Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2003 | Septemba 15
    • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

      Gịnị ka inwe “ndụ n’ime onwe ya” pụtara?

      Bible na-ekwu banyere Jizọs Kraịst dị ka onye nwere “ndụ n’ime onwe ya” na ndị na-eso ụzọ ya dị ka ndị nwere ‘ndụ n’ime onwe ha.’ (Jọn 5:26; 6:53) Otú ọ dị, akụkụ Akwụkwọ Nsọ abụọ ndị a apụtaghị otu ihe.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—2003 | Septemba 15
    • Mgbe ihe dị ka otu afọ gasịrị, Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, Ọ gwụla ma ùnu riri anụ ahụ́ nke Nwa nke mmadụ ma ṅụọ ọbara ya, unu enweghị ndụ n’ime onwe unu. Onye na-eri anụ ahụ́ m ma na-aṅụ ọbara m nwere ndụ ebighị ebi, m ga-akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 6:53, 54) N’ebe a, Jizọs gosiri na inwe “ndụ n’ime onwe unu” na inweta “ndụ ebighị ebi” bụ otu ihe. A na-achọta okwu ndị ọzọ a hazikwara ụtọ asụsụ ha dị ka nke inwe “ndụ n’ime onwe unu” n’ebe ndị ọzọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik. Abụọ n’ime ha bụ, “Nweenụ nnu n’ime onwe unu” na “na-enweta n’ime onwe ha nkwụghachi ụgwọ zuru ezu.” (Mak 9:50; Ndị Rom 1:27) N’ebe ndị a, ahịrịokwu ndị ahụ adịghị enye echiche nke ike ime ka ndị ọzọ nwee nnu ma ọ bụ ịkwụghachi onye ọ bụla ụgwọ. Kama nke ahụ, ọ na-egosi izu ezu n’ime. N’ihi ya, okwu ahụ bụ́ “ndụ n’ime onwe unu” nke e ji mee ihe na Jọn 6:53 pụtara nanị inweta ndụ zuru nnọọ ezu.

      N’izo aka n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ dị ka ndị nwere ndụ n’ime onwe ha, Jizọs kwuru banyere anụ ahụ́ na ọbara ya. Ka e mesịrị, mgbe ọ na-eguzobe ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, Jizọs kwukwara ọzọ banyere anụ ahụ́ na ọbara ya ma gwa ndị na-eso ụzọ ya bụ́ ndị na-aga ịba n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ka ha rie ihe nnọchianya nke achịcha na-ekoghị eko na mmanya. Nke a ọ̀ pụtara na ọ bụ nanị Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị ha na Jehova Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ga-enweta ndụ zuru ezu dị otú ahụ? Ee e. Jizọs kwuru okwu nke abụọ ahụ otu afọ ka o kwusịrị nke mbụ ahụ. Ndị nụrụ okwu Jizọs e dekọrọ na Jọn 6:53, 54 amaghị banyere ememe a na-eme kwa afọ nke a na-eji ihe nnọchianya nke ahụ́ na ọbara Kraịst eme ihe na ya.

      Dị ka Jọn isi 6 si kwuo, Jizọs bu ụzọ jiri ahụ́ ya tụnyere mana, na-asị: “Ndị nna nna unu hà riri mana n’ala ịkpa ma, n’agbanyeghị nke ahụ, nwụọkwa. Nke a bụ achịcha ahụ nke si n’eluigwe abịa, ka onye ọ bụla wee rie ya ma ghara ịnwụ. Abụ m achịcha ahụ dị ndụ nke si n’eluigwe bịa; ọ bụrụ na onye ọ bụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” Ahụ́ Jizọs na ọbara ya karịrị mana nkịtị. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na e nyere ahụ́ ya maka “ndụ nke ụwa,” na-eme ka ndụ ebighị ebi kwe omume.a Ya mere, ihe ahụ e kwuru banyere inwe “ndụ n’ime onwe unu” dị na Jọn 6:53 bụ maka ndị nile ga-enweta ndụ ebighị ebi—n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa.—Jọn 6:48-51.

      Olee mgbe ndị na-eso ụzọ Kraịst na-enweta ndụ n’ime onwe ha, ma ọ bụ ndụ zuru ezu? Nye ndị nketa Alaeze e tere mmanụ, nke a na-eme mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe dị ka ndị mmụọ e kere eke na-adịghị anwụ anwụ. (1 Ndị Kọrint 15:52, 53; 1 Jọn 3:2) “Atụrụ ọzọ” Jizọs ga-enweta ndụ zuru ezu n’ọgwụgwụ Ọchịchị Puku Afọ ya. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, a ga-eleworị ha ule, chọpụta na ha bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ha abụrụkwa ndị a gụrụ ná ndị ezi omume maka ndụ ebighị ebi n’ụwa Paradaịs.—Jọn 10:16; Mkpughe 20:5, 7-10.

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a N’ala ịkpa ahụ, mana dị ma ndị Izrel ma “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” mkpa iji dị ndụ. (Ọpụpụ 12:37, 38; 16:13-18) N’otu aka ahụkwa, iji dị ndụ ebighị ebi, Ndị Kraịst nile, ma hà bụ ndị e tere mmanụ ma ọ bụ na ha abụghị, aghaghị inweta mana ahụ si n’eluigwe site n’inwe okwukwe n’ikike mgbapụta nke anụ ahụ́ na ọbara Jizọs bụ́ ndị e ji chụọ àjà.—Lee Ụlọ Nche nke April 15, 1988, peeji nke 30-31.

      [Foto ndị dị na peeji nke 31]

      Ezi Ndị Kraịst nile pụrụ inwe ‘ndụ n’ime onwe ha’

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya