-
Jizọs Si n’Aka Mmadụ Ole na Ole Nye Ọtụtụ Ndị NriỤlọ Nche—2013 | Julaị 15
-
-
8. Olee otú ndị ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ si gosi na ha ghọtara ndị Jizọs si n’aka ha na-akụzi okwu Chineke?
8 Mgbe Jizọs laghachiri eluigwe, ọ bụ n’ụbọchị Pentikọst afọ 33 ka o bidoro isi n’aka ndịozi ya na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ e tere mmanụ okwu Chineke. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 2:41, 42.) E nwere ndị Juu na ndị a tọghatara atọghata ghọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ụbọchị ahụ. Ha niile ghọtara na Jizọs si n’aka ndịozi ya na-akụziri ha okwu Chineke. “Ha nọkwa na-ege ntị n’ozizi ndịozi.” Otu ọkà mmụta kwuru na okwu Grik e si sụgharịta “na-ege ntị n’ozizi ndịozi” pụtara na ha ji obi ha niile na-eme ihe ndịozi na-akụzi. Ọ gụsiri ndị ahụ ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ agụụ ike ịnụ okwu Chineke. Ha makwa ebe ha ga-aga nụ ya. Ha ji obi ha niile na-ege ntị n’ihe ndịozi Jizọs na-akọwara ha banyere ihe ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere. Ha na-egekwa ntị ka ha na-eme ka ha ghọtakwuo ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara Jizọs.c—Ọrụ 2:22-36.
-
-
Jizọs Si n’Aka Mmadụ Ole na Ole Nye Ọtụtụ Ndị NriỤlọ Nche—2013 | Julaị 15
-
-
c Paragraf nke 8: Ebe ọ bụ na e kwuru na ndị ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ “nọkwa na-ege ntị n’ozizi ndịozi,” ọ pụtara na ndịozi na-akụziri ha ihe mgbe niile. E dere ụfọdụ n’ime ihe ndịozi kụziri n’akwụkwọ ndị e dere n’ike mmụọ nsọ. Ha mechara soro n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.
-