-
“Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
“E Nwere Ọtụtụ Ndị n’Obodo A Ga-ekwere na M” (Ọrụ 18:9-17)
12. Olee otú ọhụụ Pọl hụrụ si gbaa ya ume?
12 Ọ bụrụ na ịnọ na Kọrịnt na-ekwusa ozi ọma emewela Pọl obi abụọ, ọ ga-abụrịrị na ọ kwụsịrị inwe obi abụọ ahụ mgbe Onyenwe anyị Jizọs pụtara n’ihu ya n’ọhụụ ma gwa ya, sị: “Ụjọ atụla gị, kama na-ekwusa ozi ọma, adala mbà, n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị n’obodo a ga-ekwere na m.” (Ọrụ 18:9, 10) N’eziokwu, ọhụụ ahụ gbara ya ume. Onyenwe anyị ji aka ya mee ka obi sie Pọl ike na ọ ga-echebe ya nakwa na o nwere ọtụtụ ndị e kwesịrị izi ozi ọma n’obodo ahụ. Olee ihe Pọl mere mgbe ọ hụchara ọhụụ ahụ? Baịbụl kwuru, sị: Ọ “nọrọ ebe ahụ otu afọ na ọnwa isii, na-akụziri ndị mmadụ okwu Chineke.”—Ọrụ 18:11.
-
-
“Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
-
-
16. Olee otú ihe Onyenwe anyị kwuru, nke bụ́ ‘na-ekwusa ozi ọma, adala mbà. Anọnyeere m gị,’ si gbasa ozi anyị?
16 Ọ̀ kwa i chetara na ọ bụ mgbe ndị Juu jụchara ozi ọma Pọl nọ na-ezi ha ka Onyenwe anyị Jizọs mesiri ya obi ike, sị: “Ụjọ atụla gị, kama na-ekwusa ozi ọma, adala mbà. . . . Anọnyeere m gị”? (Ọrụ 18:9, 10) Anyị kwesịrị iburu okwu ndị ahụ n’obi, karịchaa, mgbe ndị mmadụ jụrụ ozi ọma anyị chọrọ izi ha. Echefukwala na Jehova na-enyocha obi, ọ na-adọtakwa ndị nwere ezi obi n’ebe ọ nọ. (1 Sam. 16:7; Jọn 6:44) Ihe a kwesịrị ịgba anyị ume ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. Kwa afọ, a na-eme ọtụtụ narị puku mmadụ baptizim. Ihe ọ pụtara bụ na a na-eme ọtụtụ narị mmadụ baptizim kwa ụbọchị. Jizọs kwere ndị niile na-erube isi n’iwu o nyere ka e “mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ” ya nkwa, sị: “M nọnyekwaara unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.”—Mat. 28:19, 20.
-