Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 8/15 p. 26-29
  • Ị̀ Gụwo Ihe Ọ Ga-efu Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Gụwo Ihe Ọ Ga-efu Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Karịrị Echiche Nkịtị
  • Echiche Ziri Ezi
  • Ezi Amamihe Ihe Nchebe
  • Rite Uru Site n’Ịgbaso Ụkpụrụ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Olee Otú Ntụkwasị Obi I Nwere Na Chineke Siruru N’ike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Na-eme Mkpebi Ziri Ezi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • “Jehova Na-enye Amamihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 8/15 p. 26-29

Ị̀ Gụwo Ihe Ọ Ga-efu Gị?

“EWO! Ị̀ jụrụ ịnara onyinye ọma dị otú ahụ?” O siiri onye nlekọta ahụ ike ikweta ihe ọ nụrụ ugbu a. Onye na-esote ya, bụ́ nwanyị nke a na-akwanyere ùgwù maka nkà ya na àgwà ọma ya, ajụwo ịnara onyinye nke ịga gụọ akwụkwọ n’ofesi ruo afọ abụọ n’ego ụlọ ọrụ. N’ihi gịnị ka o ji mee otú ahụ?

Ịnara onyinye ahụ, ka nwanyị ahụ kọwara, ga-apụta ikewapụ onwe ya n’ebe di ya na ụmụ ya abụọ nọ ruo afọ abụọ. Agụụ ha ga-agụ ya nke ukwuu. Karịsịa, ọ gajekwa ileghara ọrụ Chineke nyeworo ya dị ka nwunye na onye bụ nne anya. Ihe ọ ga-efu ya ná mmetụta uche nakwa n’ime mmụọ ga-abụ ụgwọ dị elu ịkwụ. Otú a, mgbe ọ gụsịrị ihe ọ ga-efu ya, o kpebiri na ya agaghị anara onyinye ahụ.

Gịnị ka ị ga-emeworị ma ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ ya? O doro anya na ọ bụghị mmadụ nile ga-ekwenye ná mkpebi nke onye inyom nke a bụ́ onye Kraịst mere. Ụfọdụ, dị ka ndị ọrụ ibe ya, pụrụ iche na ọ bụpụrụ nnu e tinyere ya n’ọnụ iji gaa n’ihu n’ọrụ ya. Ndị ọzọ pụrụ ọbụna ibo ya ebubo na o cheghị echiche banyere ọdịnihu nke ezinụlọ ya, n’ihi na, e kwuwerị, afọ abụọ ga-agabiga ngwa ngwa. Ma, mkpebi ya abụghị nke mkpali ma ọ bụ nke echiche nkịtị. Ọ dabeere ná ntụgharị uche ziri ezi na n’ụkpụrụ ezi uche dị na ha. Gịnị ka ihe ndị a bụ?

Ihe Karịrị Echiche Nkịtị

Nwoke kasị mara ihe nke biworo n’elu ala, bụ́ Jisọs Kraịst, nyere ntụziaka n’otu n’ime ilu ya. “Ònye n’ime unu, nke na-achọ iwu ụlọ elu, na-ebughị ụzọ nọdụ ala gụọ ego ọ ga-ewe, ma ò nwere ego ọ ga-eji rụzuo ya?” ka Jisọs jụrụ. “Ka ndị nile ndị na-ahụ ya wee ghara ịmalite ime ya ihe ọchị ma eleghị anya, mgbe ọ tọsịrị ntọala ya, ma o nweghị ike iwuzu ya, sị, Nwoke a malitere iwu ụlọ, ma o nweghị ike ịrụzu ya.”—Luk 14:28-30.

Onye ọ bụla ga-ekwenye na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịgụ ihe ọ ga-efu tupu e kpebie ime ihe ọ bụla dị mkpa. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịzụ ụlọ, ọ̀ ga-eji ọsọ ọsọ bịanye aka n’akwụkwọ n’emeghị ọbụna nchọpụta banyere ọnụ ahịa ya, jidekwa n’aka na ego o nwere ga-ezu iji kwụzuo ụgwọ ụlọ ahụ? A ga-ele ya anya dị ka onye nzuzu n’ezie ma ọ bụrụ na o mee ihe dị otú ahụ. Ee, ọ bụ mmadụ iji echiche nkịtị mee ihe ịgụ ihe ọ ga-efu ya tupu ọ malite ime ihe ọ bụla.

Otú ọ dị, gịnị n’ezie bụ isi ihe Jisọs na-ekwu n’ilu ahụ? Kpọmkwem tupu o webata ilu ahụ, ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-adịghị eburu osisi ịta ahụhụ ya wee na-eso m n’azụ apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.” (Luk 14:27, NW) Otú a, ihe a na-atụle na-egosi na Jisọs adịghị enye ndụmọdụ metụtara echiche nkịtị maka ihe nkịtị ndị a na-eme kwa ụbọchị. Kama nke ahụ, ọ na-ekwu banyere ịgụ ihe ọ ga-efu n’ihe ndị metụtara ịghọ onye na-eso ụzọ ya.

Site n’ilu ya, Jisọs rụtụrụ aka na ịghọ onye na-eso ụzọ ya gụnyere ime mgbanwe na ịchụ àjà. N’ihi gịnị? N’ihi na usoro ihe dị ugbu a hụrụ ihe onwunwe n’anya, bụrụkwa nke ọdịmma onwe onye na-akpali. Ihe ka ọtụtụ na-echegbu onwe ha n’ụzọ bụ isi banyere imezu ọchịchọ anụ ahụ ha, n’echeghị echiche ọ bụla banyere mkpa ime mmụọ ha ma ọ bụ mmekọrịta ha na Chineke. (2 Timoti 3:1-4) Otú ọ dị, àgwà ma ọ bụ mmụọ nke a megidere kpọmkwem nke ahụ Jisọs Kraịst gosipụtara. “Nwa nke mmadụ abịaghị,” ka o kwuru, “ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” Ọ tụkwasịrị abamuru kasị dị elu n’ihe ime mmụọ kama ịbụ n’ihe onwunwe mgbe ọ sịrị: “Ọ bụ mmụọ na-eme ka mmadụ dị ndụ; anụ ahụ abaghị uru ọ bụla.”—Matiu 20:28; Jọn 6:63.

N’ihi nke ahụ, mgbe Jisọs nyere ndị ahụ chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ịgụ ihe ọ ga-efu ha, ihe ọ na-ekwu n’ụzọ bụ isi abụghị maka uru ihe onwunwe, kama maka nke ime mmụọ. Gịnị bụ ihe dị mkpa karị nye ha, ọ̀ bụ uru ihe onwunwe nke ụwa nwere inye ka ọ̀ bụ abamuru ime mmụọ nke ịbụ onye na-eso ụzọ na-enye? Nke a mere na mgbe ọ tụsịrị ilu ahụ na nke yiri ya, o kwubiri, sị: “Otú a, onye ọ bụla n’ime unu nke na-agbakụtaghị ihe nile o nwere azụ, ọ pụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.” (Luk 14:33) Onye ahụ gaje ịbụ onye na-eso ụzọ ò nwere ọchịchọ ma dị njikere ịchụ àjà dị otú ahụ, ka ọ̀ bụ ụgwọ dị elu ịkwụ?

Echiche Ziri Ezi

Ọ bụ ezie na na ihe onwunwe pụrụ iweta abamuru ndị pụtara ìhè nke na-apụta ngwa ngwa nakwa ozugbo karị, abamuru ndị sitere ná nchụso ime mmụọ na-adịgide adịgide ma na-eju afọ karị. Jisọs tụgharịrị uche otú a, sị: “Unu akpadola akụ n’ụwa nye onwe unu, ebe nla na nchara na-erichapụ, ebe ndị ohi na-egwupukwa na-ezukwa ohi: kama kpadonụ akụ n’eluigwe nye onwe unu, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ, ebe ndị ohi na-adịghị egwupukwa, ha adịghị ezukwa ohi.” (Matiu 6:19, 20) N’oge anyị a, ịrị elu nke ọnụ ahịa, ụkọ nke ngwá ahịa, ndakpọ nke ụlọ akụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ, akpatawo mbibi nke ọtụtụ ndị tụkwasịrị obi ha kpam kpam n’akụ nke ihe onwunwe. Ma Pọl onyeozi na-agba anyị ume ka anyị ‘ghara ile ihe a na-ahụ anya, kama ihe a na-adịghị ahụ anya: n’ihi na ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge; ma ihe a na-adịghị ahụ anya dị ebighị ebi.’ (2 Ndị Kọrint 4:18) Otú ọ dị, olee ụzọ anyị pụrụ isi zụlite echiche dị otú ahụ?

Anyị pụrụ ime otú ahụ site n’iṅomi Ihe Atụ na Ihe Nlereanya anyị, bụ́ Jisọs Kraịst. Mgbe ọ nọ n’elu ala, ọ bụghị onye na-anapụ onwe ya ihe ụtọ nile ma ọlị, dị ka a na-egosipụta site n’eziokwu ahụ bụ na mgbe ụfọdụ o keere òkè n’oriri agbamakwụkwọ na oriri dị iche iche. Otú ọ dị, o doro anya na o mere ihe ime mmụọ ihe ndị ọ na-ebutere ụzọ. Iji wee mezuo uche Nna ya, ọ dị njikere ịhapụ ọbụna ihe ndị e lere anya dị ka ihe ndị dị mkpa. O kwupụtara n’otu mgbe, sị: “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ha na-edina, anụ ufe nke eluigwe nwekwara ebe ha na-arahụ ụra; ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ịtọgbọ isi ya.” (Luk 9:58) O lere ime uche Nna ya anya dị ka ihe dị oké mkpa na ihe dị ụtọ nke na o kwuru site n’obi ziri ezi, sị: “Ihe oriri m bụ ka m na-eme ihe onye zitere m na-achọ, ka m rụzuokwa ọrụ ya.”—Jọn 4:34.

Jisọs gosipụtara ihe ndị ọ gụrụ n’ihe dị mkpa site n’ụzọ o si jụ ọnwụnwa nile nke Setan. Ekwensu gbalịrị ime ka Jisọs jiri ike Chineke nyeworo Ya mee ihe ga-abara Ya uru, iji gboo mkpa anụ ahụ Ya, na iji nweta oké aha na ịbụ onye a ma ama n’ụwa. Jisọs maara nke ọma na a pụrụ inweta abamuru ndị dị otú ahụ a na-enyo enyo nanị n’ọnụ ahịa dị oké elu—enweghị nnwapụta Chineke—ọnụ ahịa nke karịrị ihe ọ dị njikere ịkwụ, n’ihi na ọ gụrụ mmekọrịta nke ya na Nna ya n’ihe dị oké ọnụ ahịa karịa ihe ọ bụla ọzọ. Nke ahụ mere o ji jụ onyinye nile nke Setan n’enweghị obi abụọ, n’egbughị oge ọ bụla.—Matiu 4:1-10.

Dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, n’ezie anyị chọrọ inwe otu ụdị mmasị ndị ahụ nke Onyenwe anyị nwere. N’ime usoro ihe dị ugbu a nke dị n’okpuru ike Setan, ọ dị ọtụtụ ihe pụrụ iyi ka hà ga-eweta ezi abamuru ma bụrụ ndị pụrụ n’ezie imebi mmekọrịta anyị na Chineke. Ihe ndị dị ka ịrịgo n’ọkwá ọrụ, ịchụso agụmakwụkwọ dị elu iji nwee ọganihu n’ọnọdụ mmadụ, isoro onye na-ekweghị ekwe na-eme mbedó, ma ọ bụ itinye aka n’ụkpụrụ azụmahịa ndị a na-enyo enyo pụrụ iduga n’okwukwe mmadụ ifunarị ya n’ụzọ dị mfe nakwa n’imesị dapụ n’ihu ọma nke Jehova. Anyị aghaghị iji nlezianya gụọ ihe ọ ga-efu anyị mgbe ọnwụnwa ndị dị otú ahụ chere anyị ihu.

Ezi Amamihe Ihe Nchebe

N’afọ ole na ole gara aga, otu onye Kraịst bụ́ nwa okorobịa bi n’otu nnukwu obodo dị n’Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nwere ohere ịga ofesi ịgụkwu akwụkwọ. Ọ bụ ezie na o nwewo agụmakwụkwọ ụwa dị mma na ọrụ nke a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ, o chere na nke a ezubeghị; ọ chọrọ ime ka ọnọdụ ya ná ndụ dị mma karị. Ndị Kraịst ibe ya gbalịrị iso ya tụgharịa uche n’ikwekọ n’isi ihe ndị dị n’Akwụkwọ nsọ nke anyị tụleworo ugbu a, ma ọ gbanweghị, ọ gakwara n’ihu n’atụmatụ ahụ. Ọ bụ ezie na ọ gbalịrị ijigide okwukwe ya na mbụ, nwayọọ nwayọọ ọ kwụsịrị inwe ekele maka eziokwu Bible, ọ malitekwara inwe obi abụọ. N’ime nanị otu afọ ma ọ bụ karịa, okwukwe ya nwụrụ kpam kpam, o wee kwuo na ya bụ onye na-amaghị Chineke. N’ikwu eziokwu, inweta akara mmụta dị elu karị site n’agụmakwụkwọ ụwa dị elu wetaara ya ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke afọ ojuju. Ma n’ihi na ọ bụ ebube na-adịru nwa oge, lee aha oké ụgwọ ọ kwụrụ—ndakpọ nke okwukwe na ihe ize ndụ nke ịtụfu ndụ ebighị ebi!—1 Timoti 1:19.

N’aka nke ọzọ, ndị na-ajụ ikwere ka ihe ọ bụla tinye mmekọrịta ha na Chineke n’ihe ize ndụ enwetawo ngọzi dị ukwuu site n’aka Jehova.

Otu ihe atụ bụ nke otu nwa okorobịa nwere ụlọ ọrụ na-achọ ime ụlọ mma n’otu nnukwu obodo ahụ e zoro aka na ya n’elu. Nanị n’ime ọnwa ole na ole mgbe ọ malitesịrị iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, otu onyinye na-etinye mmadụ n’ọnwụnwa chere ya ihu—ịrụ ọrụ ndozigharị ga-enye ya $30,000. Otú ọ dị, ọ ga-emetụta izere ịrapara n’ụkpụrụ na ntụziaka dị iche iche nke ihe owuwu iji wee wuo otu ihe owuwu megidere iwu. Ebe ọ bụ na ọ mụtawo na ndị Kraịst aghaghị ịbụ ndị na-erube isi n’iwu, ọ matara na ịnakwere ọrụ ahụ pụrụ ịpụta enweghị ihu ọma Chineke. (Ndị Rom 13:1, 2) Mgbe ọ tụlesịrị okwu ahụ nke ọma, ọ jụrụ ịnara ọrụ ahụ. Gịnị si n’ime ya pụta? Omume nke a chọrọ okwukwe ghọrọ oké mgbanwe n’ọganihu ime mmụọ ya. N’ime otu afọ ahụ, o nwere ọganihu ruo n’ókè nke ime nraranye na baptism. O rere ụlọ ọrụ ya wee nweta ọrụ nke nyere ya ohere itinyekwu oge ná nchụso nke ihe ime mmụọ. Ugbu a o ji ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi.

Ụmụ okorobịa abụọ ndị a gụrụ ihe ọ ga-efu ha. Gịnị bụ ọdịiche dị n’ihe ha họọrọ? Amamihe Chineke! N’ụzọ dị aṅaa? Amamihe bụ inwe ikike iji ihe ọmụma mee ihe n’ụzọ nke na-ewetakarị abamuru na-adịgide adịgide, amamihe Chineke pụtakwara iji ihe ọmụma mee ihe n’ikwekọ ná nzube Chineke maka anyị. Ọ bụ ezie na ụmụ okorobịa abụọ ahụ nwere ihe ọmụma ụfọdụ nke Bible, ụzọ ha si jiri ya mee ihe rụpụtara ihe dị iche iche. Akwụkwọ Ilu na-asị: “Amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ; izuzu ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị: ịnapụta gị n’ụzọ onye ọjọọ.”—Ilu 2:10-12.

Okwu Chineke, bụ́ Bible, bụ isi iyi nke ezi amamihe nke ị pụrụ ịnọgide na-echigharịkwuru maka nduzi mgbe ị ga-eme mkpebi ndị dị mkpa. Kama ịbụ onye maara ihe n’anya gị onwe gị, ṅaa ntị ná ndụmọdụ ahụ bụ: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.” (Ilu 3:5, 6) Anyị aghaghị ịdị umeala n’obi ma dị njikere ịbụ ndị e ziri ihe, na-ezere inwe ọchịchọ onwe anyị na mmụọ nnwere onwe nke ụwa nke jupụtara n’ebe nile n’oge a.

Ee, anyị apụghị izere ịghọrọ mkpụrụ anyị kụrụ, ọ bụkwa nnọọ ihe dị mma na ihe ziri ezi na anyị ga-anakwere ihe ndị si ná mkpebi na nhọrọ ndị anyị mere pụta. (Ndị Galetia 6:7, 8) Ya mere gụọ ihe ọ ga-efu gị tupu i mee ihe ọ bụla. Ekwela ka ihe ọ bụla yiri abamuru napụ gị ihe ime mmụọ gị ma ọ bụ mmekọrịta gị na Jehova Chineke. Kpee ekpere maka amamihe na ezi echiche iji mee mkpebi ndị ziri ezi, n’ihi na mkpebi ndị ị na-eme ugbu a pụrụ igosi ma ị̀ ga-adị ndụ ma ị̀ ga-anwụ anwụ—ruo mgbe ebighị ebi!—Tụlee Deuterọnọmi 30:19, 20.

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Ọ̀ ga-edebe ihe omume ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ka ọ̀ bụ ọrụ ego?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya