Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2004 | Disemba 1
    • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

      Gịnị mere Jizọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ji gwa Tọmọs ka o metụ ya aka ma gbochie Meri Magdalin ime otú ahụ tupu mgbe ahụ?

      Ụfọdụ nsụgharị Bible ndị ka mee ochie na-enye echiche na Jizọs gwara Meri Magdalin ka ọ ghara imetụ ya aka. Dị ka ihe atụ, Bible Nsọ nke Union Version si otú a tinye ihe ahụ Jizọs kwuru: “Emetụla m aka; n’ihi na akarịgoghị m lakwuru Nna m.” (Jọn 20:17) Otú ọ dị, ngwaa Grik mbụ, bụ́ nke a na-asụgharịkarị ịbụ “metụ,” pụtara “ịrapara, ijidesi ike, ijide, ịbagide, ijide aka.” N’ụzọ ezi uche dị na ya, ihe Jizọs na-ekwu abụghị ka Meri Magdalin ghara imetụ ya aka nkịtị ebe o kwere ka ndị inyom ọzọ bịara n’ili ya “jide ya n’ụkwụ.”—Matiu 28:9.

      Ọtụtụ nsụgharị ndị e ji asụsụ ndị e ji eme ihe n’oge a mee, dị ka Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, The New Jerusalem Bible, na The New English Bible, na-enyere anyị aka ịghọta ihe okwu Jizọs pụtara n’ezie site n’isi otú a tinye ya: “Kwụsị ịrapara m n’ahụ́.” Gịnị mere Jizọs ga-eji gwa Meri Magdalin, bụ́ ezigbo enyi ya, okwu dị otú ahụ?—Luk 8:1-3.

      O yiri ka egwu ọ̀ nọ na-atụ Meri Magdalin na Jizọs na-aga ịhapụ ya ma rịgoro n’eluigwe. N’ịbụ onye ọchịchọ siri ike o nwere ịnọnyere Onyenwe ya kpaliri, ọ nọ na-ejigidesi Jizọs ike, n’ekweghị ka ọ laa. Iji mesie ya obi ike na ya alawabeghị, Jizọs gwara Meri ka ọ kwụsị ịrapara ya n’ahụ́ ma kama nke ahụ ka ọ gaa gwa ndị na-eso ụzọ ya na ya ebilitewo n’ọnwụ.—Jọn 20:17.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2004 | Disemba 1
    • N’ihi ya, a bịa n’ihe banyere Meri Magdalin, Jizọs na-eme ihe banyere ọchịchọ na-ezighị ezi e nwere igbochi ya ịla; n’akụkụ nke Tọmọs, Jizọs nọ na-enyere onye nwere obi abụọ aka. N’ọnọdụ abụọ ahụ, Jizọs nwechara ezi ihe mere o ji mee ihe o mere.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya