-
‘Ha Wee Jupụta na Mmụọ Nsọ’‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
16. Olee otú Ndị Kraịst oge mbụ si jiri ihe ha nwere nyere ibe ha aka?
16 O doro anya na Jehova gọziri ìgwè mmadụ ahụ. Baịbụl sịrị: “Ndị niile ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-anọkọ, na-ekerịtakwa ihe niile ha nwere. Ha na-erekwa ala na ihe ndị ha nwere ma na-ekere mmadụ niile ego ha retere, onye ọ bụla enweta ego ọ ga-eji gboo mkpa ya.”f (Ọrụ 2:44, 45) N’eziokwu, ezigbo Ndị Kraịst niile kwesịrị iṅomi ụdị ịhụnanya ahụ na otú ahụ ha si jiri ihe ha nwere nyere ibe ha aka.
-
-
‘Ha Wee Jupụta na Mmụọ Nsọ’‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
f Ihe a bụ ndokwa na-adịteghị aka e mere iji gbooro ndị ahụ si ebe ndị dị anya bịa Jeruselem mkpa ha maka na ha nọtụkwuru ka ha mụtakwuo banyere otú ọhụrụ a e si efe Chineke. Ụmụnna ndị ahụ ji obi ha nye ndị ọzọ ihe ha nwere. E kwesịghị iche na ihe onye nke ọ bụla nwere bụzi nke mmadụ niile otú a na-eme n’ọchịchị ndị Kọmunist.—Ọrụ 5:1-4.
-