-
Jehova Bụ Onye Inyeaka AnyịỤlọ Nche—2004 | Disemba 15
-
-
20, 21. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka ụmụnna si Rom wusiri Pọl onyeozi ike?
20 Ọ bụ nnọọ ihe na-agba ume ịgụ ihe ndekọ nke otú ndị ohu Jehova si tinye mgbalị iji wusie ibe ha ike ma gbaa ha ume. Tụlee ihe atụ metụtara Pọl onyeozi. Ka ọ na-aga Rom dị ka onye mkpọrọ, Pọl mere njem n’okporo ụzọ awara awara ndị Rom a maara dị ka Okporo Ụzọ Apịọs. Agba nke ikpeazụ nke njem ahụ tara nnọọ akpụ, n’ihi na ndị njem aghaghị ịgafe ebe mmiri na-adọ nke apịtị jupụtara.a Ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị na Rom maara na Pọl na-abịa. Gịnị ka ha ga-eme? Hà ga-atụsara nnọọ ahụ́ n’ụlọ ha na-echere mgbe Pọl ga-abịarute ma gazie kelee ya?
21 Luk onye so dee Bible bụ́ onye so Pọl mee njem ahụ na-agwa anyị ihe merenụ: “Sitekwa n’ebe ahụ [Rom], mgbe ụmụnna nụrụ akụkọ banyere anyị, ha bịara izute anyị ruo ọbụna n’Ahịa Apịọs na Ụlọ Atọ nke Ndị Ije.” Ị̀ pụrụ iji anya nke uche hụ ihe na-emenụ? N’ịmara na Pọl na-abịa, ụmụnna ndị a họpụtara mere njem site na Rom ịga zute ya. Ụfọdụ n’ime ha cheere n’Ahịa Apịọs, ebe nchere a maara nke ọma nke dị ihe dị ka kilomita 74 site na Rom. Ụmụnna ndị nke ọzọ cheere n’Ụlọ Atọ nke Ndị Ije, ebe izu ike dị ihe dị ka kilomita 58 site n’obodo ahụ. Gịnị bụ mmeghachi omume Pọl? Luk na-akọ, sị: “Ozugbo Pọl hụkwara ha, o kelere Chineke ma nwee obi ike.” (Ọrụ 28:15) Cheedị nnọọ echiche—nanị ịhụ ụmụnna ahụ bụ́ ndị gbalịsịworo ike ime ogologo njem ahụ wusiri Pọl ike ma kasie ya obi! Ònyekwa ka Pọl kelere maka nkwado a na-enye aka? O kelere onye o si n’aka, Jehova bụ́ Chineke.
-
-
Jehova Bụ Onye Inyeaka AnyịỤlọ Nche—2004 | Disemba 15
-
-
a Onye Rom na-ede uri bụ́ Horace (65—68 T.O.A.), bụ́ onye mere otu njem ahụ, kwuru banyere ahụ́ erughị ala agba ikpeazụ nke njem a na-eweta. Horace kọwara Ahịa Apịọs dị ka nke “jupụtara ná ndị ọkwọ ụgbọ mmiri na ndị na-ere mmanya nwere aka ntagide.” O mere mkpesa banyere “ajọ anwụnta na akịrị” nakwa mmiri “ọjọọ.”
-