-
Ọnọdụ Ọgaranya ahụ na Lazarọs AgbanweeJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Jizọs meere ha ihe atụ, sị: “Otu nwoke bara ọgaranya. Ọ na-ejikwa ákwà na-acha odo odo na ákwà linin achọ onwe ya mma, na-emekwa onwe ya obi ụtọ n’ụzọ okomoko site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị. Ma e nwere onye arịrịọ aha ya bụ Lazarọs nke a na-ebute n’ọnụ ụzọ ámá ya. Ọnyá jukwara ya n’ahụ́. Ọ na-agụkwa ya agụụ iri ihe si na tebụl ọgaranya ahụ na-adapụ. Ee, nkịta na-abịakwa aracha ọnyá ya.”—Luk 16:19-21.
-
-
Ọnọdụ Ọgaranya ahụ na Lazarọs AgbanweeJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Olee otú ndị ndú okpukpe a bara ọgaranya ma dị okomoko si were ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha? Ha na-elelị ha, na-akpọkwa ha am ha·’aʹrets, ya bụ, ndị dị ala, ndị na-amaghị Iwu Mozis na ndị a na-ekwesịghị ịkụziri Iwu ahụ. (Jọn 7:49) Otú a e si were ha mere ka ha yie ‘onye arịrịọ ahụ aha ya bụ Lazarọs,’ bụ́ onye ọ na-agụ agụụ iri ụmụ irighiri “ihe si na tebụl ọgaranya ahụ na-adapụ.” Otú ahụ ọnyá si ju Lazarọs ahụ́, a na-eledakwa ya anya, ka e sikwa na-eleda ndị nkịtị anya, na-ele ha anya ka ndị Chineke jụrụ ajụ.
-