Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼Jọn 18:15 kwuru banyere otu onye na-eso ụzọ nke onye isi nchụaja ahụ maara. Nke a ọ̀ bụ otu onye ahụ na-eso ụzọ nke ‘gba ọtọ’ wee gbalaga, dị ka a kọrọ ya na Mak 14:51, 52?
Ee e, o yiri ka onye nke onye isi nchụaja ahụ maara ọ̀ bụ Jọn onyeozi, ebe ọ bụ onye na-eso ụzọ bụ Mak ‘gba ọtọ’ wee gbalaga.
N’ile ihe ndekọ ndị a anya n’ihe banyere oge ha mere, anyị na-amalite n’ogige Getsemane. Ndị ozi ahụ meghachiri omume n’egwu mgbe e jidere Jisọs Kraịst. ‘Ha nile hapụrụ ya wee gbalaga.’ Amaokwu na-esochi nke ahụ n’ihe ndekọ nke Mak gosipụtara ihe dị iche: “Ma otu okorobịa sonyeere ya, onye gbokwasịrị ezi ákwà ọcha n’ahụ ọtọ ya: ha wee jide ya: ma ọ hapụrụ ezi ákwà ọcha ahụ, gbara ọtọ gbalaga.”—Mak 14:50-52.
Otú a, e gosiri ọdịiche dị n’etiti mmeghachi omume mbụ nke ndị ozi 11 ahụ na onye nke a na-eso ụzọ a na-akpọtụghị aha, ya mere, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na ọ bụghị otu n’ime ndị ozi ahụ. E dekọrọ ihe banyere ihe omume nke a nanị n’Oziọma ahụ otu n’ime ndị mbụ ahụ na-eso ụzọ bụ Jọn Mak dere, bụ́ nwa nwanne nne Banabas. N’ihi ya, e nwere ihe mere a ga-eji nọgide na-ekwu na Mak bụ “otu okorobịa” ahụ nke malitere iso Jisọs ahụ nke e jideworo, ma gbahapụ uwe mgbokwasị ya wee gbalaga mgbe ìgwè mmadụ ahụ nwara ijidekwa ya.—Ọrụ 4:36; 12:12, 25; Ndị Kọlọsi 4:10.
N’otu oge n’anyasị ahụ, Pita onyeozi sokwara Jisọs, n’ebe dị nnọọ anya. N’echiche nke a, e nwere myirịta dị n’etiti ha; onye ahụ na-eso ụzọ bụ nwa okoro (Mak) malitere iso Jisọs ma kwụsị, ebe ọ bụ na mgbe e mesịrị abụọ n’ime ndị ozi ahụ ndị gbaburu ọsọ malitere iso Nna ha Ukwu nke e ji eji. N’Oziọma Jọn onyeozi, anyị na-agụ, sị: “Saịmọn Pita wee soo Jisọs, ya na onye ọzọ nke na-eso ụzọ Jisọs. Ma onye ahụ nke na-eso ụzọ Jisọs bụ onye onye isi nchụaja maara, o wee soo Jisọs baa n’obí onye isi nchụaja.”—Jọn 18:15.
Jọn onyeozi ji aha ahụ bụ “Jọn” na-eme ihe n’izo aka n’ebe Jọn Onye Na-eme Baptism nọ, ma ọ dịghị mgbe ọ kpọrọ onwe ya aha. Dị ka ihe atụ, o dere banyere “onye ahụ na-eso ụzọ Jisọs nke na-agbara ihe ndị a àmà, nke dekwara ihe ndị a n’akwụkwọ.” N’otu aka ahụ: “Onye hụworo ya agbawokwa àmà, àmà ya bụkwa ezie: onye ahụ na-amatakwa na ọ na-ekwu eziokwu.” (Jọn 19:35; 21:24) Rịbakwa ama Jọn 13:23: “Otu onye n’etiti ndị na-eso ụzọ ya na-anọdụ ná nri na-adabere n’obi Jisọs, onye Jisọs hụrụ n’anya.” Nke ahụ bụ nwa mgbe nta tupu e jide Jisọs. Mgbe e mesịrị n’ụbọchị ahụ, Jisọs ahụ nke a kpọgideworo n’osisi họpụtara otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, onye Jọn jikwa okwu ndị dị otú ahụ kọwaa, sị: “Mgbe Jisọs hụrụ nne ya, na onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye ọ hụrụ n’anya, ka ọ na-eguzo nso, [Jisọs] sị nne ya, Nwanyị, lee, nwa gị nwoke!”—Jọn 19:26, 27; tụlee Jọn 21:7, 20.
Otu àgwà ahụ nke akpọtụghị onwe ya aha pụtakwara ìhè na Jọn 18:15. Ọzọkwa, e jikọtara Jọn na Pita n’ihe ndekọ ahụ banyere ihe mere mgbe mbilite n’ọnwụ ahụ gasịworo, na Jọn 20:2-8. Ihe ngosi ndị a na-atụ aro na ọ bụ Jọn onyeozi bụ “onye ahụ nke na-eso ụzọ Jisọs bụ́ onye onye isi nchụaja maara.” Bible enyeghị ihe ọmụma nke na-akọwa otú onyeozi ahụ si Galili (Jọn) pụrụ isiworị mata onye isi nchụaja ahụ, bụrụkwa onye ọ maara. Ma, ọmụma ezinụlọ onye isi nchụaja ahụ maara ya mere ka Jọn nwee ike ịgafe onye nche ọnụ ụzọ wee banye n’ogige ụlọ ahụ, meekwa ka Pita nwee ike ịgafeta.