-
O Chere ‘Ihe Ihe Ndị Ahụ Pụtara’Ụlọ Nche—2008 | Ọktoba 1
-
-
Mgbe Meri na Josef rutere, ha hụrụ na ndị mmadụ jupụtara n’obodo ahụ. Ndị ọzọ eburula ha ụzọ bịa ka e deba aha ha n’akwụkwọ. N’ihi ya, e nweghị ụlọ ndị njem fọdụrụ ha ga-anọ.b O nweghị ihe ọzọ ha ga-eme ma ọ́ bụghị ịnọrọ n’ụlọ anụ ka chi bọọ. Anyị nwere ike iji anya nke uche anyị hụ otú obi si koro Josef n’elu mgbe ọ hụrụ otú ahụ́ si na-egbu nwunye ya mgbu n’ụdị ọ na-egbutụbeghị ya mbụ, bụ́ nke nọ na-aka njọ. O nweghị nnọọ ebe ọzọ ime malitere ime ya ma ọ́ bụghị n’ụlọ anụ.
Onye ọ bụla bụ́ nwaanyị ga-emetara Meri ebere. Ihe dị ka puku afọ anọ tupu oge Meri dị ndụ, Jehova buru amụma na ụmụ nwaanyị ga-enwe ihe mgbu mgbe ha na-amụ nwa n’ihi mmehie anyị ketara eketa. (Jenesis 3:16) O doro anya na nke a agụpụghị Meri. Luk akọghị otú o si nwee ihe mgbu mgbe ọ mụrụ nwa, naanị ihe o kwuru bụ: “O wee mụọ nwa ya nwoke, bụ́ nwa mbụ ya.” (Luk 2:7) N’ezie, Meri mụrụ “nwa mbụ” ya, nwa nke mbụ ọ mụrụ tupu ya amụọ ụmụ ya ndị ọzọ. Ụmụ niile ọ mụrụ dị asaa, ma ọ dịkarịa ala. (Mak 6:3) Ma, nwa nke a pụrụ iche. Ọ bụghị naanị na ọ bụ nwa mbụ Meri mụrụ, ọ bụkwa onye Jehova “bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke,” Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya!—Ndị Kọlọsi 1:15.
Luk kwuziri ihe ọzọ ọtụtụ ndị ma ugbu a, sị: “O wee jiri ákwà fụọ ya ma nyiwe ya n’ime ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.” (Luk 2:7) A na-egosi ọmụmụ Jizọs n’ihe nkiri nakwa n’ihe osise dị iche iche n’ụwa dum n’ụzọ na-adịchaghị mma. Tụlegodị nke bụ́ eziokwu. Ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri bụ efere ma ọ bụ arịa anụmanụ na-etinye ọnụ na-eri nri e debeere ha. Ya mere, ọ bụ n’ụlọ anụ ka ezinụlọ ahụ hiri. Ụdị ebe a anaghị adị ọcha, ezigbo ikuku anaghịkwa abata na ya, ma n’oge ahụ ma n’oge a. O doro anya na o nweghị nne na nna ga-ahọrọ ka a mụọ nwa ha n’ebe ahụ ma ọ bụrụ na ebe ọzọ dị. Ọtụtụ nne na nna na-achọ imere ụmụ ha ihe ga-adịrị ha mma. Meri na Josef chọrọ imere Ọkpara Chineke otú ahụ ọbụna karị!
Ma, ha ekweghị ka iwe wee ha maka na ha enwetaghị ebe ọzọ; ha mere ihe ha nwere ike ime. Dị ka ihe atụ, Meri lekọtara nwa ahụ site n’ịfụ ya ákwà nke ọma wee jiri nlezianya nyiwe ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri ka o hie ụra ma hụ na ahụ́ kpooro ya ọkụ nakwa na o nweghị ihe mere ya. Meri ekweghị ka ọnọdụ ọ hụrụ onwe ya na ya mee ka o chegbuwe onwe ya wee mee ka ọ ghara imere nwa ya ihe niile o nwere ike imere ya. Ya na Josef makwaara na inyere nwata a aka ka o wee fee Chineke bụ ihe kacha mkpa ha nwere ike imere ya. (Diuterọnọmi 6:6-8) N’oge anyị a, ndị nne na nna ndị maara ihe na-enwe ụdị echiche ahụ ha nwere mgbe ha na-azụ ụmụ ha n’ụwa a ndị mmadụ na-ejighị ofufe Chineke kpọrọ ihe.
-
-
O Chere ‘Ihe Ihe Ndị Ahụ Pụtara’Ụlọ Nche—2008 | Ọktoba 1
-
-
b N’oge ahụ, obodo dị iche iche na-enwegasị ọnụ ụlọ ebe ndị njem na ndị na-agafe agafe na-anọbọ chi.
-