Gịnị Ka Anyị Na-aghaghị Ime Ka A Zọpụta Anyị?
OTU nwoke jụrụ Jisọs n’otu mgbe, sị: “Onyenwe anyị, Ǹdị a na-azọpụta dị mmadụ ole na ole?” Olee otú Jisọs si zaghachi? Ọ̀ sịrị: ‘Nanị nara m dị ka Onyenwe gị na Onye Nzọpụta gị, a ga-azọpụtakwa gị’? Ee e! Jisọs sịrị: “Jisienụ ike isi n’ọnụ ụzọ dị warara baa: n’ihi na ọtụtụ mmadụ, ka M sị unu, ga-achọ ịba n’ime ya, ma ha agaghị enwe ike.”—Luk 13:23, 24.
Ọ̀ bụ na Jisọs azaghị ajụjụ nwoke ahụ? Ee e, nwoke ahụ ajụghị otú ọ ga-esiru ike ịbụ onye a ga-azọpụta; ọ jụrụ ma ọnụ ọgụgụ ha ọ̀ ga-adị ole na ole. Ya mere nanị ihe Jisọs mere bụ igosi na ndị dị ole na ole karịa ihe mmadụ pụrụ ịtụ anya ya ga-ejisi ike iji nata ngọzi a dị ebube.
‘Ọ bụghị ihe a gwara m,’ ka ụfọdụ ndị na-agụ magazin a pụrụ ime mkpesa ya. Ndị a pụrụ ihota Jọn 3:16, nke na-asị: “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, nke na o nyere nanị Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla kwere na ya ghara ịnwụ, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (King James Version) Otú ọ dị, anyị na-aza: ‘Mgbe ahụ, gịnị ka anyị na-aghaghị ikwere na ya? Na Jisọs biri ndụ n’ezie? Eenụ. Na ọ̀ bụ Ọkpara Chineke? Kpọmkwem! Ebe ọ bụkwa na Bible na-akpọ Jisọs “Onye ozizi” na “Onyenwe anyị,” ọ̀ bụ na anyị aghaghịkwa ikwere n’ihe ọ kụziri, rubere ya isi, ma soro ya?’—Jọn 13:13; Matiu 16:16.
Isoro Jisọs
Aa, ebe a ka nsogbu dị! Ọtụtụ ndị a gwaworo na a “zọpụtawo” ha yiri ka ha nwere ntakịrị ebumnobi nke isoro ma ọ bụ irubere Jisọs isi. N’ezie, otu onye ụkọchukwu Protestant dere, sị: “N’ezie, okwukwe anyị nwere na Kraịst kwesịrị ịga n’ihu. Ma nzọrọ nke na ọ ghaghị ime otú ahụ, ma ọ bụ na ọ dị mkpa ka o mee otú ahụ, enweghị nkwado ọ bụla n’ime Bible.”
N’ụzọ dị iche, Bible na-edepụta omume ndị rụrụ arụ nke ndị ụfọdụ na-eche na a “zọpụtawo” ha na-emekarị. Banyere otu onye nọgidere n’ụzọ ndị dị otú ahụ, ọ tụziiri ndị Kraịst, sị: “Wepụnụ ajọ onye ahụ n’etiti onwe unu.” N’ezie Chineke agaghị achọ ndị ajọ mmadụ na-emetọ ọgbakọ ndị Kraịst!—1 Ndị Kọrint 5:11-13.
Mgbe ahụ, gịnị ka isoro Jisọs pụtara, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? Ọ dị mma, gịnị ka Jisọs mere? Ọ̀ bụ onye na-eme omume rụrụ arụ? ònye na-akwa iko? ònye na-aṅụbiga mmanya ókè? ònye na-agha ụgha? Ọ̀ bụ onye na-adịghị akwụwa aka ya ọtọ n’azụmahịa? N’ezie ọ bụghị! ‘Ma,’ ka ị pụrụ ịjụ, ‘ọ̀ bụ iwu na m ga-ehichapụ ihe ndị ahụ nile ná ndụ m?’ Maka azịza ya, tụlee Ndị Efesọs 4:17 ruo 5:5. Ọ naghị asị na Chineke ga-anabata anyị n’agbanyeghị ihe ọ bụla anyị na-eme. Kama nke ahụ, ọ na-agwa anyị ka anyị dịrị iche pụọ ná mba nile nke ụwa bụ́ ndị “mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ, . . . ma unu onwe unu amụtaghị Kraịst anyị otú a . . . Tụpụ mmadụ ochie unu, nke na-emebi emebi . . . dị ka ibi obi unu na mbụ si dị . . . Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ . . . Ma ịkwa iko, na adịghị ọcha nile, ma ọ bụ anyaukwu, ka a ghara ịkpọ ọbụna aha ya n’etiti unu, dị ka o kwesịrị ndị nsọ . . . N’ihi na nke a ka unu matara nke ọma, na ọ dighị onye ọ bụla nke bụ onye na-akwa iko, ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha, ma ọ bụ onye anyaukwu, nke isi ya bụ onye na-ekpere arụsị, nwere ihe nketa n’alaeze nke Kraịst na Chineke.”
Ànyị na-eso Jisọs ma ọ bụrụ na ọ dịkarịa ala anyị adịghị agbalị ibi ndụ kwekọrọ n’ihe nlereanya ya? Ọ̀ bụ na anyị aghaghị ịrụ ọrụ iji mee ka ndụ anyị dịkwuo ka nke Kraịst? Ndị na-asị, dị ka otu traktị okpukpe si kwuo: “Bịakwute Kraịst ugbu a—kpọmkwem otú ahụ ị dị,” adịghị echebara ajụjụ a dị oké mkpa echiche mgbe nile, ma ọ bụrụ na ha na-eme otú ahụ ma ọlị.
Otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs dọrọ aka ná ntị na ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke “na-agha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko, ndị na-agọnarịkwa Onye nanị Ya bụ Nna nwe ọha, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (Jud 4) N’ezie, n’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi ghaa ebere Chineke “ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko”? Anyị pụrụ ime otú a site n’iche na àjà Kraịst na-ekpuchi mmehie ndị a maara ụma mee ndị anyị zubere ịnọgide na-eme kama ikpuchi mmehie ndị sitere n’ezughị okè mmadụ ndị anyị na-agbalị ịhapụ. N’ezie anyị agaghị achọ ikwenyere otu n’ime onye okwuchukwu America a kasị mara, bụ́ onye kwuru na ọ bụghị iwu na ị “ga-eme mgbanwe, hapụ àgwà ọjọọ nile, ma ọ bụ chigharịa.”—Tụlee Ọrụ 17:30; Ndị Rom 3:25; Jemes 5:19, 20.
Nkwenkwe Na-akpali Ime Ihe
A gwawo ọtụtụ ndị mmadụ na “ikwere na Jisọs” bụ otu ihe omume nakwa na ọ bụghị iwu na okwukwe anyị ga-esiru ike ịkpali nrubeisi. Ma Bible ekweghị na nke a. Jisọs asịghị na a zọpụtawo ndị malitere ịga n’ụzọ ndị Kraịst. Kama nke ahụ, o kwuru, sị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 10:22) Bible ji ụzọ ndị Kraịst anyị tụnyere ịgba ọsọ, na-enwe nzọpụta ịbụ ihe mgbata n’ọsọ n’ọgwụgwụ ya. Ọ na-agbakwa ume, sị: “Na-agbanụ otú a, ka unu wee gbata.”—1 Ndị Kọrint 9:24.
Ya mere, “ịnara Kraịst” gụnyere ihe karịrị nanị ịnara ngọzi nile nke àjà kasị ukwuu nke Jisọs na-enye. A chọrọ nrubeisi. Pita onyeozi na-asị na ikpe ikpe na-amalite “n’ụlọ Chineke,” ma na-agbakwụnye, sị: ‘Ma ọ bụrụ na o buru ụzọ site n’ahụ anyị malite, gịnị ga-abụ ọgwụgwụ nke ndị na-ekwenyeghị ozi ọma nke Chineke?’ (1 Pita 4:17) Ya mere anyị aghaghị ime ihe karịrị nanị ịnụ ma kwere. Bible na-asị na anyị aghaghị ‘ịghọ ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghị ndị na-anụ nanị, na-arafu [onwe anyị].’—Jemes 1:22.
Ozi Nile nke Jisọs n’Onwe Ya
Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe nwere ozi ndị sitere n’aka Jisọs, ndị e sitere n’aka Jọn zie ọgbakọ asaa nke ndị Kraịst oge mbụ. (Mkpughe 1:1, 4) Jisọs ọ̀ sịrị na ebe ọ bụ na ndị nọ n’ọgbakọ ndị a ebuworị ụzọ “nara” ya, na nke ahụ ezuola? Ee e. O toro ọrụ ha, ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na ntachi obi ha ma kwuo banyere ịhụnanya, okwukwe, na ije ozi ha. Ma o kwuru na Ekwensu ga-anwa ha ọnwụnwa nakwa na a ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ “n’otu n’otu dị ka ọrụ nile [ha] si dị.”—Mkpughe 2:2, 10, 19, 23.
Jisọs si otú a kọwaa ibu ọrụ dị nnọọ ukwuu karịa ihe ọtụtụ ndị mmadụ ghọtaworo mgbe a gwara ha na nzọpụta ha bụ “ọrụ a rụsịworo” ngwa ngwa ha “naara” ya ná nzukọ okpukpe. Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya, ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m. N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ichebe mkpụrụ obi ya ga-atụfu ya; ma onye ọ bụla nke tụfuru mkpụrụ obi ya n’ihi m ga-achọta ya.”—Matiu 16:24, 25, NW.
Jụ onwe anyị? Ịnọgide na-eso Jisọs? Nke ahụ ga-achọ mgbalị. Ọ ga-agbanwe ndụ anyị. Ma, Jisọs ọ̀ sịrị n’ezie na ụfọdụ n’ime anyị pụrụ ọbụna ‘ịtụfu mkpụrụ obi anyị’—ịnwụ n’ihi ya? Ee, ụdị okwukwe ahụ na-abịa nanị ma e nwee ihe ọmụma nke ihe ndị magburu onwe ha ị pụrụ ịmụta site n’ịmụ Okwu Chineke. Ọ pụtara ìhè n’ụbọchị ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè bụ́ ndị ‘na-enweghịkwa ike iguzogide amamihe na Mmụọ Nsọ o ji ekwu okwu’ tụrụ Stifen nkume. (Ọrụ 6:8-12; 7:57-60) Ọtụtụ narị Ndịàmà Jehova nwụrụ n’ogige ịta ahụhụ Nazi kama imebi akọ na uche ha nke e ji Bible zụọ egosiwo okwukwe dị otú ahụ n’oge anyị.a
Ịnụ Ọkụ n’Obi nke Ndị Kraịst
Anyị aghaghị ijidesi okwukwe ndị Kraịst anyị ike n’ihi na, n’adịghị ka ihe ị pụrụ ịnụ n’ụfọdụ chọọchị ma ọ bụ n’ihe omume okpukpe nke telivishọn, Bible na-asị na anyị pụrụ ịdapụ. Ọ na-akọ banyere ndị Kraịst hapụrụ “ụzọ guzoziri eguzo.” (2 Pita 2:1, 15) N’ihi ya ọ dị anyị mkpa ‘iwere egwu na ịma jijiji na-arụpụta karị nzọpụta nke onwe anyị nke ukwuu.’—Ndị Filipaị 2:12; 2 Pita 2:20.
Ọ̀ bụ otú a ka ndị Kraịst narị afọ mbụ, ndị nụrụ n’ezie mgbe Jisọs na ndị ozi ya ziri ihe, ghọtara okwu ahụ? Ee. Ha maara na ha aghaghị ime ihe. Jisọs sịrị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.
Ọnwa abụọ mgbe Jisọs kwusịrị nke ahụ, e mere 3,000 ndị mmadụ baptism nanị n’otu ụbọchị. Ọnụ ọgụgụ nke ndị kwere ekwe mụbara ngwa ngwa ruo 5,000. Ndị ahụ kwere ekwe ziri ndị ọzọ ihe. Mgbe mkpagbu gbasara ha, nanị ihe o mere bụ ịgbasa ozi ha. Bible na-asị na ọ bụghị nanị ndị ndú ole na ole kama “ndị gbasara jegharịrị na-ezisa ozi ọma, bụ́ okwu Chineke.” Ya mere, ihe dị ka 30 afọ mgbe nke a gasịrị, Pọl onyeozi pụrụ ide na ozi ọma ahụ abụrụwo nke “e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.”—Ọrụ 2:41; 4:4; 8:4; Ndị Kọlọsi 1:23.
Pọl atọghataghị ndị mmadụ, dị ka ụfọdụ ndị okwuchukwu TV na-eme, site n’ịsị: ‘Nara Jisọs ugbu a, a ga-azọpụtakwa gị ruo mgbe ebighị ebi.’ O nweghịkwa obi ike nke onye ụkọchukwu bụ́ onye America bụ́ onye dere, sị: “Dị ka nwa okoro nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, . . . a zọpụtaworị m.” Ihe karịrị 20 afọ mgbe Jisọs n’onwe ya họrọsịịrị Pọl ịga kwusaara ndị mba ọzọ ozi ndị Kraịst, onyeozi a na-arụsi ọrụ ike dere, sị: “Ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m: ka mụ onwe m ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla, mgbe m kwusasịrị okwu Chineke nye ndị ọzọ.”—1 Ndị Kọrint 9:27; Ọrụ 9:5, 6, 15.
Nzọpụta bụ onyinye Chineke na-enye n’efu. A pụghị ịrụta ya n’ọrụ. Ma ọ chọrọ mgbalị n’akụkụ anyị. Ọ bụrụ na mmadụ nyere gị onyinye bara uru ma i gosighị ekele zuru ezu iji were ya ma jide ya, enweghị obi ekele gị pụrụ ịkpali onye ahụ nyere ya inye ya onye ọzọ. Olee otú ọbara ndụ Jisọs Kraịst baruru n’uru? Ọ bụ onyinye e nyere n’efu, ma anyị aghaghị igosipụta ekele dị omimi maka ya.
Ezi ndị Kraịst nọ n’ọnọdụ ndị a zọpụtara azọpụta n’echiche nke na ha nọ n’ọnọdụ a nwapụtara anwapụta n’ihu Chineke. Dị ka otu ìgwè, e ji nzọpụta ha n’aka. N’otu n’otu, ha aghaghị iru ihe ndị Chineke chọrọ. Otú ọ dị, anyị pụrụ ịda, n’ihi na Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla anọgideghị n’ime m, a tụpụ ya n’èzí dị ka alaka, ọ kpọnwụọkwa.”—Jọn 15:6.
“Okwu Chineke Dị Ndụ”
Nkwurịta okwu ahụ e hotara na mmalite nke isiokwu bu ụzọ weere ọnọdụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 60 afọ gara aga. Johnny ka kwenyere na nzọpụta na-abịa nanị site na Jisọs Kraịst, ma ọ na-aghọta na anyị aghaghị ime mgbalị inweta ya. Ọ nọgidere na-ekwenye na Bible na-ezo aka na nanị isi iyi nke olileanya maka ihe a kpọrọ mmadụ nakwa na anyị aghaghị ịmụ akwụkwọ ahụ magburu onwe ya, bụrụ ndị ọ kpaliri, ma kwe ka ọ kpasuo anyị ịrụ ọrụ ịhụnanya, okwukwe, obi ọma, nrubeisi, na ntachi obi. Ọ zụlitewo ụmụ ya ikwenye otu ihe ndị ahụ, ugbu a kwa obi dị ya ụtọ ịhụ ha onwe ha kwa ka ha na-azụ ụmụ ha n’otu ụzọ ahụ. Ọ dị ya ka ha bụrụ na onye ọ bụla nwere ụdị okwukwe ahụ, ọ na-emekwa ihe nile o nwere ike ime iji kụnye ya n’ime obi na uche nke ndị ọzọ.
E nyere Pọl onyeozi ike mmụọ nsọ ide na “okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Ọ pụrụ ịgbanwe ndụ. Ọ pụrụ ịkpasu gị ịrụ ọrụ ịhụnanya, okwukwe, na nrubeisi ndị sitere n’obi. Ma ị ghaghị ime ihe karịrị nanị “ịnara” ihe Bible na-ekwu n’isi efu. Mụọ ya ma kwee ka ọ kpalie obi gị. Kwee ka amamihe ya na-edu gị. Ihe dị ka 5,000,000 Ndịàmà nke Jehova wepụtara onwe ha n’ihe karịrị 230 ala na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Iji hụ ihe ị pụrụ ịmụta site n’ụdị ọmụmụ ihe dị otú ahụ, degara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ. Okwukwe na ume ime mmụọ ị ga-enweta ga-atọ gị ụtọ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’akwụkwọ ya bụ́ The Nazi State and the New Religions: Five Case Studies in Non-Conformity, Dr. Christine E. King kọrọ, sị: “A tụrụ otu n’ime Ndịàmà [Jehova] abụọ ọ bụla bụ́ ndị Germany mkpọrọ, otu n’ime anọ ọ bụla tụfuru ndụ ya.”
[Igbe dị na peeji nke 7]
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji “Na-agbasi Mgba Ike n’Ihi Okwukwe Ahụ”?
Akwụkwọ Bible bụ́ Jud bụ nke e degaara “ndị a kpọworo . . . , e debewokwaara Jisọs Kraịst.” Ọ̀ sịrị na nzọpụta ha bụ ihe e ji n’aka n’ihi na ha ‘anarawo Jisọs’? Ee e, Jud gwara ndị Kraịst dị otú ahụ ka ha “na-agbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ.” O nyere ha ihe atọ mere ha ga-eji na-eme otú ahụ. Nke mbụ, Chineke “zọpụtararị otu ndị n’ala Ijipt,” ma ọtụtụ n’ime ha dapụrụ ka oge na-aga. Nke abụọ, ọbụna ndị mmụọ ozi nupụrụ isi wee ghọọ ndị mmụọ ọjọọ. Nke atọ, Chineke bibiri Sọdọm na Gọmọra n’ihi omume mmekọahụ dị oké njọ e mere n’obodo ukwu ndị ahụ. Jud na-enye ihe ndekọ Bible ndị a “dị ka ihe ngosi.” Ee, ọbụna ndị kwere ekwe “e debewokwaara Jisọs Kraịst” aghaghị ịkpachara anya ka ha ghara ịdapụ site n’ezi okwukwe ahụ.—Jud 1-7.
[Igbe dị na peeji nke 8]
Olee nke Ziri Ezi?
Bible na-asị: “A na-agụ mmadụ n’onye ezi omume site n’okwukwe, mgbe ọ ka-arụghị ọrụ iwu.” Ọ na-asịkwa: “A na-esite n’ọrụ gụọ mmadụ n’onye ezi omume, a dịghị esitekwa nanị n’okwukwe.” Olee nke ziri ezi? À na-agụ anyị ná ndị ezi omume site n’okwukwe ka ọ bụ site n’ọrụ?—Ndị Rom 3:28; Jemes 2:24.
Azịza kwekọrọ ekwekọ nke sitere na Bible bụ na ha abụọ zichara ezi.
Ruo ọtụtụ narị afọ Iwu ahụ nke Chineke nyere site n’aka Mosis achọworị ka ndị Juu na-efe ofufe chụọ àjà ụfọdụ ma nye onyinye, debe ụbọchị ememe dị iche iche, biekwa ndụ kwekọrọ na nri na ihe ndị ọzọ a chọrọ. Ụdị “ọrụ iwu” ndị dị otú ahụ ma ọ bụ “ọrụ” nkịtị adịkwaghị mkpa mgbe Jisọs chụsịrị àjà ahụ zuru okè.—Ndị Rom 10:4.
Ma eziokwu bụ na àjà kasị ukwuu nke Jisọs nọchiri ọrụ ndị a a na-arụ n’okpuru Iwu Mosis apụtaghị na anyị pụrụ ileghara ntụziaka Bible anya. Ọ na-asị: “Ọbara Kraịst . . . ga-esi aṅaa ghara ime akọ na uche anyị ka ọ dịkarịa ọcha nke ukwuu hie nne pụọ n’ọrụ nile nwụrụ anwụ [ndị mere ochie karị] ikpere Chineke dị ndụ?”—Ndị Hibru 9:14.
N’ụzọ dị aṅaa ka anyị na-esi ‘ekpere Chineke dị ndụ’? Tinyere ihe ndị ọzọ, Bible na-agwa anyị ka anyị lụsoo ọrụ nile nke anụ ahụ ọgụ, guzogide omume rụrụ arụ nke ụwa, na izere ọnyà ya nile. Ọ na-asị: “Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike,” tụpụ “mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu,” na “werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu, na-elegide Jisọs anya, bụ́ onye ndú na onye mmezu nke okwukwe anyị.” Bible na-agbakwa anyị ume ‘ka ike ghara ịgwụ anyị, anyị wee daa mbà ná mkpụrụ obi anyị.’—1 Timoti 6:12; Ndị Hibru 12:1-3; Ndị Galetia 5:19-21.
Anyị adịghị arụta nzọpụta n’ọrụ site n’ime ihe ndị a, n’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ime ihe zuru ezu iji kwesị ụdị ngọzi ahụ pụrụ iche. Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ịnata onyinye a magburu onwe ya ma ọ bụrụ na anyị aghara igosipụta ịhụnanya na nrubeisi anyị site n’ime ihe ndị ahụ Bible sịrị na Chineke na Kraịst chọrọ ka anyị mee. Ma e nweghị ọrụ iji gosipụta okwukwe anyị, anyị ịsị na anyị na-eso Jisọs ga-abụ nke na-ezitụghị ezi, n’ihi na Bible na-ekwu hoo haa, sị: “Okwukwe, ma ọ bụrụ na o nweghị ọrụ, ọ bụ ihe nwụrụ anwụ n’onwe ya.”—Jemes 2:17.
[Foto dị na peeji nke 7]
Mụọ Bible, ka ọ kpaliekwa gị