Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ‘Oge Mweghachi’ Dị Nso!
    Ụlọ Nche—2000 | Septemba 1
    • A PỤGHỊ ịrụzu ọrụ ahụ n’ime ụbọchị, izu, ma ọ bụ ọnwa ole na ole. Otú ọ dị, n’egbutụghịdị oge, ndị na-eso ụzọ ahụ malitere ime nkwusa. Ma ha nọgidere na-enwe mmasị n’ihe banyere mweghachi. Pita onyeozi gwara ìgwè mmadụ buru ibu nke gbakọtara na Jerusalem banyere ya, sị: “Chegharịanụ, chigharịakwanụ, ka e wee hichapụ mmehie nile unu, ka oge inwe ume ndụ wee si n’ihu Onyenwe anyị bịa otú a; ka O wee zitekwa Kraịst ahụ Onye e buru ụzọ họpụtara unu, bụ́ Jisọs: Onye eluigwe aghaghị ịnara nke ọma ruo [oge a ga-eweghachi ihe nile, NW], bụ́ oge nke Chineke kwuru okwu banyere ha site n’ọnụ ndị amụma Ya dị nsọ ndị sitere ná mmalite oge a.”—Ọrụ 3:19-21.

      Oge ‘mweghachi’ ndị a ga-eweta “oge inwe ume ndụ” sitere n’aka Jehova. Mweghachi ahụ e buru n’amụma ga-abịa ná nkebi abụọ. Nke mbụ, a ga-enwe mweghachi ime mmụọ na-enye ume ọhụrụ, bụ́ nke na-ewere ọnọdụ ugbu a. Nke abụọ, iguzobe paradaịs a na-ahụ anya n’elu ala ga-esochi nke a.

  • ‘Oge Mweghachi’ Dị Nso!
    Ụlọ Nche—2000 | Septemba 1
    • A malitere ọrụ mkpọsa sara mbara iji kụziere ndị nke mba nile ime ihe Kraịst nyere ụmụazụ ya iwu ime. (Matiu 28:20) Lee ihe na-enye ume ọhụrụ ọ bụ ịhụ ụfọdụ ndị gosipụtaburu àgwà anụmanụ ka ha na-agbanwe echiche ha! Ha tụpụrụ mmadụ ochie ahụ, bụ́ nke na-arụpụta àgwà ndị dị ka “ọnụma,” “nkwulu,” na “ikwu okwu ihere,” ma yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, bụ́ “nke a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ ruo ná mmazu dị ka onyinyo nke [Chineke bụ́] Onye kere ya si dị.” N’ụzọ ime mmụọ, a na-emezu ọbụna ugbu a ihe Aịsaịa onye amụma kwuru, sị: “Anụ ọhịa wolf [onye na-akpabu àgwà dị ka anụ ọhịa wolf] na nwa atụrụ [onye dị umeala n’obi] ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe.”—Ndị Kọlọsi 3:8-10; Aịsaịa 11:6, 9.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya