Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 10/1 p. 8-13
  • Chineke Ọ̀ Na-ebute Ụzọ n’Ezinụlọ Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Na-ebute Ụzọ n’Ezinụlọ Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọnyà nke Mmegide Ezinụlọ
  • Ịnagide Ihe Ịma Aka Ya
  • Ụgwọ Ọrụ Bara Ụba nke A Pụrụ Inwe
  • Ịmụta Ihe n’Aka Jisọs
  • Ndị Di, Ndị Nwunye—Ṅomienụ Kraịst!
  • Ụzọ Isi Mee Ka Ndụ Ezinụlọ Gị Na-enye Obi Ụtọ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ndị Bụ́ Di—Nakwerenụ Ịbụisi Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Nduzi Amamihe Dị Na Ya Maka Ndị Di Na Nwunye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ndị Bụ́ nwunye—Na-akwanyerenụ Di Unu Ùgwù Miri Emi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 10/1 p. 8-13

Chineke Ọ̀ Na-ebute Ụzọ n’Ezinụlọ Gị?

“Ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum.”—MAK 12:29, 30.

1. Olee otú ọ dịruru ná mkpa na anyị ga-ahụ Jehova n’anya?

“OLEE nke bụ nke mbụ n’ihe nile e nyere n’iwu?” ka otu onye odeakwụkwọ jụworo Jisọs. Kama inye echiche nke onwe ya, Jisọs zara ajụjụ ya site n’ihota Okwu Chineke dị na Deuterọnọmi 6:4, 5. Ọ zaghachiri, sị: “Nke mbụ bụ, Nụrụ, Israel; Onyenwe anyị, bụ́ Chineke anyi, Onyenwe anyị bụ otu: ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa na mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum.”—Mak 12:28-30.

2. (a) Mmegide dị aṅaa ka Jisọs na-aghaghị iche ihu? (b) Gịnị pụrụ ime mgbe ụfọdụ ka ime ihe na-atọ Jehova ụtọ sie ike?

2 Iji rube isi n’ihe Jisọs kpọrọ ihe mbụ e nyere n’iwu—nke kasị mkpa—na-achọ n’aka anyị ịdị na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ mgbe nile. Jisọs mere otú ahụ, ọ bụ ezie na n’otu mgbe Pita onyeozi megidere ihe na-eche Jisọs ihu, n’oge ọzọkwa ndị ikwu ya dị ya nso mekwara otú ahụ. (Matiu 16:21-23; Mak 3:21; Jọn 8:29) Gịnị ma ọ bụrụ na ị chọta onwe gị n’otu ụdị ọnọdụ ahụ? Ka e were ya na ndị òtù ezinụlọ chọrọ ka ị kwụsị ọmụmụ Bible gị na isoro Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta. Ị̀ ga-ebute Chineke ụzọ site n’ime ihe na-atọ ya ụtọ? Chineke ọ̀ na-ebute ụzọ, ọbụna mgbe ndị òtù ezinụlọ pụrụ imegide mgbalị gị ijere ya ozi?

Ọnyà nke Mmegide Ezinụlọ

3. (a) Gịnị pụrụ ịbụ ihe ga-esi n’ozizi Jisọs apụtara ezinụlọ? (b) Olee otú ndị òtù ezinụlọ pụrụ isi gosi onye ha hụrụ n’anya karị?

3 Jisọs ewereghị ihe isi ike nke pụrụ ịpụta mgbe ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ na-emegide onye òtù ezinụlọ ahụ nke nakweere ozizi ya dị ka ihe dị nta. “Ndị ezinụlọ mmadụ ga-abụ ndị iro ya,” ka Jisọs kwuru. Ma, n’agbanyeghị ihe mwute na-esi na ya apụta, Jisọs gosiri onye e kwesịrị ibute ụzọ site n’ịsị: “Onye na-ahụ nna ya ma ọ bụ nne ya n’anya karịa Mụ adịghị ekwesị m; onye na-ahụkwa nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwanyị n’anya karịa Mụ adịghị ekwesị m.” (Matiu 10:34-37) Anyị na-ebute Jehova Chineke ụzọ site n’ịgbaso ozizi nke Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, onye bụ “onyinyo nke ụdị [Chineke].”—Ndị Hibru 1:3; Jọn 14:9.

4. (a) Gịnị ka Jisọs sịrị na ịbụ onye na-eso ụzọ ya gụnyere? (b) N’echiche dị aṅaa ka ndị Kraịst ga-akpọ ndị òtù ezinụlọ ha asị?

4 N’oge ọzọ mgbe Jisọs na-ekwu ihe ọ gụnyere n’ezie ịbụ ezi onye na-eso ụzọ ya, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute m, ma ọ kpọghị nna nke ya asị, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na ụmụ nke ya, na ụmụnne ndị ikom nke ya, na ụmụnne ndị inyom nke ya, ee, ndụ nke aka ya kwa, ọ pụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.” (Luk 14:26) O doro anya na Jisọs ebughị n’uche na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịkpọ ndị òtù ezinụlọ ha asị n’ụzọ nkịtị, ebe ọ bụ na o nyere ndị mmadụ iwu ịhụ ọbụna ndị iro ha n’anya. (Matiu 5:44) Kama nke ahụ, n’ebe a Jisọs bu n’uche na ndị na-eso ụzọ ya aghaghị ịhụ ndị òtù ezinụlọ ha n’anya n’ụzọ dị ala karịa ka ha hụrụ Chineke. (Tụlee Matiu 6:24.) N’ikwekọ ná nghọta ahụ, Bible na-asị na Jekọb ‘kpọrọ Lia asị’ ma hụ Rechel n’anya, nke pụtara na ọ hụrughị Lia n’anya otú ọ hụrụ nwanne ya nwanyị, bụ́ Rechel n’anya. (Jenesis 29:30-32) Ọbụna “ndụ” nke onwe anyị, ka Jisọs kwuru, bụ ihe e kwesịrị ịkpọ asị, ma ọ bụ hụ n’anya n’ụzọ dị ala, karịa ka a hụrụ Jehova!

5. Olee otú Setan si eji aghụghọ eji ndokwa ezinụlọ eme ihe?

5 Dị ka Onye Okike na Onye Na-enye Ndụ, Jehova kwesịrị inweta nraranye zuru ezu nke ndị ohu ya nile. (Mkpughe 4:11) ‘M na-egbu ikpere m abụọ n’ala nye Nna anyị,’ ka Pọl onyeozi dere, ‘Onye e sitere na Ya gụọ eriri nna [“ezinụlọ,” NW] nile ọ bụla n’eluigwe na n’elu ụwa aha.” (Ndị Efesọs 3:14, 15) Jehova mere ndokwa ezinụlọ n’ụzọ magburu onwe ya nke na ndị òtù ezinụlọ na-enwe mmetụta ịhụnanya maka ibe ha. (1 Ndị Eze 3:25, 26; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:7) Otú ọ dị, Setan bụ́ Ekwensu na-eji ụzọ aghụghọ jiri mmetụta ịhụnanya nke a nke ezinụlọ na-eme ihe, bụ́ nke gụnyere ọchịchọ nke ime ihe na-atọ onye a hụrụ n’anya ụtọ. Ọ na-afụnwu ọkụ nke mmegide ezinụlọ, ọtụtụ na-achọtakwa ya ịbụ ihe ịma aka iguzosi ike maka eziokwu Bible mgbe ha chere ya ihu.—Mkpughe 12:9, 12.

Ịnagide Ihe Ịma Aka Ya

6, 7. (a) Olee otú a pụrụ isi nyere ndị òtù ezinụlọ aka ịghọta mkpa nke ọmụmụ Bible na mkpakọrịta ndị Kraịst? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị hụrụ ndị òtù ezinụlọ anyị n’anya n’ezie?

6 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na a manye gị ime nhọrọ n’etiti ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ma ọ bụ ime ihe na-atọ onye òtù ezinụlọ ụtọ? Ị̀ ga-eche na Chineke adịghị atụ anyị anya ịmụ Okwu ya ma tinye ụkpụrụ ya n’ọrụ ma ọ bụrụ na ime otú ahụ na-akpata nkewa ezinụlọ? Ma cheedị banyere ya. Ọ bụrụ na i kwenye ma kwụsị ọmụmụ Bible gị ma ọ bụ isoro Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta, olee otú ndị a hụrụ n’anya ga-esi ghọta na ezi ihe ọmụma nke Bible bụ okwu metụtara ọnwụ na ndụ?—Jọn 17:3; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-8.

7 Anyị pụrụ ime ihe atụ ọnọdụ a n’ụzọ dị otú a: Eleghị anya onye òtù ezinụlọ nwere ọchịchọ gabigara ókè maka ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. Ileghara nsogbu ya nke ịṅụ mmanya anya ma ọ bụ ikwere ka ọ dịrị ọ̀ ga-abara ya uru n’ezie? Ọ̀ ga-aka mma ikwe ka udo dịrị site n’ikwenyere ya ma ghara ime ihe ọ bụla banyere nsogbu ahụ? Ee e, ma eleghị anya i kwere na ọ ga-akasị mma ịgbalị inyere ya aka imeri nsogbu ya nke ịṅụ mmanya, ọbụna ọ bụrụ na ọ pụtara iche iwe na iyi egwu ya ihu. (Ilu 29:25) N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị hụrụ ndị òtù ezinụlọ gị n’anya n’ezie, ị gaghị ekwenye ná mgbalị ha ịkwụsị gị ịmụ Bible. (Ọrụ 5:29) Nanị site n’iwere nguzo siri ike ka ị pụrụ inyere ha aka ịghọta na ibi ndụ kwekọrọ n’ozizi Kraịst pụtara ndụ anyị kpọmkwem.

8. Olee otú anyị na-esi erite uru site n’eziokwu ahụ bụ na Jisọs ji ikwesị ntụkwasị obi mee ihe Chineke na-achọ?

8 Ibute Chineke ụzọ pụrụ isi oké ike mgbe ụfọdụ. Ma cheta, Setan mekwara ka o siere Jisọs ike ime uche Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ Jisọs adaghị mbà ma ọlị; o diri ọbụna ihe mgbu nke osisi ịta ahụhụ n’ihi anyị. “Jisọs Kraịst [bụ] Onye nzọpụta anyị,” ka Bible na-asị. ‘Ọ nwụrụ n’ihi anyị.’ (Taịtọs 3:6; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:10) Ọ̀ bụ na anyị enweghị ekele na Jisọs ekweghị ka mmegide merie ya? N’ihi na ọ tachiri obi n’ọnwụ ịchụ àjà, anyị nwere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke udo site n’inwe okwukwe n’ọbara ọ wụfuru.—Jọn 3:16, 36; Mkpughe 21:3, 4.

Ụgwọ Ọrụ Bara Ụba nke A Pụrụ Inwe

9. (a) Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi kere òkè n’ịzọpụta ndị ọzọ? (b) Gịnị bụ ọnọdụ ezinụlọ Timoti?

9 Ị̀ ghọtara na gị onwe gị kwa pụrụ ikere òkè n’ịzọpụta ndị ọzọ, tinyere ndị ikwu a hụrụ n’anya nke ukwuu? Pọl onyeozi gbara Timoti ume, sị: “Na-anọgide n’ihe ndị a [e ziworo gị]; n’ihi na n’ime nke a ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gị.” (1 Timoti 4:16, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Timoti biri ndụ n’ezinụlọ kewara ekewa, ebe nna ya bụ́ onye Grik bụ onye na-ekweghị ekwe. (Ọrụ 16:1; 2 Timoti 1:5; 3:14) Ọ bụ ezie na anyị amaghị ma o nwere mgbe nna Timoti mechara ghọọ onye kwere ekwe, àgwà ikwesị ntụkwasị obi nke nwunye ya, bụ́ Yunaịsị, na nke Timoti mewanyere ka ọ bụrụ ihe pụrụ ikwe omume ya ime otú ahụ.

10. Gịnị ka ndị Kraịst pụrụ imere ndị òtù ọlụlụ ha na-ekweghị ekwe?

10 Akwụkwọ Nsọ na-ekpughe na ndị di na nwunye na-eji ịnọgidesi ike na-akwado eziokwu Bible pụrụ ịtụnye ụtụ n’ịzọpụta ndị òtù ọlụlụ ha na-abụghị ndị Kraịst site n’inyere ha aka ịghọ ndị kwere ekwe. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na nwanna ọ bụla nwere nwunye na-ekweghị ekwe, ọ bụrụkwa na ọ dị nwanyị ahụ ezi mma ka ya na ya biri, ka di ya ghara ịhapụ ya. Ọzọ, nwanyị nke nwe di na-ekweghị ekwe, ọ bụrụkwa na ọ dị nwoke ahụ ezi mma ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ di ya. N’ihi na ì si aṅaa mara, nwunye, ma ị ga-azọpụta di gị? ma ọ bụ ì si aṅaa mara, di, ma ị ga-azọpụta nwunye gị.” (1 Ndị Kọrint 7:12, 13, 16) Pita onyeozi kọwara otú ndị bụ́ nwunye pụrụ isi zọpụta ndị di ha, na-agba ume, sị: “Na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu; ka, ọbụna a sị na ụfọdụ ekwenyeghị okwu Chineke, ka e wee site n’ibi obi nwunye ha rite ha n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu.”—1 Pita 3:1.

11, 12. (a) Ụgwọ ọrụ dị aṅaa ka ọtụtụ puku ndị Kraịst nwetaworo, gịnịkwa ka ha mere iji nweta ya? (b) Kọọ otu ahụmahụ banyere onye òtù ezinụlọ ịbụ onye a kwụghachiri ụgwọ ọrụ maka iji ikwesị ntụkwasị obi na-enwe ndidi.

11 N’afọ ndị na-adịbeghị anya ọtụtụ puku aghọọla Ndịàmà Jehova mgbe ọtụtụ ọnwa na ọbụna ọtụtụ afọ nke imegide ọrụ ndị Kraịst nke ndị ikwu ha bụ́ Ndịàmà gasịrị. Lee aha ụgwọ ọrụ nke a bụụrụ ndị Kraịst nọgidesiworo ike, leekwa ihe ngọzi ọ bụụrụ ndị ahụ bụbu ndị mmegide! N’inwe mmetụta uche n’ụda olu ya, otu onye okenye ndị Kraịst gbara 74 afọ kọrọ, sị: “M na-ekelekarị nwunye m na ụmụ m maka ịrapagidesi ike n’eziokwu n’afọ nile m megidere ha.” Ọ sịrị na ruo afọ atọ o jiri ịkpọ ekwo nkụ jụ ọbụna ikwe ka nwunye ya gwa ya okwu banyere Bible. “Ma o jiri oge o yiri ka m ga-aṅa ntị mee ihe,” ka o kwuru, “wee malite ịgbara m àmà mgbe ọ na-ahịa m aka n’ụkwụ. Lee ka m si nwee ekele na o kweghị ka mmegide m merie ya!”

12 Di ọzọ nke megidere ezinụlọ ya dere, sị: ‘Abụ m onye iro kasị njọ nke nwunye m n’ihi na mgbe ọ natasịrị eziokwu, eyiri m ya egwu, anyị na-esekwa okwu kwa ụbọchị; ya bụ, m na-akpatakarị esemokwu. Ma ihe ahụ nile bụ n’efu; nwunye m rapagidere na Bible. Ya mere 12 afọ gafere n’ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ m na-alụ megide eziokwu na megide nwunye m na nwa m. Nye ha abụọ, abụ m Ekwensu nọ na mmadụ.’ N’ikpeazụ nwoke ahụ malitere inyocha ndụ ya. ‘Ahụrụ m otú m siworo nwee obi ọjọọ,’ ka ọ kọwara. ‘M gụrụ Bible, n’ihi ntụziaka ya kwa, abụ m ugbu a Onyeàmà e mere baptism.’ Cheedị banyere ụgwọ ọrụ dị ukwuu nke nwunye ya, ee, ebe o nyeworo aka ‘zọpụta di ya’ site n’iji ikwesị ntụkwasị obi tachie obi ná mmegide ya ruo 12 afọ!

Ịmụta Ihe n’Aka Jisọs

13. (a) Gịnị bụ ihe mmụta bụ́ isi nke ndị bụ́ di na ndị bụ́ nwunye kwesịrị ịmụta site n’ụzọ ndụ Jisọs? (b) Olee otú ndị ọ na-esiri ike ime ihe Chineke na-achọ pụrụ isi rite uru site n’ihe nlereanya Jisọs?

13 Isi ihe ndị di na nwunye kwesịrị ịmụta site n’ụzọ ndụ Jisọs bụ nrubeisi nye Chineke. “Mụ onwe m na-eme ihe na-atọ Ya ụtọ mgbe nile,” ka Jisọs kwuru. “Etughị m ihe Mụ onwe m na-achọ, kama ihe Onye zitere m na-achọ.” (Jọn 5:30; 8:29) Ọbụna n’otu mgbe Jisọs hụrụ otu akụkụ nke ihe Chineke na-achọ ịbụ ihe na-elu ilu, o rubere isi. “Ọ bụrụ na ọ dị Gị mma, nara m iko a,” ka o kpere n’ekpere. Ma ọ gbakwụnyere ngwa ngwa, sị: “Otú ọ dị, ka e mee ihe Gị onwe gị na-achọ, ọ bụghị ihe Mụ onwe m na-achọ.” (Luk 22:42) Jisọs arịọghị Chineke ka ọ gbanwee ihe Ọ na-achọ; o gosiri na ọ hụrụ Chineke n’anya n’ezie site n’iji nrubeisi nakwere ihe ọ bụla bụ ihe Chineke na-achọ n’ebe ọ nọ. (1 Jọn 5:3) Ibute ihe Chineke na-achọ ụzọ mgbe nile, dị ka Jisọs mere, dị oké mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma ọ bụghị nanị ná ndụ alụghị di ma ọ bụ nwunye kamakwa ná ndụ alụmdi na nwunye na ezinụlọ. Tụlee ihe mere nke a ji dị otú a.

14. Olee otú ụfọdụ ndị Kraịst si na-eche echiche n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị?

14 Dị ka e kwuworo na mbụ, mgbe ndị kwere ekwe butere Chineke ụzọ, ha na-achọ isoro onye òtù ọlụlụ ha na-ekweghị ekwe nọgide na-ebi, ọtụtụ mgbekwa ha na-enwe ike inyere ha aka iru eru maka nzọpụta. Ọbụna mgbe di na nwunye ahụ bụ ndị kwere ekwe, alụmdi na nwunye ha pụrụ ịbụ nke na-adịtụghị mma. N’ihi ọchịchọ mmehie, ndị di na nwunye adịghị enwerịta echiche ịhụnanya n’ebe ibe ha nọ mgbe nile. (Ndị Rom 7:19, 20; 1 Ndị Kọrint 7:28) Ụfọdụ ọbụna na-eru n’ókè nke ịchụso inweta di ma ọ bụ nwunye dị iche, ọ bụ ezie na ha enweghị ebe mgbakwasị ụkwụ Akwụkwọ Nsọ kwadoro maka ịgba alụkwaghịm. (Matiu 19:9; Ndị Hibru 13:4) Ha na-eche na nye ha nke a kasị mma, na ihe Chineke na-achọ maka ndị di na nwunye iji na-ebikọ bụ ihe tara akpụ gabiga ókè. (Malakaị 2:16; Matiu 19:5, 6) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a bụ ọnọdụ ọzọ nke iche echiche dị ka mmadụ kama ịdị ka nke Chineke.

15. N’ihi gịnị ka ibute Chineke ụzọ ji bụrụ ihe nchebe?

15 Lee ihe nchebe ọ bụ ibute Chineke ụzọ! Ndị lụrụ di na nwunye bụ́ ndị na-eme otú ahụ ga-agbalị ịrapara n’ahụ ibe ha ma dozie nsogbu ha site n’itinye ndụmọdụ nke Okwu Chineke n’ọrụ. Ha na-esi otú a ezere ụdị nile nke obi mgbu nke na-apụta mgbe e leghaara ihe ọ na-achọ anya. (Abụ Ọma 19:7-11) E mere ihe atụ nke a n’ebe di na nwunye bụ ndị ntorobịa nọ bụ́ ndị, mgbe ọ fọrọ nke nta ka ha gbaa alụkwaghịm, kpebiri ịgbaso ndụmọdụ Bible. Ọtụtụ afọ n’ihu mgbe nwunye ya tụgharịrị uche n’ọṅụ o nweworo n’alụmdi na nwunye ya, ọ sịrị: “M ghaghị ịnọdụ ọdụ bee ákwá mgbe m tụlere ikwe omume nke na m pụrụ ịbụworị onye bi iche n’ebe di ya nọ eri afọ ndị a nile. Mgbe ahụ m na-ekpegara Jehova Chineke ekpere ma kelee ya maka ndụmọdụ ya na nduzi ya nke jikọtara anyị n’ụdị mmekọrịta obi ụtọ a.”

Ndị Di, Ndị Nwunye—Ṅomienụ Kraịst!

16. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụụrụ ma ndị bụ́ di ma ndị bụ́ nwunye?

16 Jisọs, bụ́ onye na-ebute Chineke ụzọ mgbe nile, setịpụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya maka ma ndị bụ́ di ma ndị bụ́ nwunye, o kwesịkwara ka ha jiri nlezianya tinye uche na ya. A gbara ndị bụ́ di ume iṅomi ụzọ Jisọs si egosi ịbụisi dị nro n’elu ndị òtù nke ọgbakọ ndị Kraịst. (Ndị Efesọs 5:23) Ndị nwunye bụ́ ndị Kraịst pụkwara ịmụta ihe site n’ihe nlereanya na-enweghị ntụpọ nke Jisọs ịnọ n’okpuru Chineke.—1 Ndị Kọrint 11:3.

17, 18. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jisọs setịpụrụ ezi ihe nlereanya maka ndị bụ́ di?

17 Bible na-enye iwu, sị: “Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ Ya n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi ya.” (Ndị Efesọs 5:25) Otu ụzọ dị mkpa Jisọs si gosi ịhụnanya ya maka ọgbakọ ya nke ndị na-eso ụzọ bụ site n’ịbụ ezi enyi ha. “Akpọwo m unu ndị enyi,” ka Jisọs kwuru, “n’ihi na ihe nile M nụrụ site n’ọnụ Nna m ka M mere ka unu mara.” (Jọn 15:15) Cheedị banyere oge nile Jisọs jiri soro ndị na-eso ụzọ ya na-ekwurịta okwu—ọtụtụ nkwurịta okwu o soro ha nwee—nakwa obi ike o nwere n’ebe ha nọ! Nke ahụ ọ́ bụghị ihe nlereanya magburu onwe ya maka ndị bụ́ di?

18 Jisọs nwere ezi mmasị n’ahụ ndị na-eso ụzọ ya ma nwee ezi ịhụnanya maka ha. (Jọn 13:1) Mgbe ihe ndị ọ kụziri na-edoghị ha anya, o jiri ndidi wepụta oge mgbe ha nọ nanị ha ime ka ihe doo ha anya. (Matiu 13:36-43) Ndị bụ́ di, ọdịmma ime mmụọ nke nwunye gị ọ̀ dị gị mkpa n’ụzọ dị otú ahụ? Ị̀ na-ewepụta oge soro ya nọkọọ, na-ejide n’aka na unu abụọ nwere eziokwu Bible n’uche na n’obi unu n’ụzọ doro anya? Jisọs sonyeere ndị ozi ya n’ozi, ma eleghị anya na-azụ onye ọ bụla n’ime ha n’otu n’otu. Ị̀ na-esonyere nwunye gị n’ozi, na-ekere òkè ná nleta ụlọ n’ụlọ na iduzi ọmụmụ Bible?

19. Olee otú ụzọ Jisọs si mee ihe banyere adịghị ike na-abịaghachi mgbe mgbe nke ndị ozi ya si setịpụ ihe nlereanya maka ndị bụ́ di?

19 Jisọs nyere ndị bụ́ di ihe nlereanya bụ ọkpọka karịsịa n’imeso ndị ozi ya na-ezughị okè omume. N’oge nri ikpeazụ ya o so ndị ozi ya rie, ọ pụrụ ịhụta mmụọ nke ịma aka na-abịaghachi mgbe mgbe. Ọ̀ katọrọ ha n’ụzọ obi ọjọọ? Ee e, kama o ji obi umeala saa ụkwụ nke onye ọ bụla. (Mak 9:33-37; 10:35-45; Jọn 13:2-17) Ị̀ na-egosi ndidi dị otú ahụ n’ebe nwunye gị nọ? Kama ime mkpesa banyere adịghị ike na-abịaghachi mgbe mgbe, ị na-eji ndidi gbalịa inyere ya aka ma ruo n’obi ya site n’ihe nlereanya gị? Ndị bụ́ nwunye yikarịrị ka ha ga-azaghachi n’ụdị ọmịiko ịhụnanya ahụ, dị ka ndị ozi ahụ mesịrị mee.

20. Gịnị ka ndị Kraịst bụ́ nwunye na-agaghị echezọ ma ọlị, ònyekwa ka e nyere dị ka ihe nlereanya maka ha?

20 Ọ dịkwa ndị bụ́ nwunye mkpa ịtụle Jisọs, onye na-echezọghị mgbe ọ bụla na “Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” O doro onwe ya n’okpuru Nna ya nke eluigwe mgbe nile. N’otu aka ahụ, ndị bụ́ nwunye ekwesịghị ichezọ na “nwoke bụkwa isi nke nwanyị,” ee, na di ha bụ isi ha. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Efesọs 5:23) Pita onyeozi gbara ndị nwunye bụ́ ndị Kraịst ume ka ha na-atụle ihe nlereanya nke “ndị inyom ahụ ndị dị nsọ” nke oge ochie, karịsịa nke Sera, onye “ṅara Abraham ntị, na-akpọ ya onyenwe ya.”—1 Pita 3:5, 6.

21. N’ihi gịnị ka alụmdi na nwunye nke Abraham na Sera ji gaa nke ọma ma nke Lọt na nwunye ya abụrụ ihe dara ada?

21 Ihe àmà na-egosi na Sera hapụrụ ebe obibi dị ntụsara ahụ n’obodo ukwu nwere ụba ihe onwunwe iji biri n’ụlọikwuu n’ala ọzọ. N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ n’ihi na o nwere mmasị n’ụzọ ndụ ahụ karị? O yighị otú ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi na di ya gwara ya ka ọ gaa? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a bụ otu n’ime ihe kpatara ya, ebe ọ bụ na Sera hụrụ Abraham n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù n’ihi àgwà Chineke ya. (Jenesis 18:12) Ma ihe bụ́ isi kpatara o ji soro di ya gaa bụ ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ na ọchịchọ sitere ya n’obi ịgbaso nduzi Chineke. (Jenesis 12:1) O nwetara obi ụtọ n’irubere Chineke isi. Nwunye Lọt, n’aka nke ọzọ, lara azụ ime ihe Chineke na-achọ wee si otú ahụ jiri oké ọchịchọ leghachi anya azụ n’ihe ndị ahụ a hapụrụ n’obodo ya nke bụ́ Sọdọm. (Jenesis 19:15, 25, 26; Luk 17:32) Lee njedebe dị mwute ọ bụ nye alụmdi na nwunye ahụ—nanị n’ihi nnupụisi ya nye Chineke!

22. (a) Nnyocha onwe onye dị aṅaa ka ndị òtù ezinụlọ ga-eji amamihe mee? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’ọmụmụ ihe anyị ọzọ?

22 Ya mere dị ka di ma ọ bụ nwunye, ọ dị oké mkpa na ị jụrụ onwe gị, sị, ‘Chineke ọ̀ na-ebute ụzọ n’ezinụlọ anyị? M̀ na-agbalịsi ike n’ezie ịrụzu òkè ezinụlọ nke Chineke nyeworo m? M̀ na-eme ezi mgbalị ịhụ onye òtù ọlụlụ m n’anya ma na-enyere onye ahụ aka inweta ma ọ bụ ịnọgide na-enwe ezi mmekọrịta n’ebe Jehova nọ?’ N’ihe ka n’ọtụtụ ezinụlọ e nwekwara ụmụaka. Ihe ọzọ anyị ga-atụle bụ òkè nke ndị nne na nna na mkpa ma ha ma ụmụ ha nwere ibute Chineke ụzọ.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Gịnị pụrụ ịbụ ihe ga-esi n’ozizi Jisọs apụtara ọtụtụ ezinụlọ?

◻ Ụgwọ ọrụ dị aṅaa ka ọtụtụ puku ndị Kraịst na-anọgidesi ike nwetaworo?

◻ Gịnị ga-enyere ndị òtù ọlụlụ aka izere omume rụrụ arụ na ịgba alụkwaghịm?

◻ Gịnị ka ndị bụ́ di pụrụ ịmụta site n’ihe nlereanya Jisọs?

◻ Olee otú ndị bụ́ nwunye pụrụ isi tụnye ụtụ n’alụmdi na nwunye obi ụtọ?

[Foto dị na peeji nke 10]

Olee otú Sera si tụnye ụtụ n’ihe ịga nke ọma nke alụmdi na nwunye ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya