Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 54 p. 132-p. 133 para. 1
  • Jizọs Bụ “Achịcha Na-enye Ndụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Bụ “Achịcha Na-enye Ndụ”
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ezi Nri ahụ nke Sitere n’Eluigwe”
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ị̀ Tatụla Achịcha ahụ Na-enye Ndụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Olee Otú Ị Ga-esi Enweta Ndụ Ebighị Ebi?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Ihe Anyị Na-amụta n’Ọrụ Ebube Jizọs Rụrụ Nye Ndị Mmadụ Achịcha
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 54 p. 132-p. 133 para. 1
Ebe ụmụ nwoke na-ekpokọta mana, ụmụ nwaanyị ana-egwe ya ma jiri ya mee achịcha mbadamba

ISI NKE 54

Jizọs Bụ “Achịcha Na-enye Ndụ”

JỌN 6:25-48

  • JIZỌS BỤ “ACHỊCHA NKE SI N’ELUIGWE BỊA”

Mgbe Jizọs nọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Oké Osimiri Galili, ọ rụrụ ọrụ ebube nyejuo ọtụtụ puku mmadụ afọ. Ma, mgbe ha chọwara ime ya eze, ọ gbapụrụ. N’abalị ụbọchị ahụ, ọ gara ije n’elu oké osimiri mgbe ebili mmiri na-eme ma napụta Pita, bụ́ onye gakwara ije n’elu mmiri ma malite imikpu mgbe o nwewere obi abụọ. Jizọs mekwara ka oké ifufe dajụọ. Ọ ga-abụ na ihe a o mere mere ka ụgbọ ndị na-eso ụzọ ya ghara ikpu.

Ugbu a, Jizọs alọghachila Kapaniọm, nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Oké Osimiri Galili. Ndị ahụ ọ rụrụ ọrụ ebube nyejuo afọ chọtara ya ma jụọ ya, sị: “Olee mgbe i ji rute ebe a?” Ma, Jizọs baara ha mba, sị ha na ihe mere ha ji na-achọ ya bụ ka ya nyekwa ha nri ọzọ. Ọ gwara ha, sị: “Rụọnụ ọrụ, ọ bụghị iji nweta nri nke na-ala n’iyi, kama iji nweta nri na-adịgide adịgide nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.” Ha jụziri ya, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme iji rụọ ọrụ Chineke?”—Jọn 6:25-28.

Ha nwere ike ịna-eche na Jizọs ga-agwa ha banyere ọrụ ndị e dere n’Iwu ahụ. Ma, Jizọs gwara ha banyere ọrụ kacha mkpa ha ga-arụ. Ọ sịrị ha: “Nke a bụ ọrụ Chineke, ka unu nwee okwukwe n’onye Onye ahụ zitere.” Ma, ndị ahụ enweghị okwukwe na Jizọs n’agbanyeghị ihe niile Jizọs merela. Ha gwaziri Jizọs ka o meere ha ihe ịrịba ama ka ha nwee ike inwe okwukwe na ya. Ha jụrụ ya, sị: “Olee ọrụ ị ga-arụ? Nna nna anyị hà riri mana n’ala ịkpa, dị nnọọ ka e dere, sị, ‘O nyere ha achịcha si n’eluigwe ka ha rie.’”—Jọn 6:29-31; Abụ Ọma 78:24.

N’ihi arịrịọ a ha na-arịọ ka Jizọs meere ha ihe ịrịba ama, Jizọs gwara ha Onye ọrụ ebube ndị ahụ si n’aka. Ọ sịrị ha: “Ana m asị unu, ọ bụghị Mozis nyere unu achịcha ahụ si n’eluigwe, kama ọ bụ Nna m nyere unu ezi achịcha nke si n’eluigwe. N’ihi na achịcha nke Chineke bụ onye ahụ nke si n’eluigwe bịa, nke na-enyekwa ụwa ndụ.” Ma, ha aghọtaghị ihe Jizọs na-ekwu. Ha rịọwaziri ya, sị: “Onyenwe anyị, na-enye anyị achịcha a mgbe niile.” (Jọn 6:32-34) Ma, olee “achịcha” Jizọs bu n’obi?

Jizọs kọwaara ha, sị: “Abụ m achịcha na-enye ndụ. Onye na-abịakwute m, agụụ agaghị agụ ya ma ọlị, onye nwekwara okwukwe n’ebe m nọ, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị. Ma agwawo m unu, sị, Unu ahụwo m ma unu ekweghị. . . . Esi m n’eluigwe bịa ime, ọ bụghị uche m, kama uche onye zitere m. Nke a bụ uche nke onye ahụ zitere m, na agaghị m atụfu ihe ọ bụla n’ime ihe niile o nyere m kama na m ga-akpọlite ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ. N’ihi na nke a bụ uche Nna m, na onye ọ bụla nke na-ahụ Ọkpara ahụ ma nwee okwukwe na ya ga-enwe ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:35-40.

Ihe a Jizọs kwuru mere ka ndị Juu wewe iwe, ha amalitekwa ịtamu ntamu megide ya. Ha nọ na-eche ihe mere ọ ga-eji asị na ya bụ “achịcha nke si n’eluigwe bịa.” (Jọn 6:41) Ha weere Jizọs ka mmadụ nkịtị nne na nna ya si na Nazaret nke dị na Galili. Ha jụwara, sị: “Onye a ọ́ bụghị Jizọs nwa Josef, onye anyị maara nna ya na nne ya?”—Jọn 6:42.

Jizọs zara ha, sị: “Kwụsịnụ ịtamu ntamu n’etiti onwe unu. Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya; m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ. E dere n’akwụkwọ ndị amụma, sị, ‘Ha niile ga-abụkwa ndị Jehova kụziiri ihe.’ Onye ọ bụla nke nụrụ ihe site n’ọnụ Nna m ma mụta ihe na-abịakwute m. Ọ bụghị na ọ dị mmadụ ọ bụla hụworo Nna m, ma e wezụga onye ahụ nke si n’ebe Chineke nọ; onye a ahụwo Nna m. N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Onye kweere nwere ndụ ebighị ebi.”—Jọn 6:43-47; Aịzaya 54:13.

Mgbe Jizọs na Nikọdimọs nọ na-akparịta ụka, Jizọs gwara ya na ihe ga-eme ka mmadụ nweta ndụ ebighị ebi bụ ma onye ahụ nwee okwukwe n’ebe Nwa nke mmadụ nọ. Ọ sịrị ya: “Ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe [n’Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya], kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:15, 16) Ugbu a Jizọs na-agwa ọtụtụ ndị okwu, ọ gwakwara ha ihe gosiri na ọ bụ n’aka ya ka ha ga-esi nweta ndụ ebighị ebi, bụ́ nke mana ahụ e nyere ndị nna nna ha na achịcha ndị a na-eme na Galili na-agaghị enyeli ha. Oleezi otú ha ga-esi nweta ndụ ebighị ebi? Jizọs kwughachiri ihe ahụ o kwuru ọzọ. Ọ sịrị: “Abụ m achịcha na-enye ndụ.”—Jọn 6:48.

Jizọs kọwakwuru ihe ndị ọzọ banyere achịcha a sí n’eluigwe mgbe ọ na-akụzi ihe n’ụlọ nzukọ dị na Kapaniọm.

  • N’ihi ihe ndị Jizọs mere n’oge na-adịbeghị anya, gịnị mere ndị mmadụ ekwesịghị ịgwawa ya ka o meere ha ihe ịrịba ama?

  • Olee ihe ndị Juu mere mgbe Jizọs sịrị na ya bụ ezi “achịcha nke si n’eluigwe”?

  • Gịnị mere achịcha ahụ Jizọs kwuru banyere ya ji karịa mana ma ọ bụ achịcha nkịtị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya