Gịnị Ka Achụmnta Ego Gị Ga-efu Gị?
E BORO nwunye onye isi ala nke otu mba dị na South America ebubo ịwụnye ọtụtụ narị puku dollar n’ọrụ e nyere kọmpini aghụghọ dị iche iche ndị òtù ezinụlọ ya hiwere. E jidere otu oji ego achụ ego gbara 38 afọ n’India ma si n’ọmarịcha ụlọ ya na 29 ụgbọ ala ya kpụpụ ya n’ihi aka a sịrị na o tinyere n’omume ọjọọ metụtara $1.6 ijeri nke ego ụlọ akụ̀ na ahịa nta ego. Na Philippines, ọtụtụ puku ndị bi n’otu àgwàetiti na-enweta ihe ha ji ebi ndụ site n’imepụta égbè aka ndị iwu megidere. A kọrọ na iji nọgide n’ahịa a na-enye ego, ha na-enyekarị ndị isi ego aka azụ ka ha ghara itinye anya.
Ee, akwụwaghị aka ọtọ na aghụghọ n’achụmnta ego juru ebe nile gburugburu ụwa. Ọtụtụ mgbe kwa ọ na-efu ndị aka ha dị na ya ọkwá na nsọpụrụ, nakwa ego.
Gịnị banyere gị? Ị̀ na-achụ nta ego? Ka ị̀ na-eche banyere ịmalite otu ọrụ achụmnta ego? Gịnị ka ọ ga-efu gị? N’ụzọ a na-apụghị izere ezere ịchụ nta ego ga-efu ihe. Nke a abụchaghị ihe ọjọọ. Otú ọ dị, ọ bụ ihe amamihe ịgụkọ ihe ọ ga-efu tupu ị malite ọrụ ịchụ nta ego ma ọ bụ ime mkpebi banyere nke e hiwewororịị. (Luk 14:28) Igbe dị na peji nke 31 na-egosi ihe ụfọdụ ọ na-efu bụ́ ndị ị ga-achọ ichebara echiche.
N’ụzọ doro anya, ịchụ nta ego adịghị mfe. Nye onye Kraịst, e nwere ibu ọrụ ime mmụọ na ndị nke omume a ga-atụle. Ị̀ pụrụ ịnagide ihe ndị ọ ga-efu ma nọgide n’ezi nguzo ime mmụọ? Ihe ụfọdụ ọ ga-efu hà gabigara ihe ị pụrụ ịnakwere n’omume ọma? Olee ụkpụrụ ụfọdụ ga-enyere gị aka ikpebi mfu ndị a pụrụ ịnakwere na ndị a na-apụghị?
Debe Ego n’Ọnọdụ Ya
Ego dị mkpa iji na-achụ nta ego, e nwekwara olileanya na ọrụ ịchụ nta ego ga-ewebata ego zuru ezu mmadụ iji kwado ezinụlọ ya. Otú ọ dị, ọ dị mfe ihe mgbaru ọsọ banyere ego ịbụ nke gbagọrọ agbagọ. Anyaukwu pụrụ ịbata n’okwu. Nye ọtụtụ ndị, ihe nile ọzọ na-aga n’ụsọ ma okwu baa n’ego. Ma, otu onye so dee akwụkwọ Bible bụ́ Ilu, bụ́ Agụa, kwupụtara echiche nke ziri ezi mgbe ọ sịrị: “Enyela m ọnọdụ ogbenye ma ọ bụ akụ̀; mee ka m rie nri ruuru m.” (Ilu 30:8) Ọ ghọtara uru nke inwe afọ ojuju n’inwe ego zurunụ maka ihe ndị e ji akwado ndụ—ọ chọghị “igbu ozu,” dị ka ụfọdụ na-ekwu n’achụmnta ego.
Ma, anyaukwu pụrụ ime ka mmadụ chezọọ ụkpụrụ nke a mgbe ihe ahụ a na-akpọ ohere magburu onwe ya dapụtara. Otu onye ozi na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova n’otu mba na-emepe emepe kọrọ banyere otu okwu dị otú ahụ. Otu kọmpini na-achọ isi ego maka ọrụ nyere echiche nke na ndị tinyere ego ga-enweta ọmụrụ nwa okpukpu abụọ nke ego ha ngwa ngwa, ma eleghị anya n’ime nanị ọnwa ole na ole. Nkwa nke a nke inweta ego n’adọgbughị onwe onye n’ọrụ maka ya dubara ọtụtụ ndị n’itinye ego. Onye ozi ahụ na-ejegharị ejegharị sịrị: “Ọ dị ụfọdụ ọkụ n’obi nke ukwuu ịmabanye na ya. Ha ajụghị ajụjụ zuru ezu, ha bitekwara ego [iji tinye na ya].”
N’ụzọ dị iche, mmadụ abụọ gara inyocha ọfịs kọmpini ahụ tupu itinye ego. A jụrụ ọchịchọ ha ịhụ ihe ndị e ji emepụta ihe. Nke a mere ka ha nyoo ma kọmpini ahụ ọ̀ bụkwa nke ezigbo ya enyo. Ọ ghọrọ ihe nchebe nye ha, ebe ọ bụ na n’ime izu ole na ole, e kpughepụrụ atụmatụ doro anya na ọ bụ nke aghụghọ, e jidekwara ndị mmadụ. Cheedị nnọọ ihe o furu ndị na-ebughị ụzọ mee nnyocha. Ọ bụghị nanị ego, kamakwa ma eleghị anya ndị enyi ndị binyere ha ego ma a pụghị ikwughachi ha mgbe atụmatụ ahụ kụrụ afọ n’ala funahụrụ ha. N’okwu ego, lee ka o si bụrụ ihe amamihe itinye ụkpụrụ nke Ilu 22:3 n’ọrụ: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha”!
Rapagide n’Okwu Gị
Gịnị ma ọ bụrụ na ọrụ ịchụ nta ego agaghị nke ọma? Abụ Ọma 15:4 na-aja onye na-arapagide n’ihe o kwetara ọbụna ma ọ bụrụ na ime otú ahụ abaghịịrị ya uru: “Ọ ṅụwo iyi nke ga-emejọ ya onwe ya, ma ọ dịghị agbanwe okwu ya.” Ọ dị mfe mmadụ ịrapagide n’ihe o kwuru mgbe ihe na-aga nke ọma. Ma ọ na-aghọ ule nke iguzosi ike n’ezi ihe mgbe ọ bụ ihe na-abaghịrị mmadụ uru n’ụzọ ego.
Cheta otu ihe atụ Bible n’oge Joshua. Ndị Gibeọn rụrụgburu ọnọdụ ka ndị isi Israel wee soro ha gbaa ndụ ma ghara ibibi ha. N’ezie, ha bụ akụkụ nke mba e lere anya dị ka ihe iyi egwu nye Israel. Mgbe e kpughere aghụghọ ahụ, “ụmụ Israel etigbughị ha, n’ihi na ndị isi nzukọ Israel ewerewo Jehova, bụ́ Chineke Israel, ṅụọrọ ha iyi.” (Joshua 9:18) Ọ bụ ezie na ìgwè nke a sitere n’ókèala ndị iro, ndị isi ahụ lere ya anya dị ka ihe dị mkpa idebe okwu ha. Ihe ndị mesịkwara mee gosiri na nke a tọrọ Jehova ụtọ.—Joshua 10:6-11.
Ị̀ ga-arapagide ná nkwekọrịta gị dị iche iche n’ọrụ ịchụ nta ego na ọrụ ngo ọbụna ma ọ bụrụ na ihe agaghị otú ị tụrụ anya?a Ime otú ahụ ga-eme ka ị dịkwuo ka Jehova, onye na-arapagide n’okwu ya mgbe nile.—Aịsaịa 55:11.
Na-akwụwa Aka Ọtọ
Ịkwụwa aka ọtọ yiri ihe nọ n’ihe ize ndụ, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ihe pụworo n’anya, n’ụwa achụmnta ego nke taa. Ndị ọzọ nọ n’ọrụ ịchụ nta ego ndị yiri nke gị pụrụ iji ụzọ akwụwaghị aka ọtọ dị iche iche mụbaa ego ha na-arụta. Ha pụrụ ịdị na-arụ ụrụ ná mkpọsa ahịa. Ha pụrụ izuru aha kọmpini ọzọ ma dekwasị ya n’ihe ha mepụtara. Ma ọ bụ ha pụrụ iwepụta ngwá ahịa adịgboroja dị ka ọ bụ nke ọkpọka ya. Ihe ndị a nile bụcha ụdị nke akwụwaghị aka ọtọ. Ndị na-eme ha dị ka “ndị na-emebi iwu” ndị, dị ka Esaf kwuru, ‘meworo ka akụ̀ ha bukarịa ibu,’ n’ụzọ aghụghọ dị ka ihe àmà na-egosi.—Abụ Ọma 73:12.
Dị ka onye Kraịst, ị̀ ga-eji ụzọ ndị iwu na-akwadoghị mee ihe? Ka ụkpụrụ dị iche iche nke Bible hà ga-eduzi gị, ndị dị ka: “Anyị emeghị onye ọ bụla ajọ omume, anyị emebighị onye ọ bụla, anyị erigbughị onye ọ bụla”; “anyị jụrụ ihe nzuzo nile nke na-eweta ihere, anyị adịghị ejegharị n’aghụghọ”; “ihe arụ n’anya Jehova ka ụzọ nkume isì ihe abụọ bụ; ihe ósìsì aghụghọ adịghịkwa mma”? (2 Ndị Kọrint 4:2; 7:2; Ilu 20:23) Cheta, onye mmalite nke akwụwaghị aka ọtọ abụghị onye ọzọ e wezụga Setan Ekwensu, ‘nna ụgha.’—Jọn 8:44.
Ụfọdụ pụrụ ịgbagha ya ma sị: ‘O siri ike ịnọgide n’ọrụ ịchụ nta ego ọ gwụla ma mmadụ ò jiri ụzọ akwụwaghị aka ọtọ dị iche iche mee ihe dị ka ndị ọzọ na-eme.’ Nke a bụ ebe onye Kraịst pụrụ igosipụta okwukwe ya na Jehova. A na-etinye ịkwụwa aka ọtọ n’ule mgbe ọ na-efu ihe. Ịsị na mmadụ apụghị inweta ihe e ji ebi ndụ n’aghọghị aghụghọ bụ ikwu na Chineke adịghị elekọta ma na-enye ndị hụrụ ya n’anya ihe na-akpa ha. Onye nwere ezi okwukwe na Jehova maara na Chineke pụrụ inye ndị ohu ya ná mba ọ bụla na n’ọnọdụ ọ bụla ihe na-akpa ha. (Ndị Hibru 13:5) N’eziokwu, mmadụ pụrụ inwe afọ ojuju n’inweta ego dịtụ nta karịa otú ndị na-adịghị akwụwa aka ọtọ pụrụ inweta, ma ọ̀ bụ na nke a abụghị ụgwọ ruru eru ịkwụ iji nwee ngọzi Chineke?
Cheta, akwụwaghị aka ọtọ na-eme dị ka ihe ọ bịara egbu m gbuo onwe ya. Ọ bụrụ na a chọpụta na onye na-achụ nta ego adịghị akwụwa aka ọtọ, ndị ahịa na ndị na-ebute ahịa ọtụtụ mgbe ga-agbahapụ ya. Ọ pụrụ ịghọgbu ha otu ugbo, ma nke ahụ pụrụ ịbụ nke ikpeazụ ya. N’aka nke ọzọ, onye na-achụ nta ego nke na-akwụwa aka ọtọ na-enwetakarị nkwanye ùgwù nke ndị ọzọ. Lezie anya ka a ghara ịghọgbu gị site n’echiche ụgha bụ́, ‘Ndị ọzọ nile na-eme ya, ya mere nsogbu adịghị ya.’ Ụkpụrụ Bible bụ, “Esola ọtụtụ mmadụ n’azụ baa n’ihe ọjọọ dị iche iche.”—Ọpụpụ 23:2.
Ka e were ya na onye gị na ya na-achụkọ nta ego abụghị onye Kraịst ibe gị, ọ dịghịkwa arapagidekarị n’ụkpụrụ Bible. Ọ̀ ga-ekwesị ekwesị iji nke a mee ihe dị ka ihe ngọpụ ịhapụ ibu ọrụ nke gị mgbe a na-eme ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị? Cheta ihe atụ ndị dị ka Adam na Sọl. Kama izere mmehie, ha dabara ná nrụgide sitere n’aka ndị ọzọ wee tazie ndị ọ bụ ha na ha ụta. Lee aha ụgwọ dị elu ha kwụrụ!—Jenesis 3:12, 17-19; 1 Samuel 15:20-26.
Mesoo Ndị Kwere Ekwe Ibe Gị n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
È nwere mfu ndị a ga-atụle mgbe e so onye anyị na ya na-efekọ Jehova banye n’ọrụ ịchụ nta ego? Mgbe Jeremaịa onye amụma zụtara otu ibe ala n’ala nna ya bụ́ Anatọt site n’aka nwanne nna nke ya, o nyeghị ya nanị ego ma kwe ya n’aka. Kama nke ahụ, ọ sịrị: “M wee dee aha m n’akwụkwọ ala ahụ, kaa ya akara, kpọọ ndị àmà, tụọrọ ya ego ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.” (Jeremaịa 32:10) Ime nkwekọrịta dị otú ahụ e dere ede pụrụ igbochi nghọtahie ndị pụrụ ibilite n’oge dị n’ihu ma ọnọdụ gbanwee.
Ma gịnị ma ọ bụrụ na o yie ka nwanna bụ́ onye Kraịst ò mesowo gị ihe n’ụzọ na-ezighị ezi n’ọrụ ịchụ nta ego? Ì kwesịrị ịkpụga ya ụlọikpe? Bible doro nnọọ anya na nke a. “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu, ma a sị na o nwere okwu megide ibe ya, nwere anyaike ije ikpe n’ihu ndị ajọ omume, ma ọ bụghị n’ihu ndị nsọ?” ka Pọl jụrụ. Gịnị ma ọ bụrụ na e dozighị otu okwu n’ụzọ na-eju afọ ozugbo ahụ? Pọl gbakwụnyere: “Ezie ọ bụ nnọọ ịla ala n’ebe unu nọ ọbụna ugbu a, na unu nwere okwu ikpe n’etiti onwe unu. Karị nke ahụ, n’ihi gịnị unu adịghị ekwe ka e megide unu ajọ omume? karị nke ahụ, n’ihi gịnị unu adịghị ekwe ka e megbuo unu?” Cheedị nnọọ echiche unyi ọ ga-ete nzukọ ndị Kraịst ma ọ bụrụ na ndị nọ n’èzí anụ banyere ezi ndị Kraịst iserịta okwu n’ụlọikpe! Ọ̀ pụrụ ịbụ na n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ ịhụnanya ego esiwo ike karịa ịhụnanya maka nwanna? Ka ọ̀ pụrụ ịbụ na nsọpụrụ onwe onye abụwo nke e tetọrọ, mmegwara abụrụkwa ihe kasị dịrị n’uche? Ndụmọdụ Pọl na-egosi na n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ ọ ga-aka mma ịnakwere mfu kama ịga ụlọikpe.—1 Ndị Kọrint 6:1, 7; Ndị Rom 12:17-21.
Ma, e nwere ụzọ Akwụkwọ Nsọ e si dozie esemokwu ndị dị otú ahụ n’ime ọgbakọ. (Matiu 5:37; 18:15-17) N’inyere ụmụnna o metụtara aka ịgbaso nzọụkwụ ndị a tụrụ aro ha, ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst pụrụ inye ndụmọdụ ndị na-enye aka maka ndị nile o metụtara. Ọ pụrụ iyi ihe dị mfe n’oge nkwurịta okwu ndị dị otú ahụ ikwenyere ụkpụrụ Bible, ma mgbe e mesịrị ị̀ ga-egosi n’ezie na i gere ntị site n’itinye ndụmọdụ e nyere n’ọrụ? Ịhụnanya maka Chineke na maka ndị Kraịst ibe anyị ga-akpali anyị ime otú ahụ.
Ihe ịrụ ụka adịghị ya, ịnọ n’ọrụ ịchụ nta ego ga-efu gị ihe. E nwere olileanya na ihe ị ga-akwụ bụ ihe ezi uche dị na ya. Mgbe mkpebi ma ọ bụ ọnọdụ ndị na-edoghị anya na-eche gị ihu, buru n’uche na e nwere ọtụtụ ihe ná ndụ ndị dị mkpa nke ukwuu karịa ego. Site n’idebe ego n’ọnọdụ ya, mmadụ idebe okwu ya, ịkwụwa aka ọtọ, na imeso ndị anyị na ha na-achụkọ nta ego n’ụzọ ndị Kraịst, anyị pụrụ ịhụ na ọrụ ịchụ nta ego agaghị efu oge na ego karịa ka ọ dị mkpa, n’otu oge ahụkwa, anyị pụrụ ịnọgide na-enwe ezi ọbụbụenyi, akọ na uche dị mma, na ezi mmekọrịta anyị na Jehova n’otu oge ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ihe atụ nke oge a nke mmadụ ịrapagide n’okwu ya n’ọrụ ịchụ nta ego, lee isiokwu bụ́ “Okwu M Ihe Ndabere M” na Teta! (Bekee) nke May 8, 1988, peji nke 11-13.
[Igbe dị na peeji nke 31]
Ihe Dị Iche Iche Achụmnta Ego Gị Pụrụ Ifu Gị
Oge: N’ihe dị ka n’oge nile, ilekọta ọrụ ịchụ nta ego onwe onye na-ewe oge dị ukwuu karịa ịrụ ọrụ dị ka onye kọmpini were n’ọrụ. Nke a ọ̀ ga-emetụta usoro ihe omume gị, na-ahapụ oge dị nta karị maka ihe omume ime mmụọ ndị dị mkpa? N’akụkụ nke dị mma, ị̀ ga-enwe ike ịhazi ihe ndị ị na-eme iji tinyekwuo oge n’ime uche Chineke? Ọ bụrụ otú ahụ, nke ahụ dị mma. Ma lezie anya! Nke a na-aka mfe n’ọnụ.
Ego: Ọ na-ewe ego iji kpata ego. Gịnị ka a chọrọ ka e tinye maka ọrụ ịchụ nta ego gị? Ì nweworị ego ya? Ka ọ̀ ga-adị mkpa ka i bie ego? Ị̀ pụrụ ịnagide ego ụfọdụ ifunahụ gị? Ka ihe ọ ga-efu gị ọ̀ ga-akarị ihe ị pụrụ idili ma ọ bụrụ na ihe agazighị dị ka a tụrụ anya ya?
Ndị Enyi: N’ihi nsogbu ndị na-ebilite n’ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị, ọtụtụ ndị na-achụ nta ego abụwo ndị achụmnta ego ha furu ha ndị enyi ha. Ọ bụ ezie na e nwere ohere ime ndị enyi, ohere nke mmekọrịta ndị na-adịghị aga were were dị nnọọ ukwuu. Gịnị ma ọ bụrụ na ndị enyi ndị a bụ ụmụnna anyị ndị Kraịst?
Akọ na Uche Dị Mma: Usoro a na-ejikarị eme ihe n’achụmnta ego nke ụwa taa bụ “Ike keta o rie” ma ọ bụ “Uru ọ̀ dịkwa ya?” Ihe karịrị 70 pasent nke ụmụ akwụkwọ n’otu nnyocha e mere na Europe kwusiri ike na àgwà ọma enwekebeghị ọnọdụ ná ndụ achụmnta ego. Ka a sịkwa ihe mere aghụghọ, akwụwaghị aka ọtọ, na omume ndị a na-enyo enyo n’achụmnta ego jiworo ghọọ ihe juru ebe nile. À ga-anwa gị ọnwụnwa ịgbaso ụzọ ahụ?
Mmekọrịta Gị na Jehova: Ihe omume ọ bụla n’achụmnta ego bụ́ nke megidere iwu na ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke, ọ bụrụgodị na ọ bụ omenala n’achụmnta ego, ga-emebi mmekọrịta mmadụ na Onye Mere ya. Nke a pụrụ ifu ya olileanya ya nke ndụ agwụghị agwụ. Nke a ọ̀ gaghị abụ kpọmkwem ụgwọ dị elu gabiga ókè ịkwụ nye onye Kraịst na-anọgidesi ike n’ihe, n’agbanyeghị uru ihe onwunwe ọ bụla?
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Olee nke ga-enye aka igbochi nghọtahie n’ọdịnihu? Nkwekọrịta ọnụ efu ka ọ bụ nkwekọrịta e dere ede?