Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Mụta Ihe Site n’Ihe Mere Nikọdimọs
    Ụlọ Nche—2002 | Febụwarị 1
    • Nanị ihe dị ka ọnwa isii Jizọs malitesịrị ozi elu ala ya, Nikọdimọs ghọtara na Jizọs ‘dị ka onye ozizi, si n’ebe Chineke nọ bịa.’ N’ịbụ onye ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ n’oge na-adịbeghị anya mgbe ahụ na Jeruselem n’oge Ememe Ngabiga nke 30 O.A., masịrị, Nikọdimọs bịara n’abalị ikwupụta nkwere o kweere na Jizọs na ịmatakwu onye ozizi a. Mgbe ahụ, Jizọs gwara Nikọdimọs otu eziokwu dị omimi banyere mkpa ọ dị ịbụ onye ‘a mụrụ ọzọ’ iji nwee ike ịbanye n’Alaeze Chineke. N’oge a, Jizọs kwukwara okwu a: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:1-16.

      Lee atụmanya dị ebube nke dị Nikọdimọs n’ihu! Ọ pụrụ ịghọ onye ya na Jizọs na-akpachi anya, nke nwere ike iji anya ya hụ akụkụ dị iche iche nke ndụ Jizọs n’elu ala. Dị ka onye na-achị ndị Juu na onye ozizi n’Izrel, Nikọdimọs maara Okwu Chineke nke ọma. O nwekwara ezi nghọta, dị ka a na-ahụ ná mmata ọ matara Jizọs dị ka onye ozizi nke si n’ebe Chineke nọ bịa. Nikọdimọs nwere mmasị n’ihe ime mmụọ, ọ dịkwa umeala n’obi n’ụzọ pụrụ iche. Lee ka ọ na-aghaghị isi bụrụ ihe siri ike bụ́ onye òtù nke ụlọikpe kasị elu nke ndị Juu ikweta na nwa ọkwa nkà nke na-abaghị ọgaranya si n’ebe Chineke nọ bịa! Àgwà nile dị otú ahụ dị oké mkpa iji bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs.

  • Mụta Ihe Site n’Ihe Mere Nikọdimọs
    Ụlọ Nche—2002 | Febụwarị 1
    • Nke mbụ, Jọn mere ka ọ pụta ìhè na onye a na-achị ndị Juu “bịakwutere [Jizọs] n’abalị.” (Jọn 3:2) Otu ọkà mmụta Bible na-atụ aro, sị: “Nikọdimọs bịara n’abalị, ọ bụghị n’ihi ụjọ, kama ọ bụ iji zere ìgwè mmadụ bụ́ ndị gaara egbochiwo mkparịta ụka ya na Jizọs.” Otú ọ dị, Jọn zoro aka n’ebe Nikọdimọs nọ dị ka “nwoke ahụ bịakwutere [Jizọs] n’abalị na nke mbụ ya,” n’otu ebe ahụ ọ nọ zoo aka n’ebe Josef onye Arimatịa nọ dị ka “onye na-eso ụzọ Jizọs, kama ọ bụ nke nzuzo ya n’ihi egwu ọ na-atụ ndị Juu.” (Jọn 19:38, 39) Ya mere, o yikarịrị ka Nikọdimọs ọ bịakwutere Jizọs n’abalị n’ihi “egwu ọ na-atụ ndị Juu,” dị nnọọ ka ndị ọzọ biri ndụ n’oge ya tụrụ egwu iso Jizọs mekọọ ihe ọ bụla.—Jọn 7:13.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya