-
‘Obi Malitere Iru Ọgbakọ Niile Ala n’Oge Ahụ’‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
12 Ananayas rubere isi, gaa rụọ ọrụ ahụ e nyere ya, Chineke gọzikwara ya. Ị̀ na-erube isi n’iwu e nyere anyị ka anyị na-agba àmà nke ọma, ọ bụrụgodị na obi akachaghị gị? Ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, na-aga agwa ndị anyị na-amaghị okwu, na-eme ka obi wụba ụfọdụ n’ime anyị n’afọ. Ọ na-esiri ndị ọzọ ike izi ndị mmadụ ozi ọma n’ahịa ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ ha, n’okporo ámá, ma ọ bụkwanụ iji telefon ma ọ bụ akwụkwọ ozi ezi ha ozi ọma. Ananayas kwụsịrị ịtụ ụjọ. Ọ bụ ya mere o ji nwee ihe ùgwù ime ka mmụọ nsọ dakwasị Sọl.b Ananayas meliri ihe a maka na ọ tụkwasịrị Jizọs obi, werekwa Sọl ka onye ga-abụ nwanna ya. Anyị nwere ike ịkwụsị ịtụ ụjọ ma anyị mee ka Ananayas, tụkwasị Jizọs obi na ọ bụ ya na-eduzi ozi ọma anyị na-ezisa, na-enwekwara ndị mmadụ ọmịiko, ma weredị ndị ọtụtụ ndị kacha atụ ụjọ ka ndị nwere ike ịbụ ụmụnna anyị.—Mat. 9:36.
-
-
‘Obi Malitere Iru Ọgbakọ Niile Ala n’Oge Ahụ’‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
b Ọ na-abụkarị naanị ndịozi Jizọs na-eme ka mmụọ nsọ dakwasị ndị mmadụ. Ma nke Sọl pụrụ iche. Ọ ga-abụ na Jizọs nyere Ananayas ikike ime ka mmụọ nsọ dakwasị Sọl. Mgbe Sọl ghọrọ Onye Kraịst, ya na ndịozi iri na abụọ Jizọs emekọghị ihe ruo ogologo oge. Ma, o nwere ike ịbụ na ọ nọ na-eje ozi n’oge niile ahụ. N’ihi ya, ọ ga-abụ na Jizọs chọrọ ịhụ na Sọl nwetara ikike ọ ga-eji rụọ ọrụ ikwusa ozi ọma e nyere ya.
-