Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 12/15 p. 10-15
  • “Onye Na-anụ, Ya Sịkwa, Bịa”!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Onye Na-anụ, Ya Sịkwa, Bịa”!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpa nke Mmiri nke Ndụ Ebilite
  • Òtù Nwanyị A Na-alụ Ọhụrụ Akpọọkwa Òkù ahụ, sị, “Bịa”
  • Mmụọ Nsọ na Nwanyị ahụ A Na-alụ Ọhụrụ Na-asị, “Bịa”
  • Atụrụ Ọzọ Esonye n’Ịsị, “Bịa”
  • Sonye Ugbu A ná Mkpọsa ahụ
  • “Mmụọ Nsọ na Nwaanyị Ahụ a Na-alụ Ọhụrụ Na-asị: ‘Bịa!’”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ṅụrịa Ọṅụ n’Ihi Ọlụlụ Nwunye nke Nwa Atụrụ Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Mmiri Na-asụpụta Asụpụta Inye Ndụ Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Mkpughe na Gị Onwe Gị
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 12/15 p. 10-15

“Onye Na-anụ, Ya Sịkwa, Bịa”!

N’ime afọ na-abịanụ, Ndịàmà Jehova ndị nọ n’ihe karịrị 200 ala gburugburu ụwa ga na-etinye onwe ha n’ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’isiokwu dịịrị afọ 1991 ha, bụ́: “ONYE NA-ANỤ, YA SỊKWA, BỊA.”

“Mmụọ nso na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa. Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.”—MKPUGHE 22:17

1. Ọ̀ bụ ná “mmiri” dị aṅaa ka a na-akpọ anyị òkù ka anyị “bịa”?

A NA-AKPỌ gị òkù sị “bịa.” Bịa mee gịnị? Ee, bịa were mmiri mejụọ akpịrị nke na-akpọ gị nkụ. Nke a abụghị mmiri efu, kama ọ bụ otu mmiri ahụ Jisọs Kraịst kwuru okwu banyere ya mgbe ọ gwara nwanyị onye Sameria nọ n’olulu mmiri, sị: “Onye ọ bụla nke ga-aṅụ mmiri ahụ nke mụ onwe m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi; kama mmiri ahụ nke mụ onwe m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi mmiri na-asụpụta hie nne ruo ndụ ebighị ebi.” (Jọn 4:14) Olee ebe Jisọs si nweta “mmiri” nke a?

2. Gịnị bụ isi iyi nke “mmiri” ahụ, ọ̀ bụkwa nanị mgbe gịnị mesịrị ka ọ pụrụ ịsọpụta?

2 Jọn onyeozi nwere ihe ùgwù nke ịhụ n’ọhụụ ebe “mmiri” nke a si na-asọpụta, dị ka o hotara ná Mkpughe 22:1: “O wee gosi m osimiri nke mmiri nke ndụ, na-enwu dị ka crystal, ka ọ na-esi n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ pụta.” Ee, isi iyi nke mmiri nke a dị ọcha dị ka crystal nke nwere ihe ndị nwere ihe ndị na-enye ndụ n’ime ya abụghị onye ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị Onye ahụ Na-enye Ndụ, bụ́ Jehova n’onwe ya, onye na-eme ka e nweta ya site n’aka Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. (Tụlee Mkpughe 21:6.) Ebe ọ bụ na e hotara “ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ,” ọ ghaghị ịbụ na mmiri ahụ malitere ịsọpụta mgbe e guzobesịworo Alaeze Mesaịa ahụ na 1914, ya bụ, mgbe ụbọchị Onyenwe anyị ahụ malitesịworo.—Mkpughe 1:10.

3, 4. Gịnị ka “mmiri” ahụ nọchiri anya ya, ọ bụkwa òle ndị ka ọ ga-adịrị?

3 Gịnị ka mmiri nke ndụ nke a sere onyinyo ya? O sere onyinyo ndokwa Chineke mere iwetaghachi ndụ zuru okè nke mmadụ, bụ́ ndụ ebighị ebi n’izu okè n’elu ala nke e meworo ka ọ ghọọ paradaịs. Mmiri nke ndụ nọchiri anya ndokwa nile e meworo maka ndụ site na Jisọs Kraịst. Ihe ndị a nile hà dị adị ugbu a? Ee e, ọ bụghị ha nile, n’ihi na Chineke aghaghị ibu ụzọ wepụ ajọ usoro ihe dị ugbu a, ya na onye ọchịchị ya a na-adịghị ahụ anya, Setan bụ Ekwensu. Ma anyị pụrụ iwere “mmiri” nke a nke dị adị ugbu a site n’ịnụ na irube isi n’ozi ọma ahụ nke Alaeze na ime ka ndụ anyị kwekọọ na ya.—Jọn 3:16; Ndị Rom 12:2.

4 Otú a, mgbe e mesịrị ka Jọn hụ ‘osimiri nke ndụ’ ahụ, Jisọs gwara Jọn okwu banyere nzube Ya n’ime ka mmụọ ozi Ya weta ọhụụ ahụ. Mgbe ahụ, Jọn nụrụ nkwupụta okwu ahụ bụ: “Mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asịkwa, Bịa. Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) Ya mere, ndị ohu Chineke na-ezisa ọkpụkpọ òkù ahụ nye ndị akpịrị na-akpọ nkụ ka ha malite ịnara ndokwa nile Chineke mere maka inweta ndụ ebighị ebi n’elu ala site n’aka Nwa Atụrụ Chineke.—Jọn 1:29.

Mkpa nke Mmiri nke Ndụ Ebilite

5. Olee ụzọ ihe a kpọrọ mmadụ si malite inwe mkpa nke ndokwa nke a nke Chineke?

5 Ọ bụ ihe dị mwute na nne na nna mbụ nke ezinụlọ mmadụ anọgideghị n’ụzọ ndụ nke gaara enyeworị ụmụ ha ohere nke inweta ndụ mmadụ zuru okè ruo mgbe ebighị ebi n’ebe obibi nke bụ paradaịs. Ka ihe a kpọrọ mmadụ wee nweta ndụ ebighị ebi, a chọrọ n’aka Adam iji ezi uche họrọ ijere Onye Okike ya ozi ná nrubeisi. N’okpuru nduzi nke otu mmụọ nnupụisi e kere eke, Iv malitere ihe omume nke rụpụtaara ihe a kpọrọ mmadụ ọnwụ, Adam, bụ́ di ya zuru okè, họrọkwara isonyere ya n’ụzọ ahụ nke na-eweta ọnwụ. Otú a, dị ka onye gaje inye ọgbọ ndị na-abịa n’ihu nke ihe a kpọrọ mmadụ ndụ nkịtị, ọ bụ n’ezie Adam webatara ịrụ ọrụ nke ọnwụ n’ime ezinụlọ dum nke ihe a kpọrọ mmadụ. Otú ahụ ka o si bụrụ na Bible na-asị: “Dị ka mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Ọ bụ mgbe Adam na Iv dabasịworo ná mmehie ka ha malitere ịmụta ụmụ.—Abụ Ọma 51:5.

6. N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ndokwa ka “mmiri” ahụ dịrị?

6 À ga-egbochi Chineke ruo mgbe ebighị ebi n’imezu nzube ya nke inwe ụwa bụ paradaịs nke jupụtara n’ụmụ mmadụ zuru okè? Azịza Bible bụ, ee e! Otú o sina dị, iji wee mezuo nzube ya, Jehova mere ndokwa ịhụnanya nke ga-eme ihe megidere ajọ ọdịda ahụ Adam dara, ma kwekọọkwa n’ụzọ zuru ezu n’ikpe ziri ezi na ezi omume, nke ọ bụ ngosipụta ya zuru ezu nke kasịkwa elu. O mere nke a site ‘n’osimiri nke mmiri nke ndụ.’ Site na ya, ọ ga-ewetaghachiri ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ndụ mmadụ zuru okè, bụ́ ndị ohere ha nwere ịbịakwute Isi Iyi nke ndụ ahụ funarịrị. Osimiri nke a na-asọ n’ụzọ zuru ezu n’ime Ọchịchị Puku Afọ ahụ nke Jisọs Kraịst. Otú a, n’oge nile nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, ụmụ mmadụ, gụnyere ndị ahụ a kpọlitere site n’ọnwụ, aghaghị ịṅụ site ‘n’osimiri nke mmiri nke ndụ ahụ.’—Tụlee Ezikiel 47:1-10; Ọrụ Ndịozi 24:15.

7. N’ihe ndabere dị aṅaa ka e mere ndokwa maka “mmiri” ahụ?

7 Jehova na-enweta ọṅụ ná ndụ nke ya onwe ya, ọ na-enwetakwa ọṅụ site n’inye ụfọdụ n’ime ihe okike ya ihe Ùgwù nke ịdị ndụ dị ka ndị nwere ọgụgụ isi. Ihe ndabere nke ndokwa Jehova maka inye ndụ bụ àjà mgbapụta Jisọs. (Mak 10:45; 1 Jọn 4:9, 10) O metụtakwara Okwu Chineke, bụ́ nke Bible na-akpọ “mmiri” mgbe ụfọdụ. (Ndị Efesọs 5:26) Jehova Chineke nweere onwe ya ịsị, “Bịa” gwa ụmụ mmadụ e kere eke, bụ́ ndị ndokwa ndị mbụ Chineke meere mmadụ abụọ mbụ ahụ zuru okè, bụ́ Adam na Iv, funarịrị.

Òtù Nwanyị A Na-alụ Ọhụrụ Akpọọkwa Òkù ahụ, sị, “Bịa”

8. Ọ̀ bụ nye òle ndị, ọ̀ bụkwa òle mgbe, ka e wepụtara “mmiri” nke a nke mbụ ya?

8 Ndị mbụ zipụrụ ọkpụkpọ òkù ahụ bụ “bịa” bụ ndị mejupụtara nwanyị ihe atụ ahụ a na-alụ ọhụrụ nke Nwa Atụru ahụ, bụ́ Ọkpara bụ mmụọ, nke Jehova buru ụzọ mụọ. (Mkpughe 14:1, 3, 4; 21:9) Nwanyị ime mmụọ ahụ Kraịst na-alụ ọhụrụ adịghị agwa onwe ya, sị, “Bịa,” ya bụ, gwa ndị ahụ Jehova Chineke ka ga-achịkọbata dị ka akụkụ nke òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ iji wee mezuo ya 144,000 n’ọnụ ọgụgu. Okwu ọkpụkpọ okù ndị ahụ bụ ndị e zipụụrụ ụmụ mmadụ ndị nwere olileanya inweta ndụ mmadụ zuru okè n’elu ala mgbe Amagedọn gasịrị. (Mkpughe 16:14, 16) N’ime mgbe ọgwụgwụ nke a nke usoro ihe dị ugbu a kemgbe 1914, anyị anụwo ka “nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ” na mmụọ nsọ nke Chineke na-ejikọ aka n’izipụ ọkpụkpọ òkù ahụ.

9. Anyị si aṅaa mara na ọ bụghị nanị maka ìgwè dị nta?

9 Ọ bụ ihe na-akpali akpali ịhụ na akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-egosi na “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ,” ga-azaghachi ná mkpọsa nke ozi ọma nke a nke Alaeze Chineke, na ha ga-eguzosikwa onwe ha ike n’akụkụ nke ọchịchị Alaeze ahụ. (Mkpughe 7:9, 10, 16, 17) Ị̀ bụ otu n’ime oké ìgwè mmadụ ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, “onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa.”

Mmụọ Nsọ na Nwanyị ahụ A Na-alụ Ọhụrụ Na-asị, “Bịa”

10. N’òle ebe ka mmiri ihe atụ nke a na-aghaghị isi na-asọpụta, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

10 Ma gịnị mere na a kpọtụghị Chineke na Onye ahụ Na-alụ Nwanyị Ọhụrụ nke ihe atụ aha ná Mkpughe 22:17? Nke mbụ, rịba ama na amaokwu ahụ ekwughị onye mmụọ nsọ ahụ na-arụ ọrụ ná nduzi ya. Ma, ozuzo aka e zoro n’ebe mmụọ ahụ dị na-adọrọ uche anyị gaa n’ebe Jehova Chineke n’onwe ya nọ. O wepụghị Nna ahụ n’okwu ahụ, ebe ọ bụ ya bụ Isi Iyi nke mmụọ nsọ. Nke abụọ, Ọkpara ahụ na-eso Nna ya emekọ ihe n’ụzọ zuru ezu, dị ka ya onwe ya kwuru, sị: “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe ya, ma ọ bụghị ihe ọ hụrụ na Nna ya na-eme.” (Jọn 5:19) Ọzọkwa, ọ bụ ezie na ọkpụkpọ òkù a bụ nkwupụta okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke ebe bụ isi o si bịa bụ n’ebe Jehova Chineke nọ, ma ụmụ mmadụ pụrụ ịnata nduzi sitere n’aka Chineke, ma ọ bụ ‘okwu sitere ná mmụọ nsọ,’ site n’aka Jisọs Kraịst, bụ́ “Okwu ahụ.” (Mkpughe 22:6; leekwa 22:17, Reference Bible, nkọwa ala ala peji; Jọn 1:1) Ya mere, anyị na-ejikọta Kraịst, bụ́ Onye ahụ Na-alụ Nwanyị Ohụrụ, na ọkpụkpọ òkù a. Ee, anyị pụrụ ijide n’aka na ma Jehova Chineke, bụ́ Nna nke Onye ahụ Na-alụ Nwanyị Ohụrụ, ma Jisọs Kraịst, bụ́ Onye ahụ Na-alụ Nwanyị Ohụrụ, na-esonyere “nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ” site ná mmụọ nsọ n’ịsị, “Bịa.”

11, 12. (a) Ngosi mbụ dị aṅaa ka e mere nke na-egosi na ọkpụkpọ òkù ahụ ịbịa ṅụọ mmiri bụ nke a ga-agbasa agbasa? (b) Olee otú okwu ahụ si na-edowanye anya mgbe ọtụtụ afọ na-agabiga?

11 Ruo ọtụtụ iri afọ, ọkpụkpọ òkù a bụ “bịa” anọwo na-adapụta ụda nye ndị akpịrị na-akpọ nkụ maka “mmiri nke ndụ.” Ọbụna laa azụ na 1918, òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ malitere ikwusa ozi nke metụtara ndị ahụ pụrụ ịdị ndụ n’elu ala karịsịa. Ọ bụ okwu ihu ọha ahụ nke isiokwu ya bụ “Ọ Pụrụ Ịbụ na Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Anwụ Ma Ọlị.” Nke a nyere olileanya nke bụ na ọtụtụ ndị ga-alanarị Amagedọn, wee nweta ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs n’okpuru Alaeze Mesaịa nke Chineke. Ma ozi ahụ egosighị n’ụzọ doro anya ụzọ a ga-esi nweta ihe ùgwù nke a nke nlanarị, e wezụga site n’ime ezi omume n’ụzọ sara mbara.

12 Iji wee jiri ọkpụkpọ òkù ahụ bụ, “Bịa” rute ọtụtụ ndị karị, na 1922, e zipụụrụ ndị nile ozi, bụ́ ndị nwere mmasị n’ijere Chineke ozi, sị: “Kpọsaanụ, Eze na Alaeze ahụ.” Na 1923, òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ghọtara na “atụrụ” na “ụmụ ewu” ndị ahụ dị n’ilu Jisọs na Matiu 25:31-46 ga-apụta ìhè tupu Amagedọn. Mgbe ahụ, na 1929, Ụlọ Nche (Bekee) nke March 15 bipụtara isiokwu ahụ bụ “Ọkpụkpọ Òkù nke Amara.” Akụkụ akwụkwọ nsọ nke isiokwu ahụ dabeere na ya bụ Mkpughe 22:17, o mekwara ka ibu ọrụ nke òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ pụta ìhè, bụ́ ịkpọkwa òkù ahụ bụ, “Bịa.”—peji 87-89.a

Atụrụ Ọzọ Esonye n’Ịsị, “Bịa”

13, 14. N’afọ ndị 1930, nkọwa ndị ọzọ dị aṅaa ka e nyere nke na-egosi na ndị ọzọ ga-aṅụkwa site ná mmiri ihe atụ ahụ?

13 Ọzọkwa, laarị azụ n’ihe dị ka 1932, Ụlọ Nche (Bekee) mere ka ibu ọrụ nke “atụrụ ọzọ” ahụ pụta ìhè, na ha ga-asịkwa, “Bịa.” (Jọn 10:16) Ná mbipụta ya nke August 1, peji 232, paragraf 29, ọ sịrị: “Ugbu a, ndịàmà Jehova nwere ịnụ ọkụ n’obi yiri nke Jihu, ha kwesịkwara ịgba òtù Jehonadab [atụrụ ọzọ] ahụ ume isonyere ha ma kere òkè n’ịkpọsara ndị ọzọ na alaeze Chineke dị nso.” Mgbe ahụ, mgbe o hotasịrị okwu sitere ná Mkpughe 22:17, paragraf ahụ sịrị: “Ka ndị ahụ e tere mmanụ gbaa ndị nile ga-achọ ikere òkè ume ikwusa ozi ọma nke alaeze ahụ. O bụghị iwu na ha aghaghị ịbụ ndị e tere mmanụ nke Onyenwe anyị ka ha wee kwusaa ozi Onyenwe anyị. Ọ bụ ihe oké nkasi obi nye ndịàmà Jehova ịmara ugbu a na e nyere ha ikike iburu mmiri nke ndụ bujere òtù ụmụ mmadụ ndị a pụrụ iduru gabiga Amagedọn, nyekwa ha ndụ ebighị ebi n’elu ala n’ihi ịdị mma dị ukwuu nke Jehova.”b

14 Malite na 1934 gaa n’ihu, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ mere ka ọ pụta ìhè na atụrụ ọzọ ndị a aghaghị ịrara onwe ha ugbu a nye Chineke, gosipụtakwa nraranye nke a site na baptism ime mmiri, mgbe ahụ, wee sonyere òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ n’ịsị, “Bịa” gwa ndị ọzọ akpịrị na-akpọkwa nkụ. Otú a, e nwere ọkpụkpọ òkù pụtara ìhè ugbu a nke òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-ezipụ maka nchịkọta nke atụrụ ọzọ ndị a akpịrị na-akpọ nkụ ịbata n’ime “otu ìgwè atụrụ” nke dị n’okpuru “otu onye ọzụzụ atụrụ,” bụ́ Jisọs Kraịst. (Jọn 10:16) Na 1935, a kpaliri ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ ná mgbakọ ọha mmadụ ha nwere n’afọ ahụ, ịmata na òtù mmadụ ndị ahụ yiri atụrụ ndị ha nọ na-asị, “Bịa” bụ n’ezie “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke Mkpughe 7:9-17. Nke a mere nnọọ ka ọrụ ịkpọ òkù ahụ gaa n’ihu nke ukwuu.

15. Olee otú ọkpụkpọ òkù ahụ bụ “Bịa” si metụta “mmụọ nsọ”?

15 N’ịsị, “Bịa,” òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-eme ihe kwekọrọ ná mmụọ Chineke. Site n’iji mmụọ ya mee ihe n’ikpughe ihe amụma ndị ahụ dị n’Okwu ya e dere ede pụtara, o mere ka ihe ahụ fọdụrụ n’òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ zipụ ọkpụkpọ òkù ahụ. Amụma ndị a ọkpụkpọ òkù ha dabeere na ha bụ ndị mmụọ Chineke kpaliworo. Ya mere, dị ka a pụrụ ikwu ya, ọ bụ mmụọ Chineke nke na-abịa site na Kraịst na nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ na-agwa oké ìgwè mmadụ ahụ nke ndị yiri atụrụ, sị, “Bịa.”—Mkpughe 19:10.

16. Olee ụzọ e si jikọta mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ n’ọkpụkpọ òkù ahụ taa?

16 Ruo taa, mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ, nke ihe ahụ fọdụrụ nọchiri anya ha, ‘nọgidere na-asị, Bịa.’ Ihe ahụ fọdụrụ na-agwa atụrụ ọzọ ndị a ka ha kpọọkwa ndị ọzọ okù ka ha “bịa.” Ha ekwesịghị idebe “mmiri nke ndụ,” dị ka e si nwee ya taa, maka nanị onwe ha. Ha aghaghị irube isi n’iwu nke a sitere n’ọnụ “mmụọ nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ,” bụ́: “Onye na-anụ, ya sịkwa, Bịa.” Ndị ahụ nile na-emejụ akpịrị ịkpọ nkụ ha aghaghị ịkpọsakwa ọkpụkpọ òkù ahụ. Ha aghaghị ime ka o rutere onye ọ bụla n’agbanyeghị agbụrụ, mba, asụsụ, ma ọ bụ okpukpe onye ahụ nọ n’ime ya ugbu a—onye ọ bụla n’ebe ọ bụla! “Mmiri nke ndụ” e nwere ugbu a bụ ihe Ndịàmà Jehova na-akpọ ndị nile òkù, na-enyekwara ha aka ikere òkè na ya, n’efu!

17. Ụdị “mmiri” dị aṅaa ka e nwere taa?

17 Gburugburu ụwa, Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, nọ n’ezie na-eduzi oké ìgwè mmadụ ahụ “gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.” (Mkpughe 7:17) Nke a abụghị mmiri e metọrọ emetọ, kama ọ bụ mmiri dị ọcha, jụọ oyi, nke na-enweghị ntụpọ ọ bụla, nke sitere kpọmkwem n’Isi Iyi ya. Mmiri ihe atụ ndị a pụtara ihe karịrị mmiri nkịtị n’echiche nke ịghọta eziokwu Bible; ha pụtara ndokwa nile Chineke mere site n’aka Jisọs Kraịst ndị na-amalite ọbụna ugbu a idebe oké ìgwè mmadụ ahụ n’okporo ụzọ nke na-eduje n’inweta ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ.

Sonye Ugbu A ná Mkpọsa ahụ

18. Ruo ókè hà aṅaa ka ọkpụkpọ òkù ahụ gbasaruru n’oge anyị a?

18 Ka ọ dị ugbu a, ọnụ ọgụgụ nke oké ìgwè mmadụ nke a eruwo ọtụtụ nde. Ha ji ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-agbasa ozi ọma nke Alaeze ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi. Ha na-enye akụkọ ozi ha mgbe nile banyere ozi ubi ha jere n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ, bụ́ nke ruteworo 212 ala dị iche iche ugbu a. Ruo ókè oge kwere mee n’ime ọgwụgwụ nke a nke usoro ihe dị ugbu a, ọkpụkpọ òkù ahụ ga-anọgide na-aga n’ihu ruo ókè ndidi na ogologo ntachi obi Jehova Chineke, bụ́ Onye Ukwu ahụ Na-edebe Oge, kwere ka o ruo. Ọ ga-ama mgbe oge ya zuru, mgbe oge ahụ dị oké mkpa rukwara ka o wee mee ka mmadụ nile mara ya dị ka Jehova, dị nnọọ ka o kweworo nkwa ime dị ka e kwuworo ọtụtụ ugbo n’amụma Bible.—Ezikiel 36:23; 38:21-23; 39:7.

19. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na “mmiri” nke a bụ nke a na-enye n’efu?

19 Ya mere, mgbe oge ka fọdụrụ, ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ ji ọṅụ soro ihe ahụ fọdụrụ nke òtù nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-ekere òkè n’ịsị: ‘Bịa nara mmiri nke ndụ n’efu!’ Ndị na-akpọsa ozi ọma nke a na-echebe ndụ na-eme mkpọsa nke a n’efu, n’anaghị ego ọ bụla maka ozi ha na-eje mgbe ha nọ na-agbasa ozi Alaeze ahụ gburugburu ụwa.

20. Gịnị ka ọdịdị “mmiri” nke a dị ga-arụpụta?

20 Mmiri nke ndụ dị adị ugbu a gburugburu ụwa dum, ka mmadụ ndị chọrọ ikere òkè nwee ike ime otú ahụ n’ụzọ ga-eju ha afọ, nke ga-arụpụtakwara ha nchebe nke ndụ. Ihe a kpọrọ mmadụ a gbapụtaworo ga-enweta ọṅụ nke ndụ na-adịghị agwụ agwụ kpọmkwem n’elu ala ebe a, bụ́ nke a ga-eme ka ọ ghọọ paradaịs, na-ewepụ nzube dị oké ọnụ ahịa nke Jehova n’ụta. Onye Okike anyị mere ụwa, ọ bụghị ka ọ tọgbọrọ n’efu, kama ka ọ bụrụ ogige Iden nke zuru ụwa ọnụ, ma ọ bụ, Paradaịs nke obi ụtọ, nke ụmụ mmadụ zuru okè ndị nọ n’onyinyo na ụdịdị nke Chineke ga-ebijupụta na ya.

21. Olee otú a ga-esi mezuo nzube Chineke maka elu ala?

21 N’ezie, ọ ga-abụ ihe ùgwù dị ebube nke ọnụ na-apụghị ịkọ, bụrụkwa ihe ọṅụ ịnọ n’ime ụwa ọhụrụ dị otú ahụ! Mgbe ahụ, a ga-emezu iwu ahụ Chineke nyere mmadụ abụọ mbụ ahụ na Jenesis 1:27, 28 n’ụba. N’ihi na Jehova ji nkà lebara ọdachi nke dakwasịrị ezinụlọ ihe a kpọrọ mmadụ anya, a ga-ebuda ala n’okpuru mmadụ ruo n’ókè nke ime ka ọ bụrụ paradaịs, a ga-ejikwa agbụrụ ụmụ mmadụ zuru okè mejupụta ya. Ee, Chineke ga-ahụ ihe nile o meworo, ma lee, ọ ga-adi mma nke ukwuu. Ị̀ ga-anọ n’ebe ahu? Ya bụrụ otú ahụ, ị ghaghị iji obi ekele malite ugbu a ịṅụ mmiri nke ndụ ahụ a na-enye n’efu. “Bịa” ṅụjuo afọ ma mejụọ akpịrị ịkpọ nkụ gị site ná mmiri nke ndụ nke maliteworo ịsọpụta ugbu a, nke ga-asọrukwa ozuzu ya n’ime Puku Afọ ahụ nke na-abịanụ. Onye ọ bụla nke na-anụ ọkpụkpọ òkù nke a dị ụtọ, ya sịkwa: “Bịa.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Gunyere ihe ndị ọzọ, isiokwu ahụ siri: “Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ a gbara àmà eziokwu ahụ n’ụzọ sara mbara dị ka e meworo ya n’ime afọ ole na ole gara aga. . . . Ihe ahụ fọdụrụ na-ewetara ha ozi obi ụtọ ahụ, ha na-agwakwa ha, si: ‘Onye ọ bụla ọ masịrị, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.’ A na-agwa ha na ha pụrụ iwere ọnọdụ ha ugbu a n’akụkụ nke Onyenwe anyị, megidekwa Ekwensu, ma nata ngọzi. Ọ́ bụghị òtù ụmụ mmadụ dị otú ahụ pụrụ ịchọ ịdị umeala n’obi na ezi omume ugbu a, bụrụkwa ndị e zobere n’ụbọchị ngosipụta iwe ya, e wee buru ha gabiga oké agha Amagedọn ahụ, ha wee dịrị ndụ ebighị ebi ma ghara ịnwụ anwụ? (Zef. 2:3) . . . Òtù ihe ahụ fọdụru kwesịrị ntụkwasị obi na-esonye n’ọkpụkpọ òkù amara ahụ ma na-asị, ‘Bịa.’ A ga-akpọsa ozi nke a gwa ndị ahụ nwere ọchịchọ ezi omume na eziokwu. A ghaghị ime nke a ugbu a.”

b Ụlọ Nche (Bekee) nke August 15, 1934, zokwara aka n’ibu ọrụ nke atụrụ ọzọ ahụ wee kwuo na peji 249, paragraf 31, si: “Òtù Jonadab bụ nke ndị ahụ ndị ‘na-anụ’ ozi nke eziokwu ahụ, ndị na-aghaghịkwa ịgwa ndị na-anụ olu ha, sị: ‘Bịa. Onye na-anụ, ya sikwa, Bịa. Onye akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa. Onye ọ bụla chọrọnụ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.’ (Mkpu. 22:17) Ndị so n’òtù Jonadab ahụ aghaghị isonyere ndị ahụ so n’òtù ahụ Jihu sere onyinyo ha, ya bụ, ndị e tere mmanụ, wee kpọsaa ozi nke alaeze ahụ, ọ bụ ezie na ha abụghị ndịàmà e tere mmanụ nke Jehova.”

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ “Mmiri” dị aṅaa ka a na-ezo aka na ya ná Mkpughe 22:17?

◻ Gịnị bụ isi iyi nke “mmiri” ahụ?

◻ N’ihi gịnị ka “mmiri” ahụ ji dị mkpa, oleekwa mgbe ọ pụrụ ịmalite ịsọpụta?

◻ N’ihe ọgụgụ anyị, gịnị ka ozuzo aka ahụ e zoro n’ebe “mmụo nsọ” dị na-egosi, ò sikwa aṅaa metụta “nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ”?

◻ Ònye pụrụ ikere òkè ná “mmiri” nke a, gịnịkwa ka ọ ga-arụpụta?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya