Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 3/15 p. 32
  • “O Wee Mee Nnọọ Ka Anyị Bịa”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “O Wee Mee Nnọọ Ka Anyị Bịa”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 3/15 p. 32

“O Wee Mee Nnọọ Ka Anyị Bịa”

ILE ọbịa bụ ihe e ji mara mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Dị ka ihe atụ, n’India, ezinụlọ nwere ike ịnọ agụụ iji nwee ike inye onye ọbịa bịaara ha na mberede nri. Nwanyị bi n’Iran anaghị ekwe ka ihe oriri kọ na friji ya, iji na-ele ndị ọbịa mberede ọbịa.

E jikwa mmụọ dị otú ahụ nke iji mmesapụ aka enye ihe mara ọtụtụ ndị a kpọrọ aha na Bible. Otu ihe atụ a maara nke ọma bụ nke Lidia, bụ́ ma eleghị anya onye na-eso ụzọ ndị Juu nke bi na Filipaị, bụ́ obodo a kasị mara amara n’ógbè Masedonia. N’otu ụbọchị izu ike, Pọl onyeozi na ndị ha na ya so eme njem hụrụ Lidia na ụmụ nwanyị ndị ọzọ ka ha gbakọrọ n’akụkụ osimiri dị ná mpụga Filipaị. Jehova meghere obi ya ka Pọl nọ na-ekwu okwu n’ụbọchị ahụ. N’ihi nke a, e mere ya na ezinụlọ ya baptizim. Ọ rịọrọ ndị njem ahụ, sị: “Ọ bụrụ na unu ewerewo m dị ka onye na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova, batanụ n’ime ụlọ m.” Luk bụ́ onye ya na Pọl so eje ozi kwuru, sị: “O wee mee nnọọ ka anyị bịa.”—Ọrụ 16:11-15.

Dị ka Lidia, Ndị Kraịst taa na-ele ndị kwere ekwe ibe ha ọbịa, dị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị nwunye ha. Ndị ahụ na-ele ha ọbịa ‘na-eme nnọọ ka ha bịa.’ N’aka nke ọzọ, a na-eji mkparịta ụka ndị na-ewuli elu na nnọkọ nke ụmụnna akwụghachi ndị ahụ na-ele ọbịa ụgwọ. N’agbanyeghị na ọtụtụ Ndịàmà Jehova ejighị ego, ha ‘na-agbaso omume nke ile ọbịa.’ (Ndị Rom 12:13; Ndị Hibru 13:2) Mmụọ nke inye ihe ha nwere na-eme ha obi ụtọ. Jizọs kwuru nnọọ eziokwu mgbe ọ sịrị: “A na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya