-
“Ana M Arịọ Ka Siza Kpegharịa Ikpe M!”Ụlọ Nche—2001 | Disemba 15
-
-
Pọl zaara ọnụ ya n’ebubo ha n’otu n’otu. ‘Ọ dịghị ọgba aghara m kpasuru. N’eziokwu, anọ m n’ihe ha kpọrọ “ịrọ òtù,” ma nke a na-agụnye ịgbaso iwu ndị Juu. Ọ bụ ndị Juu ụfọdụ si Esia kpasuru ọgba aghara ahụ. Ọ bụrụ na ọ dị mkpesa ha nwere ime, ha kwesịrị ịnọ ebe a iji mee ya.’ N’ụzọ bụ́ isi, Pọl chịkọtara ebubo ahụ ịbụ nke metụtara esemokwu okpukpe dị n’etiti ndị Juu, bụ́ nke ọ na-adịchaghị ihe ndị Rom pụrụ ime maka ya. N’ịkpachapụ anya ka ọ ghara ịkpasu ndị Juu kpọrọrị ekwo nkụ iwe, Filiks yigharịrị ikpe ahụ, na-afọ nke nta ka o mee ka ikpe ahụ ghara ịga aga. E nyefeghị Pọl n’aka ndị Juu, bụ́ ndị zọọrọ na ọ bụ ha ruru eru ikpe ikpe ahụ, e jighịkwanụ iwu ndị Rom kpee ya ikpe, a tọhapụghịkwanụ ya. A pụghị ịmanye Filiks ikpebi ikpe, tụkwasịkwa n’ịchọ inweta ihu ọma ndị Juu, ọ dị ihe ọzọ o bu n’obi na-egbu oge—o nwere olileanya na Pọl ga-enye ya aka azụ.—Ọrụ 24:10-19, 26.b
-
-
“Ana M Arịọ Ka Siza Kpegharịa Ikpe M!”Ụlọ Nche—2001 | Disemba 15
-
-
b N’ezie, iwu megidere nke a. Otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “A bịa n’iwu metụtara ịpụnara ihe, bụ́ Lex Repetundarum, a machibidoro onye ọ bụla nọ n’ọkwá ọchịchị ma ọ bụ nke nlekọta iwu ịrịọ ma ọ bụ ịnara aka azụ iji jichie ma ọ bụ tọhapụ mmadụ, iji bie ikpe ma ọ bụ ghara ibi ya ma ọ bụkwanụ iji tọhapụ onye mkpọrọ.”
-