Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 3/1 p. 21
  • Chineke ò kere Ekwensu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke ò kere Ekwensu?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Bụ Chineke Kere Ekwensu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ì Kweere n’Ezie na Ekwensu Dị Adị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ekwensu—Ọ Bụghị Nkwenkwe Ụgha Nkịtị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 3/1 p. 21

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Chineke ò kere Ekwensu?

▪ Ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na Chineke “kere ihe niile,” ụfọdụ ekwubiela na ọ ga-abụrịrị ya kere Ekwensu. (Ndị Efesọs 3:9; Mkpughe 4:11) Baịbụl gosiri nnọọ na ọ bụghị ya kere ya.

Jehova kere onye ghọrọ Ekwensu. N’ihi ya, na onye a nke kacha emegide Chineke dị adị ekwesịghị imegide ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere Onye Okike bụ́ Jehova. E kwuru banyere ya, sị: “Ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ, n’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi. Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ; onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.” (Diuterọnọmi 32:3-5) Site n’ihe e kwuru ebe ahụ, anyị nwere ike ikwubi na ọ dị mgbe Setan zuru okè ma bụrụ onye ezi omume, ya bụ, otu n’ime ụmụ Chineke bụ́ ndị mmụọ ozi. Na Jọn 8:44, Jizọs kwuru na Ekwensu ‘eguzosighị ike n’eziokwu,’ bụ́ nke pụtara na ọ dị mgbe Setan bụ onye eziokwu nke na-enweghị mmehie ọ bụla.

Ma, dị ka ndị ọzọ nwere ọgụgụ isi Jehova kere, mmụọ ozi ahụ ghọrọ Setan nweere onwe ya ịhọrọ ime ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ. Ebe ọ họọrọ imegide Chineke na iduhie mmadụ abụọ mbụ isonyere ya, o mere onwe ya Setan, nke pụtara “Onye Mmegide.”—Jenesis 3:1-5.

Mmụọ ọjọọ ahụ mekwara onwe ya Ekwensu, nke pụtara “Onye Nkwutọ.” Ọ bụ Setan bụ mmụọ ahụ nọ n’azụ agwọ ahụ ma jiri aghụghọ na ụgha duhie Iv inupụrụ iwu doro anya nke Onye Okike ya isi. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kpọọ Setan “nna ụgha.”—Jọn 8:44.

Ma, olee otú mmụọ zuru okè, onye na-enweghị mmehie n’ime onwe ya, nke na-enweghịkwa ndị ọjọọ ya na ha nọ, ga-esi chee echiche ọjọọ? O doro anya na ọ gụwara ya agụụ inweta ofufe nke dịịrị naanị Chineke, ya ahụkwa na ya nwere ike ime ka ụmụ mmadụ nọrọ n’okpuru ya kama ịnọ n’okpuru Jehova. Ebe ọ nọgidere na-eche banyere ya kama iwepụ ya n’uche ya, o kwere ka ọ gbanye mgbọrọgwụ n’obi ya, ya emechaakwa mezuo ya. A kọwara otú ụdị ihe ahụ si eme n’akwụkwọ Jems, sị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya. Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie.”—Jems 1:14, 15; 1 Timoti 3:6.

Iji maa atụ: Ka e were ya na onye mpịazi ego hụrụ na ya nwere ike ịgbanwe ihe ndekọ ụlọ ọrụ ya iji zuru ego ụlọ ọrụ ahụ. O nwere ike iwepụ echiche ọjọọ ahụ n’uche ya ngwa ngwa. Ma, ọ bụrụ na ọ nọgide na-eche ya, kama iwepụ ya n’obi ya, echiche ọjọọ ahụ ga na-esikwu ike, o yikwara nnọọ ka ọ̀ ga-emecha mezuo ya. Ọ bụrụ na o mezuo ya, o meela onwe ya onye ohi. Ọ bụrụ na ọ gọọ agọ mgbe e jidere ya, ọ ga-aghọkwa onye ụgha. N’otu aka ahụ, site n’ịmalite iche echiche ọjọọ na ime ya eme, mmụọ ozi ahụ Chineke kere ji ikike o nwere ịhọrọ ihe ọ ga-eme ghọgbuo mmadụ abụọ ahụ ma nupụrụ Nna ya isi, si otú ahụ mee onwe ya Setan bụ́ Ekwensu.

Ma, obi dị anyị ụtọ na a ga-ebibi Setan bụ́ Ekwensu mgbe oge Chineke ruru. (Ndị Rom 16:20) Ka ọ dịgodị, a na-eme ka ndị na-efe Jehova Chineke mara aghụghọ Setan ma na-echebe ha n’atụmatụ aghụghọ ya. (2 Ndị Kọrịnt 2:11; Ndị Efesọs 6:11) Ya mere, mee ike gị niile ‘iguzogide Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe ị nọ.’—Jems 4:7.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]

Ebe otu mmụọ ozi zuru okè họọrọ imegide Chineke, o mere onwe ya Setan

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya