Ọ̀ Bụ Otuto Ka Ọ Bụ Okwu Ire Ụtọ?
MMADỤ gwa gị sị, “Isi ọhụrụ a i doziri magburu onwe ya!” Ọ̀ bụ otuto ka ọ bụ okwu ire ụtọ? “Uwe ahụ mara gị nnọọ mma n’ahụ!” Otuto ka ọ̀ bụ okwu ire ụtọ? “Nke a bụ nri kasị ụtọ m ritụrụla!” Ọ̀ bụ otuto ka ọ bụ okwu ire ụtọ? Mgbe anyị natara okwu ịja mma ndị dị otú ahụ, anyị nwere ike ịdị na-eche ma hà sitere n’obi ma bụrụkwa eziokwu ka ha bụ nanị iji mee anyị obi ụtọ n’abụchaghị nke onye ahụ kwuru ya kweere.
Olee otú anyị pụrụ isi mara ma ihe mmadụ na-agwa anyị ọ̀ bụ otuto ka ọ bụ okwu ire ụtọ? Ọ̀ dị ihe o mere? Ọ̀ bụ na anyị apụghị nanị ịnakwere ihe e kwuru n’ajụghị ase ma nara obi ụtọ ọ na-enye anyị? Gịnị banyere mgbe anyị na-eto ndị ọzọ? Ọ̀ dịwo mgbe anyị nyochara nzube anyị? Iche echiche banyere ajụjụ ndị a pụrụ inyere anyị aka igosi nghọta na iji ire anyị eme ihe n’ụzọ na-ewetara Jehova Chineke otuto.
A Kọwaa Otuto na Okwu Ire Ụtọ
Webster’s Dictionary na-akọwa otuto dị ka okwu nnwapụta ma ọ bụ ịja mma, okwu ahụ pụkwara ịpụta ofufe ma ọ bụ inye otuto. O doro anya na ihe ihe abụọ ikpeazụ ahụ pụtara na-ezo aka n’otuto a na-enye Jehova Chineke. Nke a bụ akụkụ dị mkpa nke ezi ofufe, dị ka ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ na-agba ume ya: “N’ihi na ọ dị mma . . . , ọ dị ụtọ, otuto mara mma.” “Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Ja.”—Abụ Ọma 147:1; 150:6.
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na a pụghị inye ụmụ mmadụ otuto. A pụrụ inye ya, n’echiche nke ịja mma, nnwapụta, ma ọ bụ ikpe ziri ezi. N’ilu Jisọs tụrụ, otu onye nwenụ gwara ohu ya, sị: “I mere nke ọma, ezi ohu nke kwesịrị ka a tụkwasị [ya] obi.”—Matiu 25:21.
N’aka nke ọzọ, a na-akọwa okwu ire ụtọ dị ka otuto ụgha, na-esiteghị n’obi ma ọ bụ nke gabigara ókè, ebe onye ahụ na-ekwu okwu ire ụtọ na-ebukarị ọdịmma onwe onye n’obi. A na-ekwupụta ịja mma aghụghọ ma ọ bụ okwu ire ụtọ iji nweta ihu ọma ma ọ bụ abamuru ihe onwunwe site n’aka onye ọzọ ma ọ bụ iji nye echiche nke ibu ọrụ n’ebe onye ahụ na-ekwu okwu ire ụtọ nọ. Ya mere ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akwali ndị na-ekwu okwu ire ụtọ. Dị ka Jud 16 na-ekwu, ha “na-adị njikere ịgwa ndị ọzọ okwu ire ụtọ mgbe ha hụrụ uru ụfọdụ n’ime ya.”—The Jerusalem Bible.
Echiche Akwụkwọ Nsọ
Gịnị bụ echiche Akwụkwọ Nsọ banyere inye ụmụ mmadụ ibe anyị otuto? Jehova na-esetịpụ ụkpụrụ anyị ga-agbaso n’ihe banyere nke a. A na-agwa anyị n’ime Bible na a ga-enye anyị otuto ma ọ bụrụ na anyị emee uche Jehova. Pọl onyeozi na-ekwu na “mmadụ nile n’otu n’otu ga-enwekwa otuto ha site n’aka Chineke.” Pita na-agwa anyị na ọdịdị nke okwukwe anyị a nwapụtara anwapụta “na-eweta otuto.” Ya mere eziokwu ahụ bụ na Jehova ga-enye ụmụ mmadụ otuto na-egosi anyị na inye ezi otuto bụ ihe obiọma, ihe ịhụnanya, na ihe na-aba uru, nke a na-agaghị eleghara anya.—1 Ndị Kọrint 4:5; 1 Pita 1:7.
Ebe ọzọ otuto pụrụ isi bịara anyị, dị ka Bible na-ekwu, bụ ndị isi ọchịchị bụ́ ndị na-ahụ àgwà ọma anyị ma na-aja anyị mma sitere n’obi. “Na-eme ezi ihe,” ka a na-agwa anyị, “ị ga-enwekwa otuto site n’aka ya.” (Ndị Rom 13:3) Anyị pụkwara inweta otuto site n’aka ndị mmadụ bụ́ ndị ji obi ha nile kwere ihe ha na-ekwu, ndị na-enweghịkwa ebumnobi e zobere ezobe n’inye anyị otuto. Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ na-ekwu n’Ilu 27:2, sị: “Ka onye ala ọzọ too gị, ma ọ bụghị ọnụ gị.” Nke a na-egosi na ịnara otuto site n’aka ụmụ mmadụ kwesịrị ekwesị.
Ọ dịghị otú ahụ n’ihe banyere ikwu okwu ire ụtọ ma ọ bụ ịnara ya. Gịnị mere Jehova ji kpọọ okwu ire ụtọ asị otú a? Otu ihe bụ na ọ dịghị esite n’obi, Jehova na-akatọkwa àgwà ihu abụọ. (Tụlee Ilu 23:6, 7.) Ọzọ, ọ bụghị ime ihe n’eziokwu. N’ịkọwa ndị na-ekwesịghị ihu ọma Chineke, ọbụ abụ ahụ na-asị: “Nanị ihe ha na-eme bụ ịghara ibe ha ụgha, egbugbere ọnụ na-ekwu okwu ire ụtọ, okwu sitere n’obi abụọ. Ka Yahweh bepụ egbugbere ọnụ ọ bụla na-ekwu okwu ire ụtọ.”—Abụ Ọma 12:2, 3, JB.
Karịsịa, okwu ire ụtọ adịghị egosi ịhụnanya. Ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-akpali ya. Mgbe o kwusịrị banyere ndị na-ekwu okwu ire ụtọ, ọbụ abụ bụ́ Devid na-ehota ha dị ka ndị na-ekwu, sị: “Anyị na-eme ire anyị ka ọ dị ike; egbugbere ọnụ anyị dị n’akụkụ anyị: ònye ka anyị nwere dị ka onyenwe anyị?” Jehova na-akọwa ndị dị otú ahụ na-achọ ọdịmma onwe onye nanị dị ka ‘ndị na-apụnara ndị e wedara n’ala ihe.’ E jiriwo ire ha na-ekwu okwu ire ụtọ mee ihe, ọ bụghị iwuli ndị ọzọ elu, kama iji pụnara ha ihe ma kpagbuo ha.—Abụ Ọma 12:4, 5.
Okwu Ire Ụtọ—Ọnyà
“Nwoke nke na-agwa mmadụ ibe ya okwu ire ụtọ na-agbasara nzọụkwụ ya nile ụgbụ.” Otú ahụ ka Eze Solomọn nwere amamihe na-ekwu, nke ahụ bụkwa nnọọ eziokwu! (Ilu 29:5) Ndị Farisii gbalịrị iji okwu ire ụtọ gbaara Jisọs ọnyà. Ha sịrị: “Onye ozizi, anyị amatawo na Ị bụ onye eziokwu, na Ị na-ezikwa ụzọ Chineke n’eziokwu, na Ị dịghị asọkwa onye ọ bụla anya: n’ihi na Ị dịghị ele mmadụ anya n’ihu.” Lee ka nke ahụ si daa ka ihe na-akụjụ obi! Ma okwu nrafu ha etigharịghị Jisọs anya. Ọ maara na ha ekweghị ná nkụzi eziokwu ya kama ha na-agbalị nanị ịmata ya n’ọnyà n’ihe ọ ga-ekwu n’okwu banyere ịtụ ụtụ isi nye Siza.—Matiu 22:15-22.
Eze Herọd nke narị afọ mbụ dị nnọọ iche n’ebe Jisọs nọ. Mgbe o kwuru okwu ihu ọha n’obodo Sizarịa, ndị mmadụ zaghachiri, sị: “Ọ bụ olu chi, ọ bụghịkwa olu nke mmadụ.” Kama ịbara ndị ahụ mba maka otuto ụgha pụtara ìhè dị otú ahụ, Herọd nakweere okwu ire ụtọ ahụ. Mmụọ ozi Jehova wetara nkwụghachi ozugbo ebe ọ bụ na e ji nrikpu nke ikpuru tie Herọd ihe otiti bụ́ nke kpatara ọnwụ ya.—Ọrụ 12:21-23.
Onye Kraịst tozuru okè ga-amụrụ anya ịmata mgbe okwu bụ nke ire ụtọ. Ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịkpachara anya karịsịa mgbe onye nwere okwu ikpe na-ekwu ọtụtụ okwu ịja mma, ikekwe ọbụna ruo n’ókè nke iji otu onye okenye atụnyere ibe ya ma na-ekwu otú onye ahụ ọ na-agwa okwu si nwee obiọma ma na-egosi ọmịiko karị.
Bible na-egosi n’ụzọ doro anya ọnyà ọzọ okwu ire ụtọ pụrụ iweta mgbe ọ na-akọwa otú nwanyị nrafu siri raba otu nwa okorobịa n’omume rụrụ arụ. (Ilu 7:5, 21) Ịdọ aka ná ntị a dabara adaba n’ọnọdụ dị taa. N’ime ndị a na-achụpụ n’ọgbakọ ndị Kraịst kwa afọ, a na-achụpụ ọtụtụ n’ihi omume rụrụ arụ. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ndanye dị otú ahụ ná mmehie dị oké njọ malitererịị n’okwu ire ụtọ? Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ nwere ọchịchọ dị ukwuu maka okwu ịja mma na ịbụ ndị a na-ekwu ihe ọma banyere ha, okwu nrafu si n’egbugbere ọnụ okwu ire ụtọ pụrụ ibelata ikike onye Kraịst nwere ịlụso àgwà na-ezighị ezi ọgụ. Mgbe a na-echeghị nche megide ihe ndị dị otú ahụ, ọ pụrụ iduga n’ihe ndị dị oké njọ.
Ịnọ na Nche Megide Okwu Ire Ụtọ
Okwu ire ụtọ na-akwalite ịhụ onwe onye n’anya ma ọ bụ ịdị nganga nke onye a na-agwa okwu ire ụtọ. Ọ na-enyekarị mmadụ echiche gabigara ókè nke ihe o ruru, na-eme ka o chee na ya karịrị ndị ọzọ n’ụzọ ụfọdụ. Ọkà ihe ọmụma bụ́ François de La Rochefoucauld ji okwu ire ụtọ tụnyere ego kanta, “bụ́ nke a garaghị eji na-azụ ihe ma ọ́ bụghị n’ihi nganga.” Ya mere, ụzọ isi chebe onwe onye bụ ịṅa ntị na ndụmọdụ dị irè nke Pọl onyeozi: ‘M sị onye ọ bụla nọ n’etiti unu, ka ọ ghara ịtụkwasị uche n’onwe ya karịa nke o kwesịrị ịtụkwasị uche; kama ịtụkwasị uche n’inwe uche zuru okè, dị ka Chineke kere ọ̀tụ̀tụ̀ nke okwukwe nye mmadụ nile n’otu n’otu.’—Ndị Rom 12:3.
Ọ bụ ezie na àgwà anyị bu pụta ụwa bụ ịchọ ịnụ ihe na-atọ ntị anyị ụtọ, ihe dị anyị mkpa n’ezie ọtụtụ mgbe bụ ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị dabeere na Bible. (Ilu 16:25) Eze Ehab chọrọ ịnụ nanị ihe tọrọ ya ụtọ; ọbụna na ndị ohu ya rịọrọ Maịkaịa ka o mee ka okwu ya “dị ka okwu otu onye n’ime ha [ndị amụma na-ekwu okwu ire ụtọ nke Ehab], gị kwuokwa ezi ihe.” (1 Ndị Eze 22:13) A sị na Ehab dị njikere ige ntị n’okwu bụ eziokwu ma gbanwee ụzọ nnupụisi ya, ọ gaara enwe ike igbochi ajọ mmeri ndị e meriri Israel nakwa ọnwụ ya. Maka ọdịmma ime mmụọ nke anyị, anyị kwesịrị ịdị ngwa n’ịnakwere ndụmọdụ siri ike ma na-egosikwa ịhụnanya nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye a họpụtara ahọpụta, bụ́ ndị chọrọ inyere anyị aka ịnọgide n’ụzọ kwụrụ kwem nke eziokwu, kama ịdị na-achọ ndị na-anọgide na-agwa anyị otú anyị si bụrụ ndị magburu onwe ha, na-eji okwu ire ụtọ na-akpakeli ntị anyị!—Tụlee 2 Timoti 4:3.
Ndị Kraịst agaghị anwa anwa, ihe ọ sọrọ ya bụrụ, ịchọ iji okwu ire ụtọ eme ihe. Dị ka Elaịhu kwesịrị ntụkwasị obi, ha ji mkpebisi ike na-ekpe ekpere, sị: “Ka m ghara ile mmadụ anya n’ihu, ma ọ bụ ịgwa onye ọ bụla okwu ire ụtọ; n’ihi na amaghị m ikwu okwu ire ụtọ, ka Onye kere m wee ghara iwepụ m n’oge na-adịghị anya.” Mgbe ahụ, dị ka Pọl, ha ga-enwe ike ikwu, sị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla a hụrụ anyị n’ikwu okwu ire ụtọ . . . ma ọ bụ n’iwere aghụghọ gbachita anyaukwu.”—Job 32:21, 22, An American Translation; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:5, 6.
Otuto n’Ebe O Kwesịrị
Ilu sitere n’ike mmụọ nsọ na-egosi na otuto pụrụ ịrụ ọrụ dị ka ihe e ji atụ ihe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, na-asị: “Ite nnụcha bụ maka ọlaọcha, ite nnụcha dị oké ọkụ bụkwa maka ọlaedo, ma e ji otuto ele àgwà ule.” (Ilu 27:21, The New English Bible) Ee, otuto pụrụ ịzụlite echiche nke ọkaibe ma ọ bụ nganga, na-eduje n’ọdịda mmadụ. N’aka nke ọzọ, ọ pụrụ ikpughe obi umeala na ịdị umeala n’obi ya ma ọ bụrụ na ọ nakwere na ya ji Jehova ụgwọ maka ihe ọ bụla o meworo nke wetawooro ya otuto.
Otuto sitere n’obi maka omume ma ọ bụ ihe ndị kwesịrị ekwesị a rụzuru na-ewuli ma onye na-enye enye ma onye na-anara anara elu. Ọ na-eme ka otu onye nwee ekele na-ekpo ọkụ na nke ziri ezi n’ebe onye ọzọ nọ. Ọ na-akwalite nchụso nke ihe mgbaru ọsọ kwesịrị otuto. Otuto kwesịrị ekwesị e nyere ndị na-eto eto pụrụ ime ka ha chọọ ịrụsikwu ọrụ ike. Ọ pụrụ inye aka kpụzie àgwà ha ka ha na-ezube ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị a na-atụ anya n’aka ha.
Ya mere, ka anyị zere okwu ire ụtọ—ma ànyị na-agwa ya ndị ọzọ ma ọ bụ na ndị ọzọ na-agwa anyị ya. Ka anyị dị obi umeala mgbe anyị na-anara otuto. Ka anyị na-emesapụ aka, jirikwa mkpụrụ obi dum na-enye otuto—nye Jehova mgbe nile n’ofufe anyị na nye ndị ọzọ site n’obi anyị n’ụdị ezi ịja mma na ekele, na-echeta na “okwu e kwuru na mgbe ya, lee ka o si dị mma nke ukwuu!”—Ilu 15:23.