Otú E Si Edozi Nsogbu n’Udo
IME ihe ike nke mmadụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ malitere ịdị eri mgbe ihe a kpọrọ mmadụ malitere ịdị. Bible na-ekwu na ime ihe ike malitere laa azụ n’ebe Ken nọ, bụ́ nwanne Ebel na ọkpara nke mmadụ abụọ mbụ. Mgbe Chineke nabatara onyinye Ebel karịa nke ya, Ken ‘were iwe dị ọkụ nke ukwuu.’ Olee otú o si mee ihe banyere ọnọdụ ahụ? “Ken biliri imegide Ebel, bụ́ nwanne ya, wee gbuo ya.” Mgbe e mesịrị, ọ chọtara onwe ya n’ime nsogbu dị ukwuu n’ebe Chineke nọ. (Jenesis 4:5, 8-12) Ime ihe ike edozighị nsogbu nke enweghị nguzo dị mma Ken n’ebe Onye Okike ya nọ.
Olee otú anyị pụrụ isi zere ụzọ Ken nke ịhọrọ iji ike ọkpụkpụ aka edozi nsogbu?
Site n’Ime Ihe Ike Gaa n’Ịnagide Ihe
Tụlee otu nwoke nke ji mmasị kirie ogbugbu Stifen, bụ́ onye Kraịst mbụ nwụrụ n’ihi okwukwe ya. (Ọrụ 7:58; 8:1) Nwoke ahụ, bụ́ Sọl nke Tasọs, ekwenyeghị ná nguzo okpukpe Stifen ma kwadoo ogbugbu n’ike ahụ dị ka ụzọ ziri ezi isi kwụsị ọrụ Stifen. N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na Sọl adịghị eme ihe ike n’akụkụ nile nke ndụ ya. Ma ọ dị njikere ịnakwere ime ihe ike dị ka ụzọ isi dozie nsogbu. Ngwa ngwa Stifen nwụsịrị, Sọl ‘malitere isogbu nzukọ ndị Kraịst nke ukwuu, na-aba n’ụlọ nile n’otu n’otu, ọ na-adọkpụkwa ndị ikom na ndị inyom wee rara ha nye ka a tụba ha n’ụlọ mkpọrọ.’—Ọrụ 8:3.
Dị ka ọkà mmụta Bible bụ́ Albert Barnes si kwuo, okwu Grik a sụgharịrị ebe a ịbụ ‘isogbu nke ukwuu’ na-egosi mbibi ndị anụ ọhịa, ndị dị ka ọdụm na wolf, pụrụ ịkpata. “Sọl,” ka Barnes na-akọwa, “wụsara chọọchị ahụ ọnụma dị ka anụ ọhịa—bụ́ okwu siri ike, nke na-egosi ịnụ ọkụ n’obi na oké iwe nke o ji tinye aka ná mkpagbu.” Mgbe Sọl gawara Damaskọs iji jidekwuo ndị na-eso ụzọ Kraịst, ọ “na-ewere ịba mba na ogbugbu kuo ume megide ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị [Kraịst] ruo ugbu a.” Ka ọ na-aga, Jisọs ahụ e si n’ọnwụ kpọlite gwara ya okwu, nke a rụpụtakwara ntọghata a tọghatara Sọl gaa n’Iso Ụzọ Kraịst.—Ọrụ 9:1-19.
Mgbe ntọghata ahụ gasịrị, ụzọ Sọl si emeso ndị ọzọ ihe gbanwere. Otu ihe mere ihe dị ka afọ 16 mgbe nke a gasịrị gosiri mgbanwe ahụ. Otu ìgwè mmadụ bịara n’ọgbakọ dị n’ebe o ji mere ebe obibi n’Antiọk ma gbaa ndị Kraịst nọ ebe ahụ ume ka ha kwekọọ n’Iwu Mosis. Ọ rụpụtara ‘nkewa na-adịghị nta.’ Sọl, onye a maara nke ọma ugbu a dị ka Pọl, tinyere ọnụ n’arụmụka ahụ. Ihe àmà na-egosi na okwu nwuuru ọkụ. Ma Pọl emeghị ihe ike. Kama nke ahụ, o kwenyere ná mkpebi ọgbakọ ahụ iwegara ndị ozi na ndị okenye nke ọgbakọ Jerusalem okwu ahụ.—Ọrụ 15:1, 2.
Na Jerusalem, “ọtụtụ ajụjụ” weere ọnọdụ ọzọ ná nzukọ ndị okenye ahụ. Pọl cheere ruo mgbe ‘ọha ahụ nile kpuchiri ọnụ ha,’ mgbe ahụ kọọkwa banyere ọrụ dị ebube nke mmụọ Chineke n’etiti ndị kwere ekwe a na-ebighị úgwù. Mgbe nkwurịta okwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ gasịrị, ndị ozi na ndị okenye ahụ nọ na Jerusalem bịara “nwee otu obi” ịghara ibo ndị kwere ekwe a na-ebighị úgwù ibu n’ụzọ na-enweghị isi kama nke ahụ ịgba ha ume ka ha “hapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị, na ọbara, na anụ a nyagburu anyagbu, na ịkwa iko.” (Ọrụ 15:3-29) N’ezie, Pọl agbanwewo. Ọ mụtara idozi okwu n’emeghị ihe ike.
Ịnagide Ọchịchọ Ime Ihe Ike
“Ohu nke Onyenwe anyị aghaghị ịbụ onye na-adịghị alụ ọgụ,” ka Pọl mesịrị dụọ n’ọdụ, “kama ọ ghaghị ịdị nwayọọ n’ebe mmadụ nile nọ, ọ ghaghịkwa ịbụ onye nwere ike izi ihe, onye na-anagide ihe ọjọọ, n’ịdị nwayọọ na-adọ ndị na-edo onwe ha imegide ya aka ná ntị.” (2 Timoti 2:24, 25) Pọl gbara Timoti, bụ́ onye nlekọta ọ tọrọ ume, iji ịdị nwayọọ na-edozi ọnọdụ ndị siri ike. Pọl nwere echiche ziri ezi. Ọ maara na a pụrụ ịkpali mmetụta uche ọbụna n’etiti ndị Kraịst. (Ọrụ 15:37-41) N’inwe ezi ihe kpatara ya, o nyere ndụmọdụ, sị: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.” (Ndị Efesọs 4:26) Ịchịkwa iwe n’etiwapụghị n’ọnụma a na-achịkwaghị achịkwa bụ ụzọ kwesịrị ekwesị isi nagide ụdị mmetụta uche ahụ. Ma olee otú a pụrụ isi mezuo nke a?
Taa, ọ dịghị mfe ịchịkwa iwe. “Ibu iwe n’obi na-ewu ewu,” ka Dr. Deborah Prothrow-Stith, bụ́ osote onyeisi nke Ụlọ Akwụkwọ Harvard Maka Ahụ Ike Ọha na Eze kwuru. “N’ezie, nkà maka imekọrịta ihe—nkwurịta okwu, nkwenye, mmetụta ọmịiko, mgbaghara—bụ ndị a na-ekwukarị na ọ bụ nke ndị na-adịghị ike.” Ma, ndị ahụ bụ àgwà dimkpa, ha bụkwa isi ihe na-eduga n’ịchịkwa ọchịchọ ime ihe ike nke pụrụ ijupụta n’ime anyị.
Mgbe ọ ghọrọ onye Kraịst, Pọl mụtara ụzọ ka mma isi mesoo ndịrịta iche nke echiche. Ọ dabeere ná nkụzi nke Bible. Dị ka ọkà mmụta gụrụ akwụkwọ nke Okpukpe Ndị Juu, Pọl maara Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma. Ọ ghaghị ịmaworị banyere akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka: “Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo, ahọpụtakwala otu efu n’ụzọ ya nile.” “Ọ dị mma, bụ́ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, karịa dike: ọ dịkwa mma, bụ́ onye na-achị mmụọ ya, karịa onye na-ewere obodo n’agha.” “Obodo e tikpọrọ etikpọ nke mgbidi na-adịghị ka onye ọ bụla nke na-adịghị egbochi mmụọ ya bụ.” (Ilu 3:31; 16:32; 25:28) Ma, ihe ọmụma ahụ egbochighị Pọl ịhọrọ ime ihe ike megide ndị Kraịst, tupu ntọghata ya. (Ndị Galetia 1:13, 14) Ma gịnị nyeere Pọl aka, dị ka onye Kraịst, idozi okwu ndị na-akpali mmetụta uche site n’iji echiche ziri ezi na ụzọ nke ime ka e kwenye mee ihe kama ime ihe ike?
Pọl tụpenyere anyị azụ̀ mgbe ọ sịrị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi m, dị ka mụ onwe m bụkwa onye na-eṅomi Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:1) O nwere ekele dị ukwuu maka ihe Jisọs Kraịst mewooro ya. (1 Timoti 1:13, 14) Kraịst ghọrọ ihe nlereanya ọ ga-agbaso. Ọ maara otú Jisọs si taa ahụhụ maka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie. (Ndị Hibru 2:18; 5:8-10) Pọl pụrụ ịgba akaebe na amụma Aịsaịa banyere Mesaịa mezuru n’ebe Jisọs nọ: “A chịrị ya n’ihe ike, ma ya onwe ya wedara onwe ya n’ala, wee ghara ịsaghe ọnụ ya; dị ka atụrụ nke a na-akpụrụ ije n’ogbugbu ya, na dị ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị; ee, ọ dịghị asaghe ọnụ ya.” (Aịsaịa 53:7) Pita onyeozi dere, sị: “Onye, mgbe a na-ekwutọ Ya [Jisọs], Ọ dịghị ekwutọghachi ọzọ; mgbe Ọ na-ahụ ahụhụ, Ọ dịghị aba mba; kama Ọ raara onwe ya nye n’aka Onye ahụ Nke na-ekpe ikpe ziri ezi.”—1 Pita 2:23, 24.
Nghọta Pọl nwere banyere ụzọ Jisọs Kraịst si mesoo ọnọdụ ndị tara akpụ kpaliri ya ime mgbanwe. Ọ pụrụ ịdụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ, sị: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.” (Ndị Kọlọsi 3:13) Ikweta na ọ dị mkpa ịghara ime ihe ike ezughị. Ekele maka ihe Jehova na Jisọs Kraịst mewooro anyị na-enye aka inye mkpali dị mkpa iji merie ọchịchọ nke ime ihe ike.
Ọ̀ Na-ekwe Omume?
Mkpali siri ike dị otú ahụ dị otu nwoke bi na Japan mkpa. Nna ya, bụ́ onye soja nke na-ewe iwe ọkụ, ji ime ihe ike chịa ezinụlọ ya. N’ịbụ onye e mesoworo ihe ike na ịhụ nne ya ka ọ na-ata ahụhụ n’otu aka ahụ, nwoke ahụ zụlitere àgwà ime ihe ike. Ọ na-ejigharị mma ndị òtù agha samurai abụọ ndị ogologo ha na-ahaghị nhata bụ́ ndị o ji edozi nsogbu nakwa iji eyi ndị mmadụ egwu.
Mgbe nwunye ya malitere ịmụ Bible, o sonyere n’ọmụmụ ihe ahụ n’ejighị ya kpọrọ ihe. Otú ọ dị, mgbe ọ gụrụ otu akwụkwọ nta a kpọrọ Ozi Ọma Nka Nke Ala-Eze,a ọ gbanwere. N’ihi gịnị? “Mgbe m gụrụ ihe e dere n’okpuru isiokwu nta ndị bụ́ ‘Jisọs Kraịst’ na ‘Ihe-Ngbapụta,’ ihere mere m,” ka ọ na-akọwa. “Ọ bụ ezie na ebiri m ndụ isi ike, m ka nwere mmasị inwe obiọma n’ahụ ndị mụ na ha kpakọrọ. Enwere m ihe ụtọ n’ime ka ndị enyi m nwee obi ụtọ ma nanị ruo n’ókè ọ na-agaghị emetụta ndụ m. Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs, dị njikere inye ndụ ya maka ihe a kpọrọ mmadụ, gụnyere ndị dị ka m. Ahụ kụnwụrụ m, dị ka a ga-asị na a kụrụ m hama.”
Ọ kwụsịrị iso ndị enyi mbụ ya na-akpakọrịta, n’oge na-adịghịkwa anya, o debara aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Ụlọ akwụkwọ a na-enyere ndị debara aha na ya aka inweta nkà nke ịkụziri ndị ọzọ Bible. Ọzụzụ ahụ wetakwuuru nwoke a abamuru. Ọ na-echeta, sị: “Mgbe m bụ nwata, ahọọrọ m iyi egwu na ime ihe ike n’ihi na apụghị m ịkọwara ndị ọzọ mmetụta m. Ka m mụtara ịgwa ndị ọzọ echiche m, amalitere m isoro ha na-atụgharị uche kama ime ihe ike.”
Dị ka Pọl, ò mewo ka ụzọ ndụ Kraịst bụrụ nke ya? E lere okwukwe ya ule mgbe otu onye bụbu enyi ya bụ́ onye ya na ya gbara ndụ nkwekọrịta nwara ịkwụsị ya ịghọ onye Kraịst. “Enyi” ya tiri ya ihe ma kwuluo Chineke ya, bụ́ Jehova. Nwoke ahụ na-emebu ihe ike chịkwara onwe ya ma rịọ mgbaghara maka enweghị ike idebe ọgbụgba ndụ ahụ. Ná mwute, onye ya na ya ‘na-ekwekọrịta’ hapụrụ ya.
Site n’imeri ọchịchọ ime ihe ike ya, nwoke a na-ewebu oké iwe enwetawo ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ, bụ́ ndị ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi kekọrọ. (Ndị Kọlọsi 3:14) N’ezie, ihe karịrị afọ 20 mgbe ọ ghọsịrị onye Kraịst raara onwe ya nye, ọ na-eje ozi ugbu a dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova. Lee ọṅụ ọ bụ nye ya ịbụ onye nwere ike igosi site na Bible na mmadụ ndị nwere àgwà yiri nke anụ ọhịa pụrụ ịmụta idozi nghọtahie n’emeghị ihe ike dị nnọọ ka ọ mụtara ya! Leekwa ihe ùgwù ọ bụ nye ya inwe ike ịrụtụ aka ná mmezu dị ebube nke okwu amụma ndị bụ́: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri”!—Aịsaịa 11:9.
Dị ka Pọl onyeozi na nwoke a na-emebu ihe ike, gị onwe gị kwa pụrụ ịmụta ime ihe banyere ọnọdụ ndị na-akpasu iwe, na-edozi nsogbu n’udo. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Pọl nwere echiche ziri ezi. Ọ maara na mmetụta uche pụrụ ịdị ọkụ ọbụna n’etiti ndị Kraịst
[Foto dị na peeji nke 7]
Inwe ekele maka ihe Chineke mewooro anyị na-eme ka e nwee mmekọrịta udo