-
Alaeze Chineke Ọ̀ Dị n’Obi Gị?Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
-
-
Mgbe Jizọs kwuru na “alaeze Chineke dị n’etiti unu,” gịnị ka o bu n’obi?
Otú ụfọdụ ndị si akọwa ihe Jizọs kwuru na Luk 17:21 emeela ka ebe Alaeze Chineke dị gbagwojuo ụfọdụ ndị anya. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị chere na ihe Jizọs kwuru pụtara na Alaeze Chineke dị n’obi ndị mmadụ. Ma, ka anyị lebagodị anya n’ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru n’oge ahụ. Ọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe o bu n’obi.
Alaeze Chineke adịghị n’obi ndị Farisii obi tara mmiri bụ́ ndị kpara nkata ka ha gbuo Jizọs
N’oge ahụ, ọ bụ ndị Farisii ka Jizọs na-agwa okwu. Ndị Farisii bụ ndị isi okpukpe ndị Juu. Ha ejighị anya ahụ Jizọs, ha sokwa kpaa nkata ka e gbuo Jizọs. (Matiu 12:14; Luk 17:20) Ànyị kwesịrị ichewe na Alaeze Chineke ga-adị n’obi ndị ahụ obi ha kpọrọ nkụ? Jizọs gwara ha na ihe juru n’ime ha bụ ‘ihu abụọ na mmebi iwu.’—Matiu 23:27, 28.
N’ihi ya, ihe Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru na “alaeze Chineke dị n’etiti” ndị Farisii bụ na yanwa, bụ́ Onye Chineke họpụtara ịbụ Eze alaeze ahụ, guzo n’ihu ha.—Luk 1:32, 33.
-
-
Alaeze Chineke Ọ̀ Dị n’Obi Gị?Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
-
-
a E nwere ọtụtụ chọọchị ndị na-akụzi na Alaeze Chineke dị n’ime mmadụ ma ọ bụ n’ime obi mmadụ. Dị ka ihe atụ, Òtù Chọọchị Ndị Baptist E Nwere n’Amerịka kwuru na otu n’ime ihe bụ́ Alaeze Chineke bụ “Chineke ịchị n’obi mmadụ nakwa ná ndụ ya.” Poopu Benedict nke Iri na Isii kwukwara n’akwụkwọ ya bụ́ Jesus of Nazareth na “otú Alaeze Chineke si abịa bụ mmadụ iji obi ya na-ege [Chineke] ntị.”
-