-
Ole Ndị Chineke Na-akpọ Ka Ha Bịa Oriri?Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
“Otu nwoke nọ na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa maka nnukwu nri anyasị, ọ kpọkwara ọtụtụ ndị òkù. O wee zipụ ohu ya . . . ka ọ gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ òkù, sị, ‘Bịanụ, n’ihi na a kwadowo ihe niile.’ Ma ha niile malitere ịrịọ ka a hapụ ha. Onye mbụ sịrị ya, ‘Azụrụ m ubi, m ga-agarịrị hụ ya; ana m arịọ gị, ka a gụpụ m.’ Onye ọzọ sịkwara, ‘Azụrụ m ehi iri e jikọrọ abụọ abụọ, ana m agakwa ileru ha anya; ana m arịọ gị, ka a gụpụ m.’ Onye ọzọ sịkwara, ‘M ka lụrụ nwaanyị, n’ihi ya, apụghị m ịbịa.’”—Luk 14:16-20.
Ihe ndị a ha kụdoro aka jụ ịbịa erijughị afọ. Mmadụ na-ebukarị ụzọ aga ahụ ubi ma ọ bụ anụ ọ chọrọ ịzụ tupu ya azụọ ya. Ọ zụchaa ya, o kwesịghịzi ịdị ya ọkụ ọkụ ịga hụ ya ma ọ bụ leruo ya anya. Onye nke atọ a kpọrọ anaghị akwadebe ịlụ nwaanyị. Ọ lụchaala. N’ihi ya, o kwesịghị igbochi ya ịza òkù a dị mkpa a kpọrọ ya. Mgbe onye kpọrọ oriri ahụ nụrụ ihe ndị a ha kwuru, iwe were ya, ya agwa ohu ya, sị:
-
-
Ole Ndị Chineke Na-akpọ Ka Ha Bịa Oriri?Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Ihe atụ a Jizọs mere gosiri otú Jehova Chineke si zipụ Jizọs Kraịst ka ọ kpọọ ndị mmadụ ka ha soro ná ndị ga-eketa Alaeze eluigwe. Ọ bụ ndị Juu, karịchaa ndị ndú okpukpe ha, ka e bu ụzọ kpọọ. Ma, ọtụtụ n’ime ha jụrụ òkù Jizọs kpọrọ ha n’oge niile ọ na-ekwusa ozi ọma n’ụwa. Ọ bụghị naanị ha ka a kpọrọ òkù a. Ihe Jizọs kwuru mere ka o doo anya na a ga-emecha kpọọ ndị Juu ọ na-enweghị ka ọ hà ha nakwa ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu. N’ikpeazụ, a ga-akpọ ndị nke atọ, ya bụ, ndị ndị Juu lere anya ka ndị na-adịghị ọcha n’anya Chineke.—Ọrụ Ndịozi 10:28-48.
-