Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 7/15 p. 31
  • “Ha Matara Olu Ya”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ha Matara Olu Ya”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 7/15 p. 31

“Ha Matara Olu Ya”

“JEHOVA bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ.” Ndị a bụ okwu mmeghe nke Abụ Ọma nke 23. Ọzọkwa Akwụkwọ Nsọ ji Jehova Chineke tụnyere onye na-azụ atụrụ n’amụma Aịsaịa, nke na-asị: “Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ka Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ Ya, n’ogwe aka Ya ka Ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha, Ọ ga-ewere nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.”​—⁠Aịsaịa 40:11.

N’otu aka ahụ, e ji Jisọs Kraịst tụnyere onye na-azụ atụrụ. Ọ sịrị: “Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma: onye ọzụzụ atụrụ ọma na-atọgbọ ndụ ya n’ihi atụrụ ya.” (Jọn 10:11) Jisọs sịrị na “atụrụ na-anụkwa olu [onye ọzụzụ atụrụ ahụ]: ọ na-akpọkwa atụrụ nke aka ya n’aha, na-edupụkwa ha.” O kwukwasịrị na “atụrụ ahụ na-esokwa [onye ọzụzụ atụrụ ahụ]: n’ihi na ha matara olu ya. Ma ha agaghị eso ọbịa ma ọlị, kama ha ga-agbanarị ya: n’ihi na ha amataghị olu ndị ọbịa.”​—⁠Jọn 10:​2-⁠5.

Ma Jehova Chineke ma Ọkpara ya, Jisọs Kraịst, emezuwo onyinyo e sere n’amaokwu ndị a kpọtụrụ uche. Ha na-emeso atụrụ ihe atụ ha n’ịdị nro na ná nlekọta ịhụnanya. N’ihi ya, ndị ahụ yiri atụrụ na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya, ndị nọ ná ntụkwasị obi, na ndị nọ ná nchebe.

N’ụzọ ziri ezi, e ji mmekọrịta nke a tụnyere nke atụrụ nkịtị na onye ọzụzụ atụrụ ha. Laa azụ na 1831, John Hartley dere banyere ihe ọ hụtara banyere nke a. Ọ rịbara ama na na Gris ọ bụ omenala ndị na-azụ atụrụ inye atụrụ ha aha. Mgbe a kpọrọ ha n’aha ha, atụrụ ahụ ga-azaghachi n’olu nke onye na-azụ ya. Ihe dị ka 51 afọ n’ihu, na 1882, J. L. Porter hụtakwara ihe ndị yiri ya. O ji anya ya hụ ndị ọzụzụ atụrụ “na-ebe . . . ube pụrụ iche” bụ́ nke atụrụ ahụ ga-aza site n’iji nrubeisi soro onye ọzụzụ atụrụ ahụ. N’otu afọ ahụ William M. Thomson dere banyere nnwale ndị e mere ugboro ugboro nke nwapụtara na a pụrụ ịkụziri atụrụ ịgbaso onye na-azụ ha ma mata olu ya.

À hụtawo mmekọrịta nke a pụrụ iche n’etiti ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha n’oge ndị a? Ee. Ná mbipụta September 1993 nke akwụkwọ National Geographic, onye Australia na-eme njem ntụrụndụ bụ́ Robyn Davidson dere ihe na-esonụ banyere ndị Rabari na-azụ anụ n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ India: “Onye ọzụzụ atụrụ nke ọ bụla nwere ube dịtụ iche, ndịrịta iche n’otu isiokwu. E nwere ube ndị a na-ebe iji pụọ apụ, ube iji kpọga atụrụ ahụ na mmiri, na ndị ọzọ. Onye nke ọ bụla maara atụrụ nke ya, atụrụ makwaara onye nke na-azụ ya, ìgwè nke ya kpọmkwem ga-esitekwa n’ìgwè ahụ ka ukwuu wezụga onwe ha ma gbasoo ya n’azụ n’ụtụtụ.”

N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya, Jisọs hụtara ihe ndị njem anọ a ka kpọtụsịrị aha kọwara. Ihe ndị nke ọ hụtara n’onwe ya mere ka ihe atụ ya nke atụrụ ahụ ịmara olu ya dokwuo anya. Ị̀ bụ otu n’ime atụrụ Jisọs? Ị̀ maara olu ya ma na-aṅa ya ntị? Ọ bụrụ na ị mara ma na-anakwere nkụzi ya nile dị ka eziokwu, ọ bụrụkwa na i rube isi n’ihe ndị o nyere n’iwu ma gbasoo idu ndú ya n’ife Jehova, mgbe ahụ ị pụrụ inweta ahụmahụ nke ọzụzụ atụrụ ịhụnanya na ịdị nro nke Jehova Chineke na Ọkpara ya, Jisọs Kraịst.​—⁠Jọn 15:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya