-
Ha “Wee Na-ejupụta na Mmụọ Nsọ, Obi Ana-abụkwa Ha Sọ Aṅụrị”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
6, 7. (a) Ònye bụ Sajiọs Pọlọs, gịnịkwa mere Baa-Jizọs ji chọọ igbochi ya ịnabata ozi ọma? (b) Gịnị ka Sọl mere iji kụghasịa atụmatụ Baa-Jizọs?
6 N’oge ndịozi, e ji ife arụsị mara ndị bi na Saịprọs. Mgbe Banabas na Sọl ruru na Pefọs, ha chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. Pefọs dị n’ebe ọdịda anyanwụ Saịprọs. N’ebe ahụ, ha hụrụ “otu nwoke onye Juu, bụ́ dibịa afa. Aha ya bụ Baa-Jizọs. Ọ bụkwa onye amụma ụgha. Ya na onye na-achị ebe ahụ nọ. Aha onye a bụ Sajiọs Pọlọs. Ọ bụ nwoke ma ihe.”f N’oge ahụ, ọtụtụ ndị Rom a ma ama na-agakwuru onye na-agba afa ma ọ bụ onye na-agụ kpakpando ka o nyere ha aka ime mkpebi ndị dị mkpa. Sajiọs Pọlọs, bụ́ “nwoke ma ihe,” medịrị otú ahụ. Ma, ozi Alaeze Chineke masịrị Sajiọs Pọlọs, ya ‘achọọ ịnụ okwu Chineke.’ Ma, obi adịghị Baa-Jizọs, onye a na-etu Elimas, mma. A na-etu ya aha a n’ihi ọrụ ọ na-arụ. Elimas pụtara “dibịa afa.”—Ọrụ 13:6-8.
-
-
Ha “Wee Na-ejupụta na Mmụọ Nsọ, Obi Ana-abụkwa Ha Sọ Aṅụrị”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
f Ọ bụ Ndị Omeiwu n’Ụlọ Nzụkọ Ndị Rom na-achị Saịprọs. Ha họpụtara gọvanọ na-achị àgwàetiti a ka ọ nọchite anya ha.
-