-
Gụọ Okwu Chineke Ma Jeere Ya Ozi n’EziokwuỤlọ Nche—1996 | Mee 15
-
-
5. Gịnị dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-achọta eziokwu nke Chineke?
5 Eziokwu Chineke bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Ịchọta ya chọrọ igwu ala, ịnọgide na-enyocha Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ nanị site n’ịdị ka ụmụ akwụkwọ yiri ụmụaka nke Onye Nkụzi Ukwu ahụ ka anyị na-enweta amamihe ma bịa ghọta egwu nsọpụrụ nke Jehova. (Ilu 1:7; Aịsaịa 30:20, 21) N’ezie, anyị kwesịrị iji Akwụkwọ Nsọ nwapụta ihe dị iche n’onwe anyị. (1 Pita 2:1, 2) Ndị Juu bi na Beria “ka ndị bi na Tesalọnaịka mma n’obi, ebe ha weere obi dị ọkụ nile nara okwu ahụ nke ọma, na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a [Pọl kwuru] dị otú a.” A jara ndị Beria mma maka ime nke a kama ịbara ha mba.—Ọrụ 17:10, 11.
-
-
Gụọ Okwu Chineke Ma Jeere Ya Ozi n’EziokwuỤlọ Nche—1996 | Mee 15
-
-
7. Gịnị dị mkpa iji too ná nghọta anyị nke Bible, n’ihi gịnịkwa?
7 Iji too ná nghọta anyị nke Bible, nduzi nke mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Chineke, dị anyị mkpa. “Mmụọ Nsọ na-enyocha ihe nile, ọbụna ihe nile dị omimi nke Chineke” iji wepụta ihe ha pụtara. (1 Ndị Kọrint 2:10) Ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka gaje ‘ịnwa ihe nile’ dị n’amụma ọ bụla ha nụrụ. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:20, 21) Mgbe Pọl degaara ndị Tesalọnaịka akwụkwọ (ihe dị ka 50 O.A.), nanị akụkụ Akwụkwọ Nsọ Grik e deelara bụ Oziọma Matiu. Ya mere ndị Tesalọnaịka na ndị Beria pụrụ ịnwapụta ihe nile, ma eleghị anya site n’inyocha nsụgharị Septuagint Grik nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọ dị ha mkpa ịgụ na ịmụ Akwụkwọ Nsọ, otú ahụ ka ọ dịkwa anyị.
-