-
Ihe Dị Ukwuu Karịa Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa nke IjiptỤlọ Nche—2002 | Jun 15
-
-
Mgbe a kpọghachiiri ada Fero Mozis, a kụziiri ya ihe “n’amamihe nile nke ndị Ijipt.” (Ọrụ 7:22) Nke ahụ pụrụ ịbụ ọzụzụ e nyere iji mee ka Mozis ruo eruo maka ọkwá ọchịchị. Ọtụtụ ihe ndị a na-amụ n’Ijipt gụnyere mgbakọ na mwepụ, otú e si atụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ịtụ ụkpụrụ ụlọ, iwu ihe owuwu, na nkà na ihe ọmụmụ sayensị ndị ọzọ. Eleghị anya, ezinụlọ eze gaara achọwo ka a kụziere ya ihe banyere okpukpe ndị Ijipt.
Ọ pụrụ ịbụ na ọ bụ Mozis na ụmụ eze ndị ọzọ nwetara ihe ùgwù agụmakwụkwọ. Ndị so rite uru n’agụmakwụkwọ ndị oké ozu dị otú ahụ bụ “ụmụ nke ndị eze ala ọzọ bụ́ ndị e zitere ma ọ bụ kpọta n’Ijipt dị ka ndị e ji eji, iji ‘zụọ ha’ ma kpọghachizie ha ịchị dị ka ndị eze nọ n’okpuru” Fero. (The Reign of Thutmose IV, nke Betsy M. Bryan dere) O yiri ka ụlọ akwụkwọ ọta akara ndị bụ́ maka ndị na-arụ n’obí eze ọ̀ kwadebere ndị ntorobịa ịrụ ọrụ n’obí eze.a Ihe ndị e dere n’oge e nwere Alaeze Etiti na Alaeze Ọhụrụ n’Ijipt na-ekpughe na ọtụtụ n’ime ndị ozi Fero na ndị nọ n’ọkwá dị elu n’ọchịchị nọgidere na-aza utu aha dị ùgwù bụ́ “Nwa Ụlọ Akwụkwọ Ọta Akara” ọbụna mgbe ha toworo ogo mmadụ.
-
-
Ihe Dị Ukwuu Karịa Akụ̀ Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa nke IjiptỤlọ Nche—2002 | Jun 15
-
-
a Ọ pụrụ ịbụ na ọzụzụ a yiri nke ahụ Daniel na ndị enyi ya nwetara iji rụọ ọrụ ọchịchị na Babilọn. (Daniel 1:3-7) Tụlee akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, isi nke 3, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
-