Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche—1991 | Jun 15
    • 7, 8. Olee ụzọ o si doo anya na iwu Chineke banyere ọbara metụtara ndị Kraịst?

      7 Akụkọ ihe mere eme na-egosi anyị ihe mere mgbe oge ụfọdụ gasịrị mgbe nzukọ nke òtù na-achị isi nke ndị Kraịst kpebiri ma ọ̀ bụ na ndị Kraịst aghaghị idebe iwu nile nke Israel. N’okpuru nduzi Chineke, ha kwuru na a gaghị amanye ndị Kraịst idebe ụkpụrụ iwu Mosis ahụ, kama na ọ bụ ihe “dị mkpa” ka ha “hapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị, na ọbara, na anụ a nyagburu anyagbu [anụ a na-egbupụghị ọbara], na ịkwa iko.” (Ọrụ 15:22-29) Ha si otú a mee ka ọ pụta ìhè na izere ọbara dị mkpa n’ihe banyere omume dị ka izere ikpere arụsị na ịkwa iko jọgburu onwe ya.a

      8 Ndị Kraịst oge mbụ kwadoro mmachibido nke a Chineke nyere. Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere nke a, onye ọkà mmụta bụ onye Britain, bụ́ Joseph Benson kwuru, sị: “Mmachibido nke a a machibidoro iri ọbara, nke e nyere Noa na ụmụ ya, nke a gwaghachikwara ụmụ Israel . . . adịbeghị mgbe ọ bụla e wepụrụ ya, kama nke ahụ, e mesiri ya ike n’okpuru Agba Ọhụrụ, Ọrụ Ndị Ozi isi iri na ise; wee si otú a mee ka ọ bụrụ iwu nke nọgidere na-adịrị mmadụ.” Ma, ihe Bible kwuru banyere ọbara ọ̀ ga-amachibidokwu ojiji a na-eji ọbara eme ihe n’ọgwụgwọ ọrịa n’oge a, dị ka mmịnye ọbara, bụ́ nke o doro anya na a dịghị eji ya eme ihe n’oge Noa ma ọ bụ n’oge ndị ozi ahụ?

  • Iji Ọbara Azọpụta Ndụ—N’ụzọ Dị Aṅaa?
    Ụlọ Nche—1991 | Jun 15
    • a Iwu ahụ jiri okwu ndị a mechie: “Ọ bụrụ na unu edebe onwe unu ghara imetụ ihe ndị a aka, ọ ga-adịrị unu mma. Jisienụ ike [“Ahụ ike dịkwara unu!” NW].” (Ọrụ 15:29) Okwu ahụ bụ ‘Ahụ ike dịkwara unu’ abụghị nkwa nke pụtara, ‘Ọ bụrụ na unu ezere ọbara na ịkwa iko, ahụ ga-adị unu mma karị.’ Ọ bụ okwu mmechi efu dịịrị akwụkwọ ozi ahụ, dị ka, ‘Nọdụnụ nke ọma.’

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya