Jizọs kwuru na ọ bụ naanị “ìgwè atụrụ nta” ga-eso ya chịa n’Alaeze eluigwe. (Luk 12:32) Ma, onye nwere olileanya ịga eluigwe ekwesịghị iji ya gwuo egwu. Jizọs mere ka o doo anya na onye ga-eketa Alaeze eluigwe ga na-akpa àgwà ọma.
-