Zụlite Mmụọ nke Inwe Ekele
OTU dibịa na New York State zọpụtara ndụ Marie n’ọnọdụ mberede. Ma Marie dị afọ 50 ekeleghị dọkịta ahụ ekele ma ọ bụ kwụọ ụgwọ ya. Lee ihe atụ nke enweghị obi ekele ọ bụ!
Bible na-akọ na n’otu mgbe, ka ọ banyere n’otu obodo, Jisọs zutere ndị ikom iri ndị nwere ajọ ọrịa ekpenta. Ha tikuru ya n’olu dara ụda: “Jisọs, Nna anyị, meere anyị ebere.” Jisọs nyere n’iwu, sị: “Gaanụ, were onwe unu gosi ndị nchụàjà.” Ndị ekpenta ahụ naara ntụzi ya, ka ha na-agakwa n’ụzọ, ha malitere ịhụ na inwe mmetụta nke ahụ ike ha e weghachiri.
Itoolu n’ime ndị ekpenta ahụ a gwọrọ gawaara onwe ha. Ma onye ekpenta nke ọzọ, bụ́ onye Sameria, laghachiri ịchọ Jisọs. Onye a bụbu onye ekpenta nyere Chineke otuto, mgbe ọ hụkwara Jisọs, ọ dara n’ụkwụ ya, na-ekele ya. Ná nzaghachi Jisọs sịrị: “É meghị ka ahụ ndị ikom iri ahụ dị ọcha? Ma olee ebe itoolu fọdụrụ nọ? Á hụghị ndị laghachiri inye Chineke otuto, ma ọ bụghị onye ala ọzọ a?”—Luk 17:11-19.
A na-enye echiche dị mkpa n’ajụjụ bụ́: “Ma olee ebe itoolu fọdụrụ nọ?” Dị ka Marie, ndị ekpenta itoolu ahụ emezighị nnọọ emezi—ha egosighị obi ekele. Enweghị obi ekele dị otú ahụ jupụtara nnọọ ebe nile taa. Gịnị kpatara nke a?
Isi Ihe Na-akpata Enweghị Obi Ekele
N’ụzọ bụ isi, enweghị obi ekele na-esitekarị n’ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Tụlee banyere nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv. Jehova ji àgwà ndị mara mma kee ha ma nye ihe nile maka obi ụtọ ha, gụnyere ebe obibi bụ́ ubi mara mma, gburugburu ebe zuru okè, na ọrụ bara uru ma na-eju afọ. (Jenesis 1:26-29; 2:16, 17) Ma, n’okpuru nrụgide nke mkpali Setan kpaliri ọdịmma onwe onye ha, dị ka di na nwunye ha nupụrụ isi ma mesoo mmesapụ aka Jehova n’ụzọ nlelị.—Jenesis 3:1-5; Mkpughe 12:9.
Tụleekwa ndị Israel oge ochie, bụ́ ndị Chineke họpụtaworo ịbụ ihe onwunwe ya pụrụ iche. Lee obi ekele ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị Israel na-aghaghị inweworị n’abalị Nisan 14, 1513 T.O.A.! N’abalị ahụ dị mkpa, mmụọ ozi nke Chineke wetaara “nwa ọ bụla e buru ụzọ mụọ n’ala Ijipt” ọnwụ ma gabiga ụlọ ndị Israel a kara akara nke ọma. (Ọpụpụ 12:12, 21-24, 30) Mgbe a gbapụtakwara ha n’aka usuu ndị agha Fero n’Osimiri Uhie, site n’obi jupụtara n’ekele, “Mosis na ụmụ Israel na-abụkuru Jehova abụ.”—Ọpụpụ 14:19-28; 15:1-21.
Ka o sina dị, nanị izu ole na ole ka ha hapụsịrị Ijipt, “nzukọ nile nke ụmụ Israel wee tamuo ntamu.” Lee otú ha si ghọọ ndị na-enweghị ekele ngwa ngwa! Ha nwere agụụ ‘ịnọdụ n’akụkụ ite anụ . . . , iriju nri afọ,’ bụ́ nke ha nụworo ụtọ ya n’Ijipt, bụ́ ala nke ịnọ n’ohu ha. (Ọpụpụ 16:1-3) N’ụzọ doro anya, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-emegide ịzụlite na igosi obi ekele.
N’ịbụ ụmụ Adam bụ́ onye mmehie, a mụrụ mmadụ nile n’ọnọdụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na àgwà nke enweghị obi ekele. (Ndị Rom 5:12) Enweghị ekele bụkwa otu akụkụ nke mmụọ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke rikpuru ndị bi n’ụwa a. Dị ka ikuku anyị na-ekuru, mmụọ ahụ dị ebe nile, ọ na-emetụtakwa anyị. (Ndị Efesọs 2:1, 2) Mgbe ahụ, ọ dị anyị mkpa ịzụlite omume obi ekele. Olee otú anyị pụrụ isi mee otú ahụ?
Ntụgharị Uche, Ihe A Na-aghaghị Ime!
Webster’s Third New International Dictionary na-akọwa obi ekele dị ka “ọnọdụ nke inwe ekele: mmetụta na-ekpo ọkụ na nke enyi n’ebe onye meere mmadụ ihe ọma nọ, nke na-akpali mmadụ ịkwụghachi ụgwọ maka ihu ọma.” A pụghị ịgbanye ma ọ bụ gbanyụọ mmetụta dị ka ígwè ọrụ; ọ ghaghị ibilite n’onwe ya n’ime mmadụ. Obi ekele karịrị nanị igosi ezi àgwà; ọ na-esite n’obi.
Olee otú anyị pụrụ isi mụta inwe obi ekele? Bible na-asị na ọtụtụ n’ime mmetụta anyị na-enwe bụ n’ihi echiche ndị anyị na-ahọrọ. (Ndị Efesọs 4:22-24) Ịmụta inwe obi ekele na-amalite site n’iji mmasị na-atụgharị uche n’obiọma ndị a na-egosi anyị. N’ikwekọ na nke a, Dr. Wayne W. Dyer, onye na-arụ ọrụ ahụ ike nke uche, na-asị: “Ị pụghị inwe mmetụta (uche) n’ebughị ụzọ chee echiche.”
Were, dị ka ihe atụ, ihe banyere inwe ekele maka ihe e kere eke dị anyị gburugburu. Mgbe i lere eluigwe kpakpando jupụtara anya n’abalị ihu igwe na-agbachighị agbachi, olee mmetụta ị na-enwe banyere ihe ndị ị na-ahụ? Eze Devid kwupụtara ịtụnanya o nwere, sị: “Mgbe m hụrụ eluigwe Gị, bụ́ ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; gịnị ka mmadụ bụ, na Ị na-echeta ya; na nwa nke mmadụ, na Ị na-eleta ya?” N’ịdịkwa jụụ nke abalị, kpakpando gwara Devid okwu, na-akpali ya ide, sị: “Eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọrụ aka Ya ka mbara eluigwe na-egosi.” N’ihi gịnị ka eluigwe jupụtara na kpakpando ji metụta Devid n’ụzọ miri emi otú a? Ya onwe ya na-aza, sị: “Atụgharịwo m uche n’omume Gị nile: n’ọrụ aka Gị abụọ ka m tụgharịworo obi.”—Abụ Ọma 8:3, 4; 19:1; 143:5.
Nwa Devid bụ́ Solomọn ghọtakwara uru nke iche echiche banyere ebube nke okike. Dị ka ihe atụ, banyere òkè nke mmiri oruru na-ekere n’imezi ụwa anyị, o dere, sị: “Osimiri nile na-erudaru oké osimiri, ma oké osimiri ejughị eju, ruo ebe osimiri na-eruda, ruo ebe ahụ ka osimiri ahụ na-erughachi ọzọ.” (Eklisiastis 1:7) Otú a ka o si bụrụ na mgbe mmiri ozuzo na osimiri mezisịrị ala, a na-eweghachi mmiri ha site n’oké osimiri gaghachi n’igwe ojii. Gịnị ka ụwa ga-adị ka ya ma e wezụga usoro a nke ime ka mmiri dịghachi ọcha na iweghachi ya? Lee obi ekele Solomọn na-aghaghị inwewo mgbe ọ na-eche echiche ndị a!
Onye nwere obi ekele na-ejikwa mmekọrịta ya na ndị òtù ezinụlọ, ndị enyi, na ndị ọ maara akpọrọ ihe. Ọrụ obiọma ha na-adọrọ mmasị ya. Ka o ji mmasị na-atụle ihu ọma ndị ha gosiri ya, ọ na-enwe obi ekele.
Ikwupụta Ekele
Lee okwu dị mfe “ndewo” bụ! Ọ dị nnọọ mfe ikwu okwu dị otú ahụ. Ohere ndị e nwekwara iji mee otú ahụ juru eju. Lee ihe na-enye ume ọhụrụ ọ ga-abụrụ onye megheere anyị ụzọ ma ọ bụ weliteere anyị ihe danahụrụ anyị mgbe anyị sịrị ya I Meela sitere n’ezi obi! Ịnụ okwu ahụ pụrụ ime ka ọrụ onye akawo ụlọ ahịa ma ọ bụ onye na-eke nri n’ụlọ nri ma ọ bụ onye na-ekesa akwụkwọ ozi dị mfe ma na-eweta ụgwọ ọrụ karị.
Iziga kaadị i meela bụ otu ụzọ dị mfe isi gosipụta obi ekele maka ọrụ obiọma. Ọtụtụ n’ime kaadị ndị dị n’ọtụtụ ụlọ ahịa na-ekwupụta mmetụta ndị ahụ n’ụzọ magburu onwe ya. Ma ọ́ gaghị abụ àgwà ịhụnanya onwe onye iji aka gị denyekwuo okwu ekele? Ụfọdụ na-ahọrọ ọbụna ịhapụ kaadị e biri ebi, kama nke ahụ na-eziga ihe odide onwe onye.—Tụlee Ilu 25:11.
O yiri ka ndị kasị kwesị ịnata ekele anyị bụ ndị kasị nọrọ anyị nso n’ụlọ. Bible na-ekwu banyere nwanyị nke na-ejide onwe nke ọma, sị: “Di ya kwa, ọ na-etokwa ya.” (Ilu 31:28) Ọ̀ bụ na okwu ekele ndị si n’obi nke di gwara nwunye ya adịghị akwalite inwe ebe obibi nke udo na afọ ojuju? Ọ́ dịghịkwa enye di obi ụtọ ịlọta n’ụlọ ma nweta ekele na-ekpo ọkụ na nke igosi mmasị site n’aka nwunye ya? N’ụbọchị ndị a, nrụgide ndị dị n’alụmdi na nwunye dị ọtụtụ, mgbe nrụgide mụbawanyekwara, obi ọjọọ na-ebilite n’ụzọ dị mfe. Onye nwere obi ekele na-adị njikere ime ohere ma dị ngwa ileghara ihe anya na ịgbaghara.
Ọ dịkwa mkpa ka ndị ntorobịa mụrụ anya ikwupụtara ndị mụrụ ha okwu ekele ndị si n’obi. Otú ọ dị, ndị mụrụ ụmụ ezughị okè, ma nke ahụ abụghị ihe mere ị na-agaghị eji enwe ekele maka ihe ndị ha mewooro gị. A pụghị ịzụta ịhụnanya na nlebara anya ndị ha nyeworo gị kemgbe a mụrụ gị n’ahịa. Ọ bụrụ na ha akụziworo gị ihe ọmụma Chineke, i nwekwuru ihe mere ị ga-eji nwee obi ekele.
“Ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ,” ka Abụ Ọma 127:3 na-ekwupụta. Ya mere ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịchọ ohere ndị ha ga-eji jaa ụmụ ha mma kama ịdị na-abara ha mba banyere ihe ndị na-enweghị isi. (Ndị Efesọs 6:4) Leekwa ihe ùgwù ha nwere inyere ndị na-eto eto nọ n’okpuru nlekọta ha aka ịzụlite mmụọ nke inwe obi ekele!—Tụlee Ilu 29:21.
Inye Chineke Ekele
Jehova Chineke bụ onye na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè.” (Jemes 1:17) Nke dị mkpa karịsịa bụ onyinye nke ndụ, n’ihi na ihe nile anyị nwere ma ọ bụ ihe anyị pụrụ ime atụmatụ ha ga-aghọ nke na-abaghị uru ma ọ bụrụ na ndụ efunahụ anyị. Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume icheta na “n’ebe [Jehova Chineke] nọ ka isi iyi ndụ dị.” (Abụ Ọma 36:5, 7, 9; Ọrụ 17:28) Iji zụlite obi ekele n’ebe Chineke nọ, ọ dị anyị mkpa ịtụgharị uche ná ndokwa afọ ọma ya bụ́ nke na-akwagide ndụ anụ ahụ na nke ime mmụọ anyị. (Abụ Ọma 1:1-3; 77:11, 12) Obi dị otú ahụ ga-akpali anyị igosi ekele n’okwu na n’omume.
Ekpere bụ otu ụzọ pụtara ìhè isi gosipụta ekele anyị nye Chineke. Ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwupụtara, sị: “Ọtụtụ ihe ka Gị onwe gị meworo, Jehova, bụ́ Chineke m, bụ́ oké ọrụ Gị nile, na echiche Gị nile n’ebe anyị nọ: a pụghị idoro Gị ha n’usoro; a sị na aga m egosi kwuokwa okwu banyere ha, ha karịrị ịgụ ọnụ.” (Abụ Ọma 40:5) Ka a kpaliekwa anyị n’otu ụzọ ahụ.
Devid kpebisikwara ike igosi Chineke ekele ya site n’okwu ndị ọ gwara ndị ọzọ. Ọ sịrị: “M ga-eji obi m nile kelee Jehova; m ga-akọkwa akụkọ oké ọrụ Gị nile.” (Abụ Ọma 9:1) Ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke, ikwupụta obi anyị site n’isoro ha na-ekerịta eziokwu sitere n’Okwu ya, bụ ma eleghị anya ụzọ kasị mma isi gosi ya obi ekele anyị. Nke a ga-enyekwara anyị aka ịdị na-enwekwu ekele n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ.
“Onye na-achụ ekele dị ka àjà na-asọpụrụ m; ọ bụkwa onye na-edozi ụzọ ya ka m ga-eme ka ọ hụ nzọpụta Chineke,” ka Jehova na-asị. Ka i nweta ọṅụ nke na-abịa site igosi ekele gị sitere n’obi nye ya.—Abụ Ọma 50:23; 100:2.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke. Jide n’aka ịtụkwasị ya ihe n’onwe gị