Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 90 p. 212-p. 213 para. 7
  • “Mbilite n’Ọnwụ na Ndụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Mbilite n’Ọnwụ na Ndụ”
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • “Ekwerewo M”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • “Ekwerewo M”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Jizọs Kpọlitere Lazarọs n’Ọnwụ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 90 p. 212-p. 213 para. 7
Mgbe Jizọs na Mata na-ebe ákwá, ndị ọzọ ana-ele ha

ISI NKE 90

“Mbilite n’Ọnwụ na Ndụ”

JỌN 11:17-37

  • JIZỌS ERUTE MGBE LAZARỌS NWỤRỤLA

  • “MBILITE N’ỌNWỤ NA NDỤ”

Jizọs si Peria rutewe Betani, bụ́ obodo dị ihe dị ka kilomita atọ ma e si ya gawa Jeruselem. Ụmụnne Lazarọs bụ́ Meri na Mata ka na-eru uju ọnwụ nwanne ha Lazarọs, ọtụtụ ndị bịakwara ịkasi ha obi.

Mgbe Mata gbaara ọsọ na-aga ịhụ Jizọs

Otu onye bịara gwa Mata na Jizọs abịawala, Mata agbara gawa ozugbo ka o zute ya. Mgbe o rutere ebe Jizọs nọ, ọ gwara ya ihe ọ ga-abụ na ya na nwanne ya nwaanyị nọ na-eche kemgbe abalị anọ. Ọ sịrị ya: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” Ma, ọ pụtaghị na o nweghị olileanya n’ihi na o kwukwara, sị: “Amaara m ugbu a na ihe niile ị ga-arịọ Chineke, Chineke ga-enye gị ha.” (Jọn 11: 21, 22) Obi ya na-agwa ya na Jizọs ka nwere ike inyere nwanne ya nwoke aka.

Jizọs sịrị ya: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” Ma, Mata chere na ọ na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ a ga-enwe n’ụwa n’ọdịnihu. Obi siri Mata ike na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ a n’ihi na ọ bụ olileanya Ebreham na ndị ọzọ fere Chineke nwere. N’ihi ya, o kwuru ihe gosiri na obi siri ya ike na a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ. Ọ sịrị: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”—Jọn 11:23, 24.

Ma, Jizọs ò nwere ike ime ka Lazarọs si n’ọnwụ bilie ugbu a? O chetaara Mata na Chineke enyela ya ikike ọ ga-eji merie ọnwụ. Ọ sịrị ya: “Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ, onye ọ bụla nke dị ndụ ma nwee okwukwe n’ebe m nọ agaghị anwụ ma ọlị.”—Jọn 11:25, 26.

Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na ndị na-eso ụzọ ya dị́ ndụ mgbe ahụ emekataghị nwụọ. Ọ gwadịrị ndịozi ya na yanwa ga-anwụ. (Matiu 16:21; 17:22, 23) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na inwe okwukwe n’ebe ọ nọ nwere ike ime ka mmadụ nweta ndụ ebighị ebi. A ga-esi n’ọnwụ kpọlite ọtụtụ ndị ka ha nweta ndụ ebighị ebi a. Ma, ndị ji obi ha niile na-efe Jehova n’oge a ga-ebibi ụwa ochie a agaghị anwụ ma ọlị. Ma è si n’ọnwụ kpọlite mmadụ ma ọ̀ dị ndụ banye n’ụwa ọhụrụ, ọ bụrụhaala na onye ahụ nwere okwukwe na Jizọs, ọ gaghị anwụ.

Ma, ebe ọ bụ na Jizọs kwukwara na ya bụ “mbilite n’ọnwụ na ndụ,” ọ̀ ga-akpọliteli Lazarọs bụ́ onye nwụrụ kemgbe abalị ole na ole ugbu a? Jizọs jụrụ Mata, sị: “Ì kwere nke a?” Mata zara ya, sị, “Ee, onyenwe anyị; ekwerewo m na ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, bụ́ Onye ahụ ga-abịa n’ụwa.” Ebe Mata nwere okwukwe na Jizọs nwere ike ịkpọlite Lazarọs n’ụbọchị ahụ, o ji ọsọ gaa takwunyere nwanne ya nwaanyị, sị: “Onye ozizi abịala, ọ na-akpọ gị.” (Jọn 11:25-28) Meri biliri ozugbo pụwa n’èzí. Ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ sochiri ya. Ha chere na ọ na-aga n’ili Lazarọs.

Ma, Meri gakwuuru Jizọs, daa n’ala n’ụkwụ ya ma jiri ákwá kwughachi ihe nwanne ya nwaanyị kwurula. Ọ sịrị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” Ákwá Meri na ìgwè mmadụ nọ́ ebe ahụ na-ebe ruru Jizọs n’obi, o nyekwara ya nsogbu, ya asụọ ude. Anya mmiri gbadịrị ya. Ihe a Jizọs mere metụrụ ìgwè mmadụ ahụ n’ahụ́, ụfọdụ n’ime ha ajụọ, sị: “Nwoke a nke meghere anya onye ìsì ahụ, ó nweghị ike igbochi onye a ịnwụ?”—Jọn 11:32, 37.

  • Gịnị mere mgbe Jizọs rutewere Betani?

  • Gịnị mere obi ji sie Mata ike na a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ?

  • Olee ihe Jizọs kwuru nke gosiri na o nwere ike ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya