-
Gịnị Bụ Alaeze Chineke?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 31
Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
Ihe kacha gbaa ọkpụrụkpụ e kwuru okwu gbasara ya na Baịbụl bụ Alaeze Chineke. Jehova ga-eji Alaeze ahụ eme ihe niile o bu n’obi kee ụwa. Gịnị ka Alaeze ahụ bụ? Olee otú anyị si mara na ọ chịwala ugbu a? Gịnị na gịnị ka o merela? Gịnịkwa ka ọ ga-eme n’ọdịnihu? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a nakwa n’isiokwu abụọ na-eso ya.
1. Gịnị bụ Alaeze Chineke? Ònyekwa bụ Eze ya?
Alaeze ahụ bụ ọchịchị Jehova hiwere. Eze ya, bụ́ Jizọs Kraịst, nọ n’eluigwe na-achị. (Matiu 4:17; Jọn 18:36) Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, sị: “Ọ ga-achị . . . ruo mgbe ebighị ebi.” (Luk 1:32, 33) Ọ ga-achị ndị niile bi n’ụwa n’ihi na ọ bụ ya bụ Eze Alaeze Chineke.
2. Ole ndị ga-eso Jizọs chịa?
Ọ bụghị naanị Jizọs ga na-achị n’Alaeze Chineke. Ya na ndị si ‘n’ebo niile, ndị na-asụ asụsụ niile, ndị agbụrụ niile nakwa ndị mba niile ga na-achị ụwa.’ (Mkpughe 5:9, 10) Ole ka ndị ga-eso Kraịst achị dị? Ọtụtụ nde mmadụ aghọọla ndị na-eso ụzọ Jizọs kemgbe ọ bịachara n’ụwa. Ma, ọ bụ naanị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-aga eluigwe ma soro Jizọs chịa n’Alaeze Chineke. (Gụọ Mkpughe 14:1-4.) Ndị Kraịst ndị ọzọ ga-ebi n’ụwa, Alaeze ahụ ana-achị ha.—Abụ Ọma 37:29.
3. Olee otú Alaeze Chineke si kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma?
Ụfọdụ ndị ọchịchị na-agbalị ka ha rụọ ọrụ dị mma n’ọchịchị ha, ma, ike ha anaghị eru ịrụ ihe niile ha chọrọ ịrụ. Ka a na-eme ka a na-eme, ndị ọzọ anọchie ha. Ndị ahụ nọchiri ha nwere ike bụrụ ndị ọchịchị ọjọọ na-anaghị arụrụ ndị ha na-achị ọrụ. Ma, o nweghị onye ga-anọchi Eze Alaeze Chineke, bụ́ Jizọs. Chineke emeela “ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị.” (Daniel 2:44) Jizọs ga na-achị ụwa niile. Ọ gaghị na-emegbu ụfọdụ ndị, na-emenyere ndị ọzọ. Ọ hụrụ mmadụ niile n’anya, jiri obiọma na-emeso ha ihe. Ọ na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Ọ ga-akụzikwara ụmụ mmadụ ka ha na-emeso ibe ha otú yanwa si emeso ha, ya bụ, ka ha hụ ibe ha n’anya, jiri obiọma na-emeso ha ihe ma na-ekpe ikpe ziri ezi.—Gụọ Aịzaya 11:9.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe mere Alaeze Chineke ji kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma.
4. Alaeze Chineke ga-achị ụwa
O nweghị onye ọchịchị ike ya haruru ka nke Jizọs. Gụọnụ Matiu 28:18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ike Jizọs si kara ike mmadụ ọ bụla na-achị achị?
Ndị mmadụ na-agbanwekarị ndị na-achị ha. Onye ọchịchị nke ọ bụla na-enwekwa mpaghara ụwa ebe ọ na-achị. Olee maka Alaeze Chineke? Gụọnụ Daniel 7:14. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị mere o ji dị mma na ‘a gaghị ebibi’ Alaeze Chineke ebibi?
Gịnị mere o ji dị mma na ọ ga na-achị ụwa niile?
5. Alaeze Chineke ga-anọchirịrị ọchịchị ụmụ mmadụ
Olee ihe mere Alaeze Chineke ga-eji nọchie ọchịchị ụmụ mmadụ? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka ọchịchị ụmụ mmadụ kpataara anyị?
Gụọnụ Ekliziastis 8:9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ì chere na Alaeze Chineke kwesịrị ịnọchi ọchịchị ndị mmadụ? Maka gịnị?
6. Ndị ọchịchị Alaeze Chineke ma otú ihe si dịrị anyị
Eze anyị, bụ́ Jizọs, nwere mgbe o biri n’ụwa. N’ihi ya, ọ ga-aghọtali “na anyị adịghị ike.” (Ndị Hibru 4:15) Jehova si “n’ebo niile, n’asụsụ niile, n’agbụrụ niile nakwa na mba niile” họpụta ezigbo Ndị Kraịst dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze ya.—Mkpughe 5:9.
Otú a ị matara na Jizọs na ndị ga-eso ya achị ma otú ihe si dịrị ụmụ mmadụ ọ̀ na-akasi gị obi? Maka gịnị?
Jehova na-ahọpụta ụdị ndị dị iche iche, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, ka ha na Jizọs chịa n’Alaeze ya
7. Iwu Chineke nyere ndị Alaeze ya ga-achị ka iwu ndị mmadụ na-enye ndị ha na-achị mma
Ndị ọchịchị na-eme iwu ndị kwesịrị ịbara ndị ha na-achị uru ma chebe ha. Alaeze Chineke nwekwara iwu ndị ọ na-achị kwesịrị ịna-edebe. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú i chere ụwa ga-adị ma mmadụ niile na-edebe iwu Chineke?a
Ì chere na Jehova kwesịrị ịgwa ndị Alaeze ya na-achị ka ha na-edebe iwu ndị o nyere ha? Maka gịnị?
Olee ihe gosiri na ndị na-anaghị edebe iwu ndị a nwere ike ịgbanwe?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 11.
Ndị ọchịchị na-eme iwu ndị ga-echebe ndị ha na-achị ma baara ha uru. Alaeze Chineke nwere iwu ndị ka iwu ụmụ mmadụ mere mma. Iwu ndị ahụ ga-echebe ndị Alaeze ahụ ga-achị, baakwara ha uru
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe bụ́ Alaeze Chineke.
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe nke ga-achị ụwa niile.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Ole ndị ga-abụ ndị eze Alaeze Chineke?
Olee otú Alaeze Chineke si kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma?
Gịnị na gịnị ka Jehova chọrọ n’aka ndị Alaeze ya ga-achị?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe Jizọs kwuru gbasara ebe Alaeze ahụ dị.
Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji akwado Alaeze Chineke kama ịkwado ọchịchị ụmụ mmadụ?
Chọpụta ihe Baịbụl kwuru gbasara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị Jehova họpụtara ka ha na Jizọs chịa n’Alaeze ya.
Gịnị mere otu nwaanyị nọ mkpọrọ ji kweta na ọ bụ naanị Chineke ga-eme ka mmegbu ghara ịdị n’ụwa?
a Anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ n’ime iwu ndị ahụ ná Nkebi nke atọ n’akwụkwọ a.
-
-
Ihe Ịdị Iche n’Ụwa PụtaraNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 45
Ihe Ịdị Iche n’Ụwa Pụtara
Jizọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya “abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:19) Otu n’ime ihe ọ pụtara bụ na ha ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa ma ọ bụ n’agha. N’eziokwu, ime ihe a anaghị adịcha mfe mgbe niile. O nwere ike ime ka ndị mmadụ jiri anyị na-eme ihe ọchị. Olee otú anyị ga-esi rubere Jehova Chineke isi ma gosi na anyị dị iche n’ụwa?
1. Olee otú ezigbo Ndị Kraịst si ele ndị ọchịchị anya?
Ndị Kraịst na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù. Anyị na-eme ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza.” Ọ pụtara na anyị ga na-erubere iwu obodo anyị isi, dị ka iwu nke kwuru ka anyị na-atụ ụtụ isi anyị. (Mak 12:17) Baịbụl kwuru na ihe mere ụmụ mmadụ ji na-achị bụ maka na Jehova hapụrụ ha. (Ndị Rom 13:1) Ihe a na-egosi na o nwere ebe ike ndị ọchịchị ruru kwụsị, ya bụ, ọ bụghị ihe niile ka ha nwere ike ime. Anyị na-atụ anya na oge na-abịa mgbe Chineke anyị ga-eji Alaeze ya dị n’eluigwe kwụsị nsogbu niile na-echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala.
2. Olee otú anyị ga-esi na-egosi na anyị dị iche n’ụwa?
Dị ka Jizọs, anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe ndị mmadụ chọrọ ime Jizọs eze ha n’ihi ọrụ ebube ha hụrụ ọ rụrụ, o kweghị. (Jọn 6:15) Maka gịnị? Ọ bụ maka ihe o mechara kwuo. Ọ sịrị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) E nwere ụzọ dị iche iche anyị bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs si egosi na anyị dị iche n’ụwa. Dị ka ihe atụ, anyị anaghị aga agha. (Gụọ Maịka 4:3.) Anyị na-akwanyere ihe ndị na-anọchi anya obodo, dị ka ọkọlọtọ, ùgwù, mana anyị anaghị efe ha ofufe. (1 Jọn 5:21) E nweghị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị anyị na-akwado, e nweghịkwa onye na-azọ ọkwá anyị na-akwado. Ụzọ ndị a bụ ụfọdụ n’ime ụzọ anyị si egosi na ọ bụ naanị ọchịchị Chineke, ya bụ, Alaeze Chineke, ka anyị na-akwado.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta oge ụfọdụ ime ihe ga-egosi na anyị dị iche n’ụwa nwere ike isiri anyị ike. Chọpụtakwa ihe ị ga-eme ga-eme Jehova obi ụtọ.
3. Ezigbo Ndị Kraịst dị iche n’ụwa
Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gosiri anyị ihe anyị kwesịrị ime. Gụọnụ Ndị Rom 13:1, 5-7 na 1 Pita 2:13, 14. Unu gụchaa ha, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù?
Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi gosi na anyị na-erubere ha isi?
Obodo abụọ lụwa agha, ụfọdụ mba nwere ike ịna-ekwu na o nweghị ndị nke ha na-adụnyere úkwù, ma ha na-akwadocha obodo abụọ ahụ. Oleezi ihe ịdị iche pụtara n’eziokwu? Gụọnụ Jọn 17:16. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka ịdị iche n’ụwa pụtara?
Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị agwa anyị mee ihe iwu Chineke sịrị anyị emela? Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 5:28, 29. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ọ bụrụ na ndị ọchịchị enye iwu dị iche n’iwu Chineke nyere, olee iwu nke anyị kwesịrị idebe?
Ì nwere ike icheta otu ihe Ndị Kraịst na-agaghị ekwe eme ma ndị ọchịchị gwa ha mee ya?
4. Ka ihe ị na-eche na omume gị gosi na ị dị iche n’ụwa
Gụọnụ 1 Jọn 5:21. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Na vidio a anyị lere, gịnị mere Ayenge ekweghị abanye n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ soro na-eme ememme e ji eto mba, dị ka igbuchapụrụ ọkọlọtọ?
Ì chere na ihe a o mere dị mma?
Olee ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka ịdị iche n’ụwa siere anyị ike? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị dị iche n’ụwa ma a bịa n’ihe gbasara asọmpi egwuregwu ndị si ebe dị iche iche n’ụwa na-eme?
Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị dị iche n’ụwa ọ bụrụgodị na ndị ọchịchị mere ihe baara anyị uru ma ọ bụ ihe kpataara anyị nsogbu?
Olee otú ụdị akụkọ ụwa anyị na-ege ma ọ bụ ndị anyị na ha na-akpa nwere ike isi mee ka o siere anyị ike ịna-adị iche n’ụwa?
Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị Onye Kraịst ga-esi n’ihe ọ na-eche na n’omume ya gosi na aka ya adịghị na ha?
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere ị naghị egbuchapụrụ ọkọlọtọ ma ọ bụ ihe mere ị naghị ekwe ukwe e ji eto mba.
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Ndị Kraịst na-agbasi mbọ ike ka ha ghara itinye aka n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma n’echiche ha ma n’okwu ha ma n’omume ha.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee ụgwọ anyị ji ndị ọchịchị?
Gịnị mere anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?
Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ịdị iche n’ụwa?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Olee ihe ụfọdụ anyị ga-agba mbọ hapụ ka anyị nwee ike ịdị iche n’ụwa?
Gịnị ka ezinụlọ dị iche iche nwere ike ime iji jikere maka oge ndị o nwere ike isiri ha ike igosi na ha dị iche n’ụwa?
Gịnị mere na mmadụ ịlụrụ obodo ya agha abụghị ihe kacha eme ka a na-akwanyere mmadụ ùgwù?
Mgbe anyị na-ekpebi ụdị ọrụ anyị ga-arụ, chọpụta otú anyị ga-esi egosi na anyị dị iche n’ụwa.
-