-
“Jehova, Chineke nke Nwere Obi Ebere, Onye Na-eme Amara”Ụlọ Nche—1998 | Ọktoba 1
-
-
15-17. (a) Olee otú nna ahụ si meghachi omume mgbe ọ hụrụ nwa ya? (b) Gịnị ka uwe mwụda, mgbaaka, na akpụkpọ ụkwụ ndị nna ahụ wetaara nwa ya na-anọchi anya ha? (ch) Gịnị ka e gosipụtara site ná nna ahụ ime ndokwa maka oriri?
15 “Ma mgbe ọ nọ n’ebe dị anya ugbu a, nna ya hụrụ ya, o wee nwee ọmịiko n’ahụ ya, gbaa ọsọ, makụọ ya n’olu, sutukwa ya ọnụ nke ukwuu. Nwa ya wee sị ya, Nna, emehiewo m megide eluigwe, na n’ihu gị: ekwesịghị m ka a kpọọkwa m nwa gị ọzọ. Ma nna ya sịrị ndị ohu ya, Chịpụta uwe mwụda nke kachasị mma ọsọ ọsọ, were ya yikwasị ya; tinyekwa mgbaaka n’aka ya, na akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ ya: sekpụtakwa nwa ehi a zụrụ azụ, gbuo ya, ka anyị riekwa, ka obi tọọkwa anyị ụtọ: n’ihi na nwa m nke a nwụrụrịị anwụ, o wee dị ndụ ọzọ; o fururịị efu, e wee hụ ya. Ha wee malite ime ka obi tọọ ha ụtọ.”—Luk 15:20-24.
-
-
“Jehova, Chineke nke Nwere Obi Ebere, Onye Na-eme Amara”Ụlọ Nche—1998 | Ọktoba 1
-
-
17 Mgbe nna ahụ jekwutere nwa ya nwoke, ọ makụrụ nwa ya nwoke n’olu, sutukwa ya ọnụ nke ukwuu. O nyeziri ndị ohu ya iwu ka ha wetara nwa ya nwoke uwe mwụda, mgbaaka, na akpụkpọ ụkwụ. Uwe mwụda a abụghị ákwà ọnụ ala nkịtị, kama “nke kachasị mma”—ma eleghị anya uwe a chọrọ mma nke ukwuu, ụdị nke a na-enye onye ọbịa a na-asọpụrụ. Ebe ọ bụ na a dịghị ahụkarị mgbaaka na akpụkpọ ụkwụ n’ahụ ndị ohu, nna ahụ na-eme ka o doo anya na a na-anabataghachi nwa ya nwoke dị ka onye òtù ezinụlọ ahụ n’ụzọ nile. Ma nna ya ka mekwuru ihe. O nyere iwu ka e mee oriri iji mee ememe nlọghachi nke nwa ya nwoke. N’ụzọ doro anya, nwoke a agbagharaghị nwa ya nwoke n’ụzọ ibu ihe n’obi ma ọ bụ nanị n’ihi na nlọghachi nwa ya nwoke manyere ya ime otú ahụ; ọ chọrọ ịgbaghara. O mere ya obi ụtọ.
-