-
“Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
22, 23. Olee ihe ụmụnna nọ n’Antiọk mere iji gosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya, oleekwa otú ndị na-efe Chineke si eme ụdị ihe ahụ n’oge a?
22 Antiọk bụ “ebe mbụ a kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Ndị Kraịst otú Chineke si chọọ.” (Ọrụ 11:26b) Aha ahụ Chineke kwadoro ka ha zawa dabara n’aha ndị chọrọ iso ụzọ Kraịst kwesịrị ịza. Mgbe ndị mba ọzọ ghọrọ Ndị Kraịst, ndị Juu na ndị Jentaịl kwere ekwe hà hụwara ibe ha n’anya? Ka anyị hụ ihe mere mgbe oké ụnwụ dara n’ihe dị ka afọ 46 O.N.K.e N’oge ochie, ụnwụ na-akpa ndị ogbenye aka ọjọọ n’ihi na e nweghị ego ma ọ bụ nri ha na-edosa maka oge ọjọọ. Mgbe ụnwụ a dara, ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst bi na Judia enweghị ihe oriri na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa maka na ọ ga-abụ na ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ogbenye. Mgbe ụmụnna bi n’Antiọk, ma ndị Jentaịl bụ́ Ndị Kraịst, nụrụ otú ihe si kwụrụ, ha zigaara “ụmụnna ha bi na Judia ihe enyemaka.” (Ọrụ 11:29) Ihe a ha mere gosiri na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya n’eziokwu.
-
-
“Chineke Anaghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
e Onye Juu na-ede akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Josifọs kwuru na “oké ụnwụ” ahụ dara n’oge Eze Ukwu bụ́ Klọdiọs na-achị (n’afọ 41-54 O.N.K.).
-