Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Na-achọ Ezigbo Akụ̀
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Julaị
    • 4, 5. (a) Gịnị mere onye ahụ na-elekọta ụlọ Jizọs ji nye ihe atụ? (b) Olee ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya?

      4 Gụọ Luk 16:​1-9. Ihe atụ ahụ Jizọs nyere gbasara onye na-elekọta ụlọ bụ́ onye ajọ omume kwesịrị ime ka anyị chee echiche. Mgbe e boro onye ahụ ebubo na ọ na-ala ego nna ya ukwu n’iyi, o mere ihe gosiri na o nwere “ezi amamihe.” O ‘metara ndị enyi’ ga-enyere ya aka ma a chụọ ya n’ọrụ.a Ma, Jizọs ekwughị ihe a ka ọ kụziere ndị na-eso ụzọ ya ime ihe na-adịghị mma ka agụụ ghara igbu ha n’ụwa a. O kwuru na ụdị ihe ahụ bụ omume “ụmụ nke usoro ihe a.” Ma, e nwere ihe o ji ihe atụ ahụ na-akụziri ha.

      5 Jizọs ma na otú ahụ ihe si siere onye ahụ na-elekọta ụlọ ike ka ọ ga-esikwara ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya ike ịkpata ihe ha ga-eri n’ụwa a ọtụtụ ndị na-anaghị akwụwa aka ọtọ. Ọ bụ ya mere o ji sị ha: “Jirinụ akụ̀ ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ, mgbe akụ̀ dị otú ahụ na-adịkwaghị, ha ewee nabata unu n’ebe obibi ebighị ebi.” Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe a Jizọs kwuru?

      6. Olee otú anyị si mara na achụmnta ego ụwa a esoghị n’ihe Chineke bu n’obi kee ụwa?

      6 Ọ bụ eziokwu na Jizọs ekwughị ihe mere o ji sị na akụ̀ bụ “akụ̀ ajọ omume,” Baịbụl mere ka o doo anya na ịchụ ego esoghị n’ihe Chineke bu n’obi kee ụwa. Jehova nyere Adam na Iv ihe niile ha chọrọ n’Iden. (Jen. 2:​15, 16) Mgbe Chineke mechara nye ndị e tere mmanụ mmụọ nsọ n’oge ndịozi Jizọs, ‘ọ dịghị otu onye na-ekwu na nke ọ bụla n’ime ihe ndị o nwere bụ nke ya; kama ha nwekọrọ ihe niile ọnụ.’ (Ọrụ 4:32) Aịzaya onye amụma kwuru na n’ọdịnihu, mmadụ niile ga-eji akụ̀ ndị dị n’ụwa a na-ekpori ndụ. (Aịza. 25:​6-9; 65:​21, 22) Ka ọ dị ugbu a, “ezi amamihe” ga-enyere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka iji “akụ̀ ajọ omume” dị n’ụwa a na-enweta ihe ha ga-eri ma na-agbalịsi ike ime ihe dị Chineke mma.

  • Na-achọ Ezigbo Akụ̀
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Julaị
    • 7. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere na Luk 16:​10-13?

      7 Gụọ Luk 16:​10-13. Onye ahụ na-elekọta ụlọ Jizọs kwuru okwu ya metara ndị enyi ọ ga-erite ihe n’aka ha. Ma, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha meta ndị enyi n’eluigwe, ma ọ bụghị maka ihe ha ga-erite. Ihe ndị o kwuru mgbe o nyechara ihe atụ ahụ gosiri otú mmadụ ịtụkwasị Chineke obi si gbasa ihe o ji “akụ̀ ajọ omume” eme. Ihe Jizọs na-ekwu bụ na anyị ‘ga-ekwesịli ntụkwasị obi’ n’ihe anyị ji akụ̀ ahụ eme ma anyị kpata ya. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya