Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 7/1 p. 32
  • Oge Ịchọ Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oge Ịchọ Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 7/1 p. 32

Oge Ịchọ Chineke

IHE osise ahụ dị na peji nke a bụ nke Acropolis ahụ dị n’Atens, ebe bụbu ebe ofufe nke ọtụtụ chi na chi nwanyị dị iche iche. N’okpuru Acropolis ka e nwere Areọpagọs, bụ́ ebe a sịrị na e nwere ụlọikpe na-ekpe ikpe ziri ezi n’oge ochie. Ọ bụ n’ebe a, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga, ka Pọl onyeozi guzoro wee kwuo okwu dị ịrịba ama n’ezie. Ihe ndị a na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị o kwuru:

“[Chineke] wee site n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ, ka ha biri n’elu ụwa nile, mgbe o debesịrị oge ha a kaworo aka na ókè nile nke ebe obibi ha; ka ha wee chọọ Chineke, ma eleghị anya ha ga-asọ ìsì, wee chọta ya, ọ bụ ezie na ọ nọghị n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị: n’ihi na ọ bụ n’ime ya onwe ya ka anyị na-adị ndụ, na-ejegharịkwa, na-adịkwa.”—Ọrụ 17:26-28.

Lee ọdịiche a ga-enweworị n’akụkọ ihe mere eme ma ọ bụrụ na ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya ṅara ntị n’okwu Pọl! Lee ọtụtụ agha, oké ịta ahụhụ a gaara egbochiworị ma ọ bụrụ na ụmụ mmadụ ghọtara ọdịmma ha nwekọrọ ọnụ dị ka ụmụ nke otu nwoke e kere site n’aka Eze Onyenwe anyị, bụ́ Jehova.

Taa, a na-etisasị ihe a kpọrọ mmadụ site n’ịhụ mba n’anya, ihe mmadụ bụ, ịkpọasị agbụrụ, na ahaghị nhata nke ọkwá. N’agbanyeghị nke ahụ, okwu Pọl ka dịkwa irè. Anyị nile bụ ụmụ nke otu nwoke ahụ Chineke kere. N’echiche nke ahụ, anyị nile bụ ụmụnne na ụmụnna. Oge agabeghịkwa ịchọ Chineke mgbe a pụrụ ịchọta ya.

Okwu Pọl dị oké mkpa ọbụna karị mgbe anyị tụlere ihe ikpeazụ o kwuru n’okwu ya. Ọ sịrị: “[Chineke edebewo] otu ụbọchị nke ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya site n’aka otu nwoke ọ kara aka; o nyekwara mmadụ nile ihe ha ga-eji kwere nke a, ebe o mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”

Mbilite n’ọnwụ nke Jisọs bụ eziokwu nke akụkọ ihe mere eme, dịkwa ka Pọl na-egosi, ọ bụ ihe a ga-eji kwere na a ga-enwe ụbọchị ikpe maka ihe a kpọrọ mmadụ. Olee mgbe? Ee, anyị maara na ọ fọrọ nke nta ka o jiri 2,000 afọ dị nso karịa mgbe Pọl guzoro n’Areọpagọs wee kwuo okwu ndị ahụ. N’ezie, mmezu nke amụma Bible na-egosi na ọ dị ezi nso. Lee ihe na-akpali iche echiche nke ahụ bụ! Lee ka o si bụrụ ihe dị ngwa na anyị chọrọ Chineke n’ezi obi nile, ebe ọ bụ na, dị ka Pọl gwara ndị Atens ahụ, “ugbu a ọ na-agwa mmadụ ka ha nile chegharịa n’ebe nile”!—Ọrụ 17:30, 31.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya